Chidubem Obi, Egoagwuagwu, na ụmụ Igbo ndị ọzọ gosiri ụwa nkari n’agụmakwụkwọ n'ọdịnso a

Oge ụfọdụ, a na-elegara ndị Igbo anya ka ndị okwu gbasara ego na-agba ara, nke mere na ha na-achọ ụzọ kacha mfe iji kpata ego.
Ndị na-eche ụdị echiche a na-ekwu na ndị ịgụ akwụkwọ anaghị amasị ndị Igbo, na ihe na-amasị ha bụ ego mbute.
Mana n'ọdị nso a, ụmụ Igbo na-egosi ụwa na ụbụrụ ha na-cha ọkụ ma a bịa n'ịgụakwụkwọ.
Ebe ọbụla i gere ntị, ị ga-anụ aha otu onye Igbo tuuru ugo n'otu mahadum na mba ofesi maọbụ na Naịjirịa.
Lee ụfọdụ n'ime ha nakwa ihe kacha mee nke kpatara ụwa ji kpụrụ ha n'ọnụ:
1) Chidubem Obi Gerald

Ebe foto si, Twitter/@Sylvy90880056
Nwa afọ Igbo aha ya bụ Chidubem Gerald Obi agaala be ndị mmụọ gụta ọkụ ma lọghachi na be mmadụ na ndụ.
Obi mere ihe mmadụ emetubeghị mbụ n'ụlọakwụkwọ mahadum 'Sechenov' dị n'obodo Moscow na mba Russia tuuru ugo dịka onye kacha mee ọfụma na ngalaba ebe a na-azụ ndị dọkịta nke mahadum ahụ.
Nwa amadị ahụ nwetara nzere 5.0 CGPA nke bụ nzere kachasị onye Afrịka ọbụla nwetarala na ngalaba ahụ kemgbe Mahadum Sechenov malitere.
Chidubem Obi bụ nwa afọ Anambra steeti.
N'emume e mere n'ụlọakwụkwọ ahụ n'ọdị nso a ka a nọrọ kwanyere Dọkịta Obi ugwu ma nye ya ihe nrite pụrụ iche.
2) Tobechukwu Phillips

Ebe foto si, Tobechukwu Phillips
Kamgbe ụlọakwụkwọ Alvin High School malitere, onwebeghị onye isiojii tuuru ugo dịka ọkaibe n'ebe ahụ.
Mana nwa ada Igbo a bụ Tobechukwu Phillips mere ihe tụrụ mmadụ n'anya oge o nwetara nzere 6.9 GPA.
Nke a bụ nzere kachasị nke onyeisiojii ọbụla nweterela n'ụlọakwụkwọ ahụ.
Matakwa na ụlọakwụkwọ Alvin High School bidoro n'afọ 1894.
N'afọ 1965 ka ha malitere ịnabata ndị isiojii na ya bụ ụlọakwụkwọ.
Ike a Tobechukwu kpara mere e ji nye ya agụmakwụkwọ n'efu na mahadum Texas nke dị n'obodo Austin nke mba Amerịka.
3) Chizaram Ilo

Ebe foto si, Brittle Paper
Chizaram Ilo bụ ya meriri asọmpi edemede bekee a kpọrọ 'Commonwealth Short Story Prize' nke mpaghara Afrịka maka afọ 2020 .
Aha edemede nyere ya mmeri a bụ "When a Woman Renounces Motherhood."
Chizaram, onye gbara naanị afọ iri abụọ na atọ (23), bụ onye kacha bụrụ nwata na-emeri ya bụ asọmpi na mpaghara Afrịka kamgbe ọ malitere.
Ya na nne ya bi na Legọs. Nna ya alaala mmụọ.
Oge Chizara nụrụ maka mmeri ya n'ọnwa Mee afọ a, o kwuru na ọ dị ya ka ọ bụ na nrọ.
"Ihe a bụ nrọ m bidoro ịrọ kamgbe. Obi gaara abụ nna m sọ aṅụrị ma ọ bụrụ na ọ ka nọ ndụ taa."
Chizaram bụ onye Akpugoeze n'Enugwu Steeti.
4) Egoagwuagwu Madufokwa

Ebe foto si, Facebook/Uche Nworah
Egoagwuagwu Agnes Madufọkwa bụ onye kacha mee ọfụma n'ule Jamb nke afọ 2020 na Naịjirịa.
Jamb bụ ule nke ndị gụchara akwụkwọ sekọndịrị ji abanye Mahadum.
Egoagwuagwu nwetara akara 365 n'ule ahụ iji bụrụ ọkaibe.
Onye bụkwa onye nke abụọ n'ule ahụ bụkwa nwa afọ Igbo aha ya bụ Nwobi Okwuchukwu David.

Ebe foto si, nse.org.ng
Gọọmentị Anambra steeti tunyere ha ugo pụrụ iche maka ike ha kpara.
Otu jịkọrọ ndị Injinịa niile na Naịjirịa bụ 'Nigeria Society for Engineers', nyekwara ha abụọ nkwanye ugwu.










