Michael Usifo Ataga: Lee ihe kpọtụrụ n'akwamozu nwoke a, e gburu egbu

Usifo Ataga

Ebe foto si, Usifo Ataga

Ezinaụlọ Michael Usifo Ataga gbakọrọ n'ụlọụka Katọlik 'Our Lady of Perpetual Help' dị na Victoria Island Legọs n'ụbọchị Fraịde, iji kaara ya ụka ọnwụ ma lie ya.

Usifo Ataga bụ onye nwe ụlọọrụ Super TV, onye ọnwụ ya wuru ewu na soshal midia dị ka a na-ebo otu nwata nwaanyị na-agụ na mahadum Legọs bu Chidimma Ojukwu ebubo na ọ bụ ya gburu ya.

E mechara lie nwaamadi ahụ n'ebe a kpọrọ 'Ebony Vaults' nke bụ ogige olili ozu dị n'Ikoyi Legọs dịka anyammiri na-ezo ka mmiri.

Enyeghị ndị ntaakụkọ ohere isetecha ihe niile mere n'akwamozu ahụ nke ọma.

N'ụbọchị Tọzde ka ndị enyi na ndị ikwu na ibe gbakọrọ kpekwaa ekpere iji rịọ Chineke ka ọ nabata mkpuruobi Usifo Ataga.

N'ọgbakọ ahụ ka nwunye ya bụ Brenda nakwa nne ya bụ Sylvia nọrọ kọọ etu ọnwụ ya si ewute ha.

Ọnwụ gị na-agba m ọbara n'obi- Nwunye Usifo

Usifo Ataga

Ebe foto si, neeceebossladyblog/Instagram

Nkọwa foto, Ụlọụka ebe a nọ kaara Usifo Ataga ụka ọnwụ.

Nwunye ya kwuru sị: "Ana m atụgharị n'obi m ihe nwere ike ime gị, maọbụ ebe i nwere ike ịnọ ugbua, mana ọnwụ anaghị agbata m n'obi."

N'otu aka ahụ kwa, nne Usifo kwuru na obi na-agbawa ya oge ọbụla o chetara nwa ya nwoke.

"Ọ na-agba m ọbara n'obi, n'ihi na ọ bụ mmadụ nwere mmụọ inye aka nke ukwuu."

Onye bụ Usifo Ataga?

MICHAEL USIFO ATAGA

Ebe foto si, MICHAEL USIFO ATAGA

Michael Usifo Ataga bụ onye nwe ụlọọrụ 'Super Network Limited' dịka o si kọwaa onwe ya n'akara LinkedIn.

Ọ bụ ụlọọrụ a nwe 'SuperTV' bụ ụlọọrụ mgbasaozi dị na Legọs.

Ọ lụọla nwaanyị ma mụtakwa ụmụ; akụkọ na-ekwu na nwunye ya na ụmụ ya bi n'Abuja.

Ọ gụrụ akwụkwọ Mahadum na 'University of Benin'.

Ọ gbara afọ iri ise tupu ọ nwụọ.

Ọkaiwu nakwa nwanna ya bụ Franklin Ufu kwuru na Usifo bụ nwa nke atọ n'ime ụmụ anọ nne ya mụrụ.

Ụmụnne ya niile bicha mba ofesi

Etu Usifo Ataga siri nwụọ

Chidimma Ojukwu

Ebe foto si, Nigerian Police Force/Facebook

Nkọwa foto, Ndị uweojii ebola nwagbọghọ a ebubo igbu Usifo Ataga

Ndị uweojii anwụchiela otu nwaagbọghọ gbara afọ iri abụọ na otu, onye ha kwuru na ọ bụ ya gburu Usifo Ataga.

Nwaagbọghọ ahụ gwara ndị ntaakụkọ na o ji mma sugbuo Ataga n'ihi na ọ wakporo ya n'ike.

Mana otu nwaagbọghọ ahụ mechakwara kwugharịa sị na aka ya adịghị n'ọnwụ Ataga.

Ọ kọrọ akụkọ na ha abụọ nọ n'ụlọ ndina na-enweta onwe ha, mana ya pụrụ ka ọ gaa zụta ihe ma lọghachi azụ wee hụ na Ataga anwụọla.

N'aka nke ọzọ, dịka Franklin Ufu bụ ọkaiwu siri gwa ndị ntaakụkọ, "ekweghị m na ọ bụ naanị nwaagbọghọ ahụ gburu Usifo."

"Ahụla m ozu ya ugboro ise, e ji eriri kechie aka ya, ekweghị m na ọ bụ nwaagbọghọ a m hụrụ ga-ekenwu ụdị eriri ahụ."

"Ejikwa mma sụkachaa ya ahụ, nke gosiri na ọ bụ ihe a kpacha anya mee."

Mana ndị uweojii ekwuola na ha ga-akpụpụ nwa agbọghọ ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.