El-Rufai accident: Anọghị m n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma dịka akụkọ kwuru

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Nasir El-Rufai bụ aka na-achị Kaduna steeti na isi a hụrụ kwaba okpu na pati APC, ekwuola na onweghi ihe ọbụla mere ma ya ma ọkwọụgbọala ya, dịka akụkọ si na-efegharị.

El-Rufai

Ebe foto si, Twitter/El-Rufai

Akụkọ ahụ pụtara kwuru na ya bụ El-Rufai nọ n'ọnọdụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma, ebe ọkwọụgbọala ya nwụrụ anwụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ dị ka akụkọ a si n'aka ndị na-akwado PDP, ma kwuo na ọ ka kwụ chịm.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Asambodo mmeri,

Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti na-apụ n'ọchịchị, esoghi na ndị natara asambodo ọchịchị ya taa.

Rochas

Ebe foto si, Facebook/Rochas

Nke a na-abịa ka ụlọọrụ INEC nyere ndị niile zọtara oche sinetọ n'ụlọọmeiwu ukwu Naịjiria, asambodo mmeri ha n'Abụja.

Ụlọ dara na Legọs,

Gọọmentị akwụsịla ịchọ ndị mmadụ n'ụlọelu ogogo atọ ahụ dara n'Ịta Faaji na Legọs, mana obi adịghị ndị mmadụ mma n'ihi na enweghi onye ma mmadụ ole nọ n'ụlọ ahụ oge ọ dara.

Enyemaka ndị mmadụ

Ka ọ dị ugbua, mmadụ iri na otu nwụrụ na ya bụ ihe mberede, ebe a gụpụtara mmadụ iri ise gụnyere ụmụakwụkwọ praịmarị.

Akụkọ si mba ọzọ,

Praịm minista ọhụrụ mba Ọljiria bụ Noueddine Bedoui, ewepụtala atụmatụ ọhụrụ iji zaa ngagharịiwe ndị mba ya mere iji kwụsị onyeisiala ha bụ Abdelaziz Bouteflika ịzọ ọchịchị ọzọ.

Ọljiria

Ebe foto si, AFP

O kwuru na gọọmentị ya ga-agụnye ndị ntorobịa Ọljiria bu ngagharịiwe a n'isi, ma kwuo na gọọmentị a ga-achị naanị nwantịntị oge.

N'egwuregwu,

Onye ka a ga-agbara ụgbọ nwamkpi na Europa League mgbe Chelsea ga-ezute Dynamo Kiev na mgbe Arsenal ga-ezute Rennes ọzọ?

Inconclusive elections: 'Meenụ ihe niile ọ ga-ewe inye APC mmeri na mmeghari ntuliaka gọvanọ'

Abdullahi Abass

Ebe foto si, Abdullahi Abass

Nkọwa foto, Abdullahi Abass

Onyeisioche APC na Kano steeti bụ Abdullahi Abbas akpọọla ndị agboro na-akwado otu pati ha ka ha ghara ile anya n'azụ ime ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na APC meriri na ntuliaka mmeghari nke Inec hiwere.

N'ihe onyonyo na-efegharị na social midia(Twitter na Facebook) nke amaghị onye wepụtara ya, Abdullahi Abass onye gwara ha okwu n'asụsụ Awụsa kwere ha nkwa nchekwa ma ndị uweojjii nwuchịe ha, na a ga-atọhapụ ha na e gbughị oge.

Cheta na Inec kwuru na ntuliaka e mere na steeti isii gụnyere Sokoto, Benue, Bauchi, Adamawa, Plateau na Kano ezughị nwe nkwubi na ha.

Naijiria achọghịkwa Boeing 737 Max

Okpokoro ụgboelu Ethiopia Airline kpọkasịrị

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmenti etiti amachiela ụgbọelu Boeing 737 Max ifebata na Naijiria dịka ha na-ekwusi ike na o nweghị ụdị ụgbọelu ahụ na Naijiria.

Mịnista nta na-ahụ maka njem bụ Hadi Sirika, bụ onye kwụpụtara nke a dịka ọ na-agwea ndị ntakụkọ okwu n'obi gọọmenti dị n'Abuja.

Hadi Sirika

Ebe foto si, Hadi Sirika

Nke a na-eme dịka ụgbọelu Ethiopian Airlines Boeing 737 ahụ bu ndị mmadụ si isiobodo Addis addis Ababa na-aga Nairobi dị na Kenya, kpọkasịrị n'obodo Bishoftu.

_______________________________________________________________

Lagos Collapsed building: Ndị nne na nna jupụtata n'ụlọọgwu ịchọ nwa ha

Ebe ụlọ dara na Legọs

Ndị nne na nna wakporo ụlọọgwụ 'Genereal Hospital Marina na legọ na ụlọọgwụ ndị ọzọ dị nso ịchọ ndị nke ha dịka akụkọ na o nwere ndị azọpụtaran'ụlọ dara na Legọs ụbọchị Wenezde.

Oge BBC gara n'ụlọọgwụ ahụ, ọtụtụ ndị o metụtara jupụtara ma na-anata nleta n'ọnụmara dị iche iche dị n'ụlọgwụ ahụ.

Onye nnukwu odeakwụkwọ Mịnịstry na-ahụ maka ahụike gwara Grace Ekpu nke BBC na a na-elezi ndị ahụ ka azọta ha ndụ tupu eziga ha n'ụlọgwụ ndị ọzọ.

Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ.

______________________________________________________________________________________________________

Ule Jamb bụ Eprelu 11

Ndị na-ede ule

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum

Ngalaba na-ahụ maka ule eji abanye mahadum ehiwela abali iri na otu nke ọnwa Eprelu afọ dịka ụbọchị ule ahụ ga-amalite.

A na-ele anya na a ga-eme ule ahụ otu izuụka.

__________________________________________________________________________________________________________

Akingbola ji ego ụlọakụ zụọ ụlọ n'alabekee-EFCC

Ikpe nkwụmọọtọ

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile

Otu onye akaebe ebola onye bụbu onyeisi ụlọakụ Intercontinental bank bụ Erastus Akingbola ebubo izupu ego ụlọakụ ahụ karịrị nde dọla itoolu were zụọ ụlọ na Lọndọn.

Abdulraheem Jimoh gwara Okaikpe Mojisola Olatoregun n'ụlọikpe ukwu nke etiti n'Ikoyi Legos n'akwụkwọ nke EFFC gbara Akinhbola nke na-aga n'ihu ugbua.

_________________________________________________________________________

N'egwuregwu,

Barcelona ji nkata kponye Lyon goolu

FC Barcelona

Ebe foto si, Getty Images

Otu egwu bọọlụ Barcelona gosiri ihe ha ji wụrụ dachị ka ha ji nkata kponye Lyon goolu n'ọgbọegwuregwu Nou Camp, ebe Liverpool lara na nta n'agbanyeghị mmeri ha meriri n'asompi ha na Bayern sọrọ nabalị Wenezde.