Abatete Attack: Ihe anyị ma maka mwakpo ndị omekome wakporo Philip Udala n'Abatete

Ebe foto si, Udala FC
Ọnụ na-ekwuchịtere ndị uweojii n'Anambra steetị bụ Ikenga Tochukwu ekwuola na ha amalitela nyocha maka ihe mgbawa obi mere na Abatete n'ụbọchị Tozde.
Mana, akụkọ pụtara egosila na ọ bu ụgbọala bu onye ama bụ Philip Udala na ndị enyemaka ya ka ndị omekome a wakporo ma mụnye ọkụ.
Mwakpo a mere n'ahia Eke-Agu nke nọ na mpaghara Abatete.
Maazị Udala na ndị otu ya nọ na njem n'oge ọdachi a dakwasara ha.
Ndị uweojii Anambara Steeti si na ha na-eme nnyocha ịmata ka ihe siri mee.
Onye bụ Chief Philip Udala?

Ebe foto si, Udala FC
Maazị Udala bụ nwoke ọgaranya a ma ama na Anambra Steetị. Otu ihe e ji mara ya bụ otu bọọlụ ohiwere ma burukwa onyeisi ya bụ otu nke akpọrọ Udala FC.
Udala FC bụ otu bọọlụ nke agunyegoro n'akwụkwọ agba nke abụọ na otu jịkọrọ ndị egwuruegwu bọọla na Naijiria nke a na-akpọ "Nigeria National League".
Akụkọ ekwukwala na Maazị Udala bụ onye na-emesa aka dịka onyegoro ọtụtụ ndị ogbenye aka n'obodo ya.
Maazị Udala ka gbachapụru akwụkwọ nso nso a n'Legọs Steetị, ebe ọ nụrụ odinobia ya bụ nwaada Kelly.
N'akara Udala FC na Facebook, ihe ikpeazụ e tinyere bụ ekele Maazị Udala na-enye Obi Iyiegbu - e ji Obi Cubana mara - dịka ọ na-akwa nne ya.
Ọ bụ Maazị Udala binyere aka na ya bụ ọzi.
Ekwenti ya anaghị aga
BBC Igbo kpọtụtụ Obi Cubana ịnụta ma o nwere ihe ọ nụrụ banyere ọnọdụ Maazị Udaala ugbua mana ọ sị na ya ka nọ n'ụzọ.
"Ihe m ma ugbua bụ na-ekwentị ya naghị aga."

Onye nwụrụ na mwakpo a
Otu nwaada aha ya bị Chichi Eriobu dere n'akara Facebook ya na nwanne ya nwoke bụ Ebuka Eriobu sọ n'ime ndị omekome a gburu n'Abatete.
Ọ sị na obi agbawaala ezinụlọ ha, ọkachasị etu ndị mmadị jiri na-ese nwanne ya ihe onyonyo kama inyere ya aka ebe o dina na-azọ ndụ ya.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ebuka Eriobu bụ Odeakwụkwọ ngalaba jikọrọ otu asọmpị bọọlụ n'Anambara a kpọrọ "Anambra Independent Football League" (AIFL). Ọ bụkwa onyeisi otu bọọlụ Udala FC.
Ebuka kwesiri ime ncheta ọmụmụ ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Jụlaị tupu ihe mee.










