Unknown Gunmen Attack in Anambra: Etu ndị oji egbe si gbagbuo Igwe Edozieuno n'okporoụzọ Anambra Steeti

Igwe Alex Edozieuno

Ebe foto si, Mkpunando Development Union Aguleri Otu/Facebook

Ndị oji egbe gbagburu Igwe Alex Edozieuno onye bụbu Igwe ndị obodo Mkpunando Aguleri n'Anambra Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra Steetị bụ Ikenga Tochukwu sị na nke a mere n'elekere iri nke ụtụtụ Fraịde 10 Septemba, afọ 2021.

Ọ sịkwara na o mere n'obodo Ikem Ivite dị n'akụkụ akwammiri Ezu dị n'Otuocha n'okpuruọchịchị Anambra East.

Ọ kọwara nke a dịka "arụ karịrị arụ mmadu mere ibe ya"

Kọmishọna Uweojii n'Anambra bụ Tony Olofu

Ebe foto si, Anambra State Police

Nkọwa foto, Kọmishọna Uweojii n'Anambra bụ Tony Olofu gara nleta ebe e gburu Igwe Edozieuno

Ikenga sị na e gburu Igwe Edozieuno dị afọ iri isii na abụọ na onye ọkwọ ụgbọala ya.

Ọ sị na ihe ha wetere n'ebe ihe a mere gụnyere ụgbọala 'ọkwụọtọ ekele Eze' bụ nke Igwe ahụ.

Ọ gara n'ihu sị na nyocha tara ọchịchị na-aga n'ihu ịchọpụta ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ ruuru ha.

Igwe Alex Edozieuno

Ebe foto si, Mkpunando Development Union Aguleri Otu/Facebook

Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ọ maghi kpọkwem ma ọ bụ mwakpo e chere maka Igwe n'ihi na ndị oji egbe ahụ zukwara ọtụtụ ụgbọala ohi n'okporoụzọ ahụ.

N'otu aka ahụ gọvanọ Willie Obiano nke Anambra Steeti akatọọla ogbugbu e gburu Igwe Edozieuno ma nye ndị uweojii iwu ka e sie imi n'ala chọpụta ndị kpara arụ a.

Nke a dị n'ozi kọmishọna mgbasaozi bụ Don Adinuba wepụtara bụ ebe ọ kasikwara ezinaụlọ Igwe a obi.

Cheta n'afọ 2020 na gọvanọ Willie Obiano nke Anambra Steeti na-apụrụ Igwe a ọkwa ma were Igwe Hon. Johnson Onyeaka Mbanefo dochie ya.

O so n'otu n'ime Igwe iri na atọ gọvanọ Obiano kwụsịrị ọrụ mana ọ kpọghachịrị mmadụ iri n'ime ha ma chụpụ mmadụ atọ bụ nke Igwe Alex so na ha.

Aha onyonyo, Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ