Nnamdi Kanu Arrest: Afọ abụọ ka anyị na-esi imi n'ala achọ Nnamdi Kanu, ya esi mba fere mba agwọrị ndụ - Lai Mohammed

Lai Mohammed

Ebe foto si, Ministry of Information

Gọọmentị Etiti agbaala ama na o teela ha ji were ndị ọrụ nchekwa achọ Nnamdi Kanu tupu ha enweta ya na mpagha ha akpọghị aha ya.

N'ozi Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed gbasara ụbọchị Tọzde n'Abuja oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ọ sịrị,"Ndị ọrụ nchekwa anyị na-achọ ya onye ndu otu Ipob a machiri amachi, ya a na-akwọrị ndụ."

" Ọ na-ekpori ndụ si mba fere mba, na-efe ụgbọelu "Private jet', ebi n'ụlọriri na nkwari dị oke ọnụ , eyi akwa na akpụkpọụkwụ ndị ọgaranya(designers)."

"Anyị niile jizi anya anyị hụ n'oge a nwụchiri ya, o yi uwe ọkwaakwa mba Itali a na-anụ aha ya bụ Fendi."

Aha onyonyo, Victor Umeh

Lee okwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụ kpụrụ Mohammed kwuru gbasara Nnamdi Kanu na otu Ipob:

  • "Nnyocha pụrụ iche anyị mere gosiri anyị ọtụtụ ihe banyere otu Ipob na ndị nkwado ha, o nweghị onye n'ime ndị na-akwado ha ga-ala n'efu."
  • "A na-ekpe Kanu Ikpe maka ebubo 11 metụtara ịgba gọọmentị mgba ikposa ya, iyi ndụ egwu, iji ngwaọgụ, ịgba ọsọ n'ụlọ ikpe n'afọ 2017 oge ọ hapụrụ Naijiria."
  • Maka ndị na-eku si nyekwa ya ikpe nkwụmọtọ, ka a ga asị na e nyeghị ya tupu ọ gbaa ọsọ, anyị ga-enye ya ohere ikwu dịrị ya n'iwu onyeghị ndị tufuru ndụ ha maka ozi ọ na-agbasa n'ikuku nakwa Twitter."