Ọ bụ ndị eleghị anya na ndị azụ anụụka na-ebute mberede ụgbọala?

Ebe foto si, @rrslagos
Otu nwoke aha ya bụ Olabode gbara n'ụlọikpe ime obodo dị n'Ikeja, Legọs maka ebụbọ iji ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze ya kwọgbuo nwatakiri onye agbataobi ya gbara afọ atọ.
Akụkọ kọrọ n'ụgbọala Olabode kwọgbụrụ ya bụ nwa ka ọ na-ala azụ.
Ya bụ nwoke bi n'Ikeja ka a na-ekpe ikpe ọchụ nakwa amaghị akwọ ụgbọala nke ọma.
Onye okaiwu na-ekwuchitere nna nwa ahụ ọnụ ya kwuru na ya bụ ọdachi dara n'ehihie mgbe ọnwa Septemba dị na mkpụrụ ụbọchị iri na ise na obi ha dị na Ikeja.

Ebe foto si, Getty Images
Nna ya bụ nwata na-eche na Olabode hiri asaa nabọ n'anya were gbuo nwa ya maka na ha abụọ nweburu esem okwu.
Ọkaiwu nna nwata ahụ sị na agwa a ọkwụụgbọala a kpara megidere iwu dị na agba nke 27 (1) nke iwu okporoụzụ na Legọs Steeti nke etiri n'afọ 2015.
Ọkaikpe ya bụ okwu dị n'ụlọikpe bụ ji N250,000 na mmadụ abụọ nwere agba naa Olabode n'akambee.
Mgbe ọzọ a ga-ekpe ya bụ ikpe bụ na Octoba 30 2018.
BBC Igbo kpọtụrụ ndị bụ nna nwekwara ụgbọala ka ha tụnye anyị azụ ihe ise onye na-akwọ ụgbọala kwesiri ịma iji gbochie ụdị ọdachị a.
Lee ihe Tony Umeh bụ onye na-arụ egwụ gwara BBC Igbo.
- Mbu, lezie anya nke ọma tupu ị nyapụ ụgbọala gị.
- Lee anya n'enyo nke ime na nke akụkụ.
- Gbuo opi iji mee ka ihe ọbụla nọ na ọkpụrụ ụgbọala ahụ pụọ.
- Jiri nwanyọ nwanyọ pụọ, apụla n'ike maka adị ama ama.
- Gee nti nke ọma mara ka mkpọtụ dị aṅaa ị ga-anụ.









