Fr Godfrey Chimezie's kidnap: Etu ndị ntọ si tọọrọ Fada n'Afaraukwu, obodo Nnamdi Kanu n'ụtụtụ taa

Fada Godfrey Chimezie

Ikekwe, otu ụkọchụkwu Katọlik ndị ntọ tọọrọ na-akwụ agụụ ugbua dịka o ribeghị nri ụtụtụ oge ndị omekome tọọrọ ya n'ụtụtụ taa bụ Wenezde.

Ndị ntọ tọọrọ Fada Godfrey Chimezie bụ osote ụkọchukwu na-achịkọta ụlọụka 'St Theresa's Catholic Church', n'Okporoụzọ Ehiukwu Ohokobe dị n'obodo Nnamdi Kanu bụ Afaraukwu, Ibeku, Umuahia-North, Abia steeti.

Ndị obodo ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ oge Fada Chimezie si St Gabriel Catholic Church Okpururie ebe ọ gaara kaa ụka ụtụtụ alọta, ka ya bụ ihe mere.

St Theresa's Catholic Church Afaraukwu
Nkọwa foto, St Theresa's Catholic Church Afaraukwu

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na na ndị omekome ahụ kwushiri ụgbọala 'Toyota Camry' ya, kpụpụta ya ma tinye ya n'ụgbọala ha, gbawara.

Aha onyonyo, Kidnappers: Ndị ntọ asaala asịsa

Oge onye ntaakụkọ anyị gara n' ụlọụka St Theresa, ahụghị ụkọchukwu na-achịkọta ụlọụka ahụ, mana katikisti bụ Mathias Ezinwa Uwakwe kwuru na ya bụ ihe mere eziokwu ma kwụkwọ na Fada agbabeghị ụtụtụ tupu o mee.

"Anyị ka nọ n'ụlọụka oge o mere, ọ bụ ndị bịara ụka na-ala hụrụ ihe mere were gbata kọọrọ anyị."

Okporoụzọ ebe a tọọrọ Fada Godfrey Chimezie
Nkọwa foto, Okporoụzọ ebe a tọọrọ Fada Godfrey Chimezie

Uwakwe gaara n''ihu kọwaa na e wetere Fada Chimezie bụ onye e chiri ụkọchukwu n' ọnwa Julai afọ 2021 ọhụrụ n' ụlọụka ha.

Oge, a kpọtụrụ ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Abia steeti bụ Geofrey Ogbonna kwuru na ya enweghị ike ikwu okwu ọbụla n'ihi na ya anatabeghị ozi zuru oke banyere ihe mere.

Njirimara St Theresa Catholic Church,Umuahia

Nke a na-eme ya ụkọchukwu abụọ si ogige 'Sons of Mary Mother of Mercy' ndị ntọ tọọrọ n'ọnwa itoolu.

N'abalị 15 nke ọnwa Disemba afọ 2020, a tọọrọ Fada Valentine Ezeagu, onye Enugwu n'Arondizuogu mana e mechara tọhapụ ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: