Orsu Widow: 'Gọọmenti Hope Uzodimma gbatara m ọsọ enyemaka - Nwaanyi Ajadụ akụtụrụ ụlọ ya n'Imo steeti

Ụlọ nwaanyị ajadu, Ifeyinwa Okechi akụtụrụ
Nkọwa foto, Ụlọ nwaanyị ajadu, Ifeyinwa Okechi akụtụrụ

Nwaanyị Ajadu nwanne di ya kụtụrụ ụlọ ya n'Imo steeti akpọkụọla onyeisi ndị uweojii Naịjirịa, Usman Baba nakwa gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma ka ha nyere ya na ụmụ ise ya aka nweta ikpe kwụ ọtọ.

Nwaanyị ajadu ahụ akpọrọ Ifeyinwa Okechi si Ubaha Ngwo dị n'Etiti Ọrsu, Imo steeti boro nwanne di ya ebubo ịnapụ ya na ụmụ ise ya ulo di ya nyere ha nke mere na ha enweghịzị ebe obibi.

Okechi gwara BBC Igbo na nwanne di ya kwatụrụ ụlọ ala nwere ọnụ ụlọ isii di ya rụtara nakwa ngwo ngwo niile ha ji biri ebe ahụ.

O kwuru na nwanne di ya ahụ bi na Benin na-ekwu na ụlọ di ya ọ kwaturu bụ ebe ọ chọrọ ka ụmụ ya rụọ ụlọ nke ha.

Bee nwaanyị ajadu , Ifeyinwa Okechi akụtụrụ
Nkọwa foto, Ụlọ nwaanyị ajadu, Ifeyinwa Okechi akụtụrụ

N'ọnụ Okechi, " E meela m mkpesa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Orsu ma kpesakwa n'aka ndị eze obodo anyị."

"Ndị isi obodo anyị nyere ya ụbọchị asaa ka o wepụtara mụ na ụmụ m ebe anyị ga na-arahụ mana ugbua anyị enweghị ebe anyị na-arahụ."

Bee nwaanyị ajadu , Ifeyinwa Okechi akụtụrụ
Nkọwa foto, Bee nwaanyị ajadu , Ifeyinwa Okechi akụtụrụ

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ndị uweojii si n'isi ụlọọrụ uweojii dị n'Orsu mgbe ọ gara igba Okechi ajụjụ ọnụ na bee ya.

Mbọ niile onye ntaakụkọ BBC gbara ịnụta n'ọnụ nwoke ahụ Okechi kwuru kụtụrụ ụlọ ya kpụrụ n'ala makana o bughị ekwenti ya nke o ji azaghachị edemede ekwenti e zigara ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Micheal Abattam kwuru na ha natala mkpesa Okechi ma ziga ndị ọrụ ha bee ya.

Etu nwanne di m si kurie ụlọ di m hapụrụ mụ na ụmu ise anyị- Ifeyinwa Okechi

Nwaanyị Ajadu

Ebe foto si, Screengrab

A kụrịela ụlọ otu nwaanyị ajadu ji ụmụ ise n'Orsu dị Imo steeti.

Nwaanyị ahụ kwuru na di ya nwuru n'afọ 2010, kpọgara ụmụ ya ụlọakwụkwọ ma gawa ahia, wee lọta hụ na a kụriela ụlọ ya.

O kwuru na mgbe ọ lọtara ahịa, ọ hụrụ na akutusiela ụlọ di ya hapụrụ ya tupu ọ nwụọ.

Ọ bụ n'ihe nkiri na-efegharị na soshal midia ka nwaanyị ahụ nọ gosi bee ya akụrịrị ma tiwe mkpụ ka agbatara ya ọsọ enyemaka.

N'ihe nkiri ahụ ndị ntaakụkọ Heritage FM weputere n'akara facebook ha, nwaanyị ahụ kowara na nwanne di ya akpanyeghịri ụka tupu ọ kụtụo ụlọ ahụ.

Aha onyonyo, Ala ụmụnwaanyị ajadu

"Ọ gwaghịkwanụ ndị agbata obi anyị maobukwanu ndị umunna anyị."

Nwaanyị a kwukwara na kemgbe akuturu ụlọ ya, na ya na umu ya enweghizi ebe ha na-arahụ

Dịka akụko a n'efeharizi, ndị mmadu apụtala ị gbatara nwaanyị ahụ ọsọ enyemaka.

Aha onyonyo, Ụlọ anyị na-adasịsị n'ihi enweghị onye enyemaka- Ụmụajadu atọ amụtaghị nwa

Ndị umunna be di ya enyela nwoke kụtụrụ ụlọ ahu ịwụ ka o chọtara nwaanyị ajadụ a ebe ya na ụmụ ya ga n'arahụ tụpụụ ụbọchị asaa a gafee. 

N'arịrịọ enyemaka nwaanyị ahụ rịọrịọ n'ihe nkiri ahụ, o gwara ndị mmadụ nyere ya aka n´ihe etipiasiala ihe niile onwere n'ụlọ ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: