Ethiopia Airline Crash: Ndị otu anyị so n'ụgbọelu ahụ kpọriri akpọri - UN

Ebe foto si, Twitter/ECA_OFFICIAL
Ihe mberede ụgbọelụ dara n'ụtụtụ ụbọchị iri nke ọnwa Maachị 2019, emetụtala ụlọọrụ United Nations dịka ha si gwa onye ntaakụkọ BBC.
Mmadụ ruru otu narị na iri ise na asaa (157) nwụrụ na ya bụ ihe mberede.
Etu ọ dị ugbua ndị ụlọọrụ UN kwuru na ndị otu ha nwụrụ n'ụgbọelu a nwere ọdachi, kwesịrị isonye n'ọgbakọ gbasara gburugburu obibi ha na-eme n'isi Obodo Kenya bụ Naịrobi taa.
Satya Tripathi bụ odeakwụkwọ ngalaba a, kwuru na ha achọbeghi ịkpọpụta aha ndị otu ha, ruo mgbe ha mechara nyocha.
Ha mechara daa nkịtị otu nkeji, iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ha mekwara mbudata ọkọlọtọ iji kwanyere ndị otu ha nwụrụ anwụ ugwu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Akụkọ ga-amasị gị:




