Chidimma Ojukwu onye e boro ebubo igbu Usifo Atagana nna ya ukwu na-enwe mmekọ ahụ - Onye akaebe

Otu onye akaebe n'ikpe a na-ekpe nwaada Chidimma Ojukwu maka ebubo igbu Mazi Usifo Ataga, agwala ụlọikpe na nnyocha gosiri na nwaada hụ na nna ya ukwu na-enwe mmekọ ahụ.
Dịka ikpe ahụ malitere ọzọ n'ụbọchị Tuzde, Nọvemba 8, ụlọikpe kpọlitere Olusegun Bamidele bụ onye uweojii ka ọ gbaa akaebe, o wee kọwaa etu ha si chọpụta na Chidimma na onye o ji mere nna, nke a na-akpọ 'foster father' na bekee, bụ Mazi Onoh Ojukwu, na-enwe mmekọ ahụ.
Bamidele kwuru nke a dịka ọ na-akọwa etu ha si mee nnyocha nke mere ha ji bo nwaada Ojukwu ebubo na ọ bụ ya gburu Mazi Usifo Ataga.
O kwuru sị: "Oge anyị nwụchiri nwaada Chidimma Ojukwu na nna ya bụ Onoh, nna ya gosiri nnukwu mwute maka ihe nwa ya nwaanyị mere, ya mere anyị ji debe ya n'ebe o nwereike ị na-anabata ndị ọbịa.
"Nke a bụ maka na o kwere nkwa inyere anyị aka na nnyocha gbasara okwu a.
"Mana dịka anyị na-eme nnyocha, anyị chọpụtara na nwoke a bụ Onoh, na Chidimma nwa ya na-enwe mmekọ ahụ, anyị chọpụtakwara na ọ naghị ekwu eziokwu.
"Nnyocha a gosikwara anyị na Chidimma nwere ụfọdụ ihe ọ na-ezoro anyị ezoro, anyị matakwara na nna ya bụ Onoh ma ụfọdụ ihe gbasara arụ a Chidimma kpara kama ọ na-eme ka ọ maghị."
Bamidele kwukwara na ha chọpụtara na nne mụrụ Chidimma enyeghị nkwado ka ya na Mazi Onoh Ojukwu biri.
Ọ bụ nchọpụta ndị a mere ndị uweojii jiri tinye aha Mazi Onoh na ndị a kpụtara ụlọikpe maka ebubo aka ha ịdị n'ọnwụ Usifo Ataga.
Ọkaikpe Yetunde Adesanya yigharịrị ikpe ahụ gaa ụbọchị 10 nke Ọktoba, oge a na-atụ anya na Chidimma ga-azara ọnụ ya n'ebubo niile e boro ya.
Nwaada Chidimma anọọla n'ụlọ mkpọrọ ihe ruru otu afọ kamgbe ndị uweojii nwụchiri ya.
Ndị uweojii boro ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ - Chioma Egbuchu na Adedapo Qadri - ebubo itoolu nke gụ nyere igbu mmadụ, ịkpa nkata igbu mmadụ, izu ohi na mpụ ndị ọzọ.
Mazi Usifo Ataga, onye a sị na Chidimma gburu, bụ onye ojiegoachụego a ma ama.
Chidimma Ojukwu wepụrụ 'N5 million' n'ọbaego Usifo Ataga n'ụbọchị ọ nwụrụ - Onye akaebe

Chidimma Ojukwu, onye a na-ebo ebubo na o gburu otu nwoke aha ya bụ Usifo Ataga, wepụrụ nde naịra ise n'ọba ego nwoke ahụ n'ụbọchị ọ nwụrụ.
Ọ bụ otu onye bịara gbaa akaebe n'ụlọikpe kwuru nke a n'ụlọikpe n'ụbọchị Tọzde, dịka ya bụ ikpe na-aga n'ihu.
Onye akaebe kwuru nke a bụ onye uweojii aha ya bụ Bamidele, onye sị na ọ bụ ya nyochara akwụkwọ ọbaego Usifo Ataga oge ọ nwụchara.
Bamidele kwuru na ọ bụ n'ọbaego Ataga nwere n'ụlọakụ GT na Access ka Chidimma si zipụ ego ndị ahụ, site n'ekwentị Ataga.
O kwuru na n'ime ụbọchị 16 ruo 19 nke June 2022, Chidimma ji ekwentị Ataga na-ewepụ ego n'ọbaego ya etu o si masị ya site n'ịzụ ikike e ji akpọ oku, maọbụ 'airtime' na bekee.
"Chidimma wepụrụ N20,026 ugboro anọ na Jun 16, n'ụbọchị17 Jun o wepụkwara N20,026.88 ugboro ise," Bamidele kwuru.
"N'ụbọchị Jun 18, o wepụrụ N110,000, mechaa wepụkwa N20,026.88 ugboro anọ. N'ụbọchị 19, o wepụrụ N20,026.88 ugboro ise."
"Ọ bụ akara USSD ka Chidimma ji wepụ ego ndị a site n'ekwentị Ataga."
"N'ụbọchị Jun 15, o zipụrụ nde naịra ise site n'ọbaego Ataga nke dị n'ụlọakụ GT gaa ọbaego ọzọ."
Bamidele nyefere ụlọikpe akwụkwọ ọbaego Ataga nke gosiri etu Chidimma si wepụ ego ndị ahụ.
Ọkaikpe ji ya bụ okwu bụ Yetunde Adesanya yigharịrị ụbọchị ikpe gaa abalị asatọ nke ọnwa Nọvemba.
Ihe niile anyị ma maka okwu Chidinma Ojukwu onye a sị gburu Maazị Michael Usifo Ataga

Akụkọ na Chidimma Ojukwu, bụ nwata nwaanyị akwụkwọ Mahadum Legọs eji Unilag mara, sụgbụrụ otu nwoke aha ya bụ Michael Usifo Ataga bụzị ihe akpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa.
Dịka ndị mmadụ na soshal midia ne-ekwu n'elu, ekwu n'ala, ndị ntaakụkọ na-ekwukwa na ezinaụlọ nwaamadị a apụtala dọọ ọha aka na ntị banyere ya.
N'ozi Dọkita Isi Ataga, nwanne Maazị Ataga, nyere ndị ntaakụkọ o kwuru na nyocha e mere ozu nwaamadị ahụ na-egosi na-atara ya ahụhụ nke ukwuu, kee ya agbụ, kechịe ya ọnụ, tupu asugbuo ya.
Okwu mpụtara nnyocha a dị n'akụkọ ndị ụlọọrụ ntaakụkọ Punch dere.
N'ozi ahụ Isi Ataga kwukwara na n'echiche ya, o bughi sọsọ otu onye mere nwanne ya ihe egwu dị etu a.
Ọ sị na-enyochapụtabeghi n'ezi a ihe mere n'ime ụlọezumike ahụ mgbe Chidimma na nwanna ya Michael nọkọrọ.
N'akụkọ yịrị ya, ezi n'ụlọ Michael Ataga ezipụtakwala ozi site n'aka ọnụ n'ekwuru ha bụ onye okaịwụ Olusegun Jolaawo, na-ekwu na ha ga-akpụpụ onye obula na-ekwu okwu ugha kwugide Michael Usifo ụlọikpe.
Ozi ahụ tikwara ndị uweojịị aka n'obi ma gwakwa ọha ka ha wepu aka, ma kwụsị asịrị nwereike igbochi ọrụ nnyọcha ndị uweojii n'eme.

Ebe foto si, Usifo Ataga
Ka anyị tupenyetu gị azụ n'okwu a na-ewu ebe niile.
Leekwa ihe anyị ma gbasara Chidimma Ojukwu:
- Chidinma bụ nwata akwụkwọ mahadum Unila nọ n'afo nke ato ya na ngbala mgbasa ozi
- O dị afo iri abụọ na otu
- O kwuru na ya na Michael Usifo Ataga bụ enyi, na ha matara onwe ha n'onwa anọ gara aga
- Chidinma na nwanne nna ya bi na Yaba, Legos.
Ihe anyi ma gbasara Michael Usifo Ataga:
- Michael Usifo Ataga bụ onyeisi ụlọọrụ Super TV
- Nwunye ya na ụmụ ya bi na Abuja
- Michael Usifo Ataga dị afo iri ise.
Ihe anyị ma maka mmekorita Chidinma Ojukwu na Michael Usifo Ataga:
- Dịka Chidimma siri kwuo, ya na Maazị Ataga kwabara n'ụlọ ezumike nọ na Lekki, Legos n'etiti ọnwa Juun
- Ọ na ya na Michael Usifo ṅụrụ mmanya ma se kwa ihe osịse n'aba n'anya ụbọchị o sụgburu ya
- Ọ kwu kwara na nwoke ahụ dinara ya n'ike mgbe ha nọkọrọ n'ụlọ ezumike ahụ
- N'okwu ya, ọ sị na agwa a nwoke a kpara kpasuru ya iwe, ma butere ha abụọ ọgụ
- O kwukwara na-ichekwa onwe ya n'ime ọgụ ahụ, ka o jị were mma sugbuo nwoke ahụ.
Ihe nnyocha ndị uweojii chọpụtagoro
Ozi Muyiwa Adejobi bụ ọnụ n'ekwuru ndị uweojii na Legos Steetị zịpụtere na Fraịde maka onwu Michael Ataga o tịri ndị otu uweojii ya aka n'obi maka etu ha sị soro usoro amamihe sayensị wee nwude ya bụ nwaada Ojukwu. N'ozi ahụ o kwukwara ka ha si nyochapụta Nwaada Ojukwu siri n'usoro akara ekwenti ya.
Lekwa ihe ndi ozo nnyocha a ha na-eme chopụtara:
- A chọpụtara ozu Michael Usifo ụbọchị Juun 16, n'ime ulo ezumike nọ na Lekki, Legos
- A nwudela nwaada ahụ na be nna ya nọ na Yaba, Legos n'ụbọchị Juun 23
- O bụ site na akara ekwentị ya dị icheiche (ma nke mba Naijiria, ma nke ofesi) ka ndị uweojii ji siri ime n'ala wee jide ya bụ nwaada
- A chọputara na ya bụ nwaada deturu akara ekwenti ofesị na-abughi nke ya n'akwụkwọ ndị obia ulọezumike ahụ
- Achọpụtara ATM kaadị Michael, efe ọbara-ọbara o yi ụbọchị a sugburu Michael, Akwukwu Njem n'aha Chidimma, akwụkwọ ikike inya ugbala bu aha ozo ( Mary Johnson) na Foto Chidinma
- E nyochapụtara na ya bụ nwaada mịpụrụ ego n'ọba ụlọaku Michael (Chetekwa na Chidinma kwurụ na ihe o mịpụrụ bụ Naira narị atọ na iri asatọ dịka a na-enyocha ya bụ okwu)
Dịka a na-eme nyocha ihe mere n'ime ụlọakụ ahụ, Punch dekwara na Joseph Tejumaiye bụ onye nkuzi nakwa onyeisi ngalaba "Mass Communication" na mahadum UNILAG, ekwuola site n'akwụkwọ iwu ụlọakwụkwọ ha, e nwere ike ikwusị nwaada Chidinma i bia akwụkwọ maka ihe a o mere.
Chidimma arịọla mgbaghara
Nwaada Ojukwu pụtakwara n'ihe onyonyo rịọ ka ọha na ezịnaụlọ Michael gbaghara ya.
O kwuru na ọbụghi ebumnuche ya ịgbụ onye ọbụla.
Ọ gwakwara ha na ụkọ ego so kwanye ya na ndụ ọjọọ dị etu a.
Ka ọkwụ ugbua, okwu banyere okwu a dị ka agwọ nọ n'akịrịka. Ọ ka na-esepụta isi mana amachabeghị etu ogologo ya dị.










