Gịnị gburu nwoke, nwunye ya, nwa ha, na onye enyemaka ha n'otu ụbọchị n'Enugwu?

Anya mmiri ejula elu na ala dịka mmadụ anọ si n'otu ezinụlọ lara mmụọ n'Abakpa Nike dị n'Enugwu n'ụbọchị Mọnde.
Mmadụ anọ a gụnyere nwoke aha ya bụ Lawrence Chukwu, nwunye ya bụ Chizoba, nwa ha dị afọ atọ, na nwa na-enyere ha aka bụ Ukamaka.
Naanị onye fọrọ n'ezinụlọ ahụ bụ nwa ha dị naanị ọnwa itoolu, n'ihi na o soghị rie nri ahụ.
Dịka ndị nne Chizoba bụ Elizabeth Nwankwo si gwa BBC Igbo, ọ bụ n'ụbọchị Satọde, abalị itoolu nke ọnwa Ọkutoba afọ 2021, ka ọdachi ọjọọ a dapụtara.
Oriaku Elizabeth kwuru sị: "ọ bụ n'elekere abụọ nke ime abalị n'ụbọchị Satọde, ka a kpọrọ m n'ekwentị wee gwa m na nwa na-eku nwa anwụọla."
"Mgbe m bịaruru n'isi ụtụtụ, m sị ha na- m ga-eburu ozzu nwa a bugara ndị mụrụ ya."
"Tupu mụ alọghachi, nna ya anwụọla, nne ya anwụọla. Ọ bụ n'ụtụtụ a ka nwa ha nwaanyị nwụrụ."
Oriaku Elizabeth kwuru na ndị ụlọọgwụ sị na ọ bụ nsị ọnụ, nke bekee na-akpọ 'food poisoning', gburu ha.
Ihe ha riri tupu ha alakpuo bụ nri olulo (arịbọ) na ofe ọha e ji ede sie.

Ka ọ dị ugbua, ozu di na nwunye ahụ abanyela n'ụlọ ozu, ozu nke nwa na-enyere ha aka alakwurula ndị mụrụ ya, ebe ozu onye nke gbara afọ atọ alaala ụlọ ka e lie ya.
Dịka ndị bi n'okirikiri ahụ siri kwuo, arịbọ ahụ ha riri bụ nke ha ji akpụ ha gbara n'anwụ were see.
Ugbua, nwa ha ahụ dị ọnwa itoolu nọzị n'aka mama nnukwu ya bụ Elizabeth Nwankwo.
Ihe anyị ma maka ezinụlọ a nwụrụ anwụ

- Lawrence Chukwu dị afọ iri anọ na otu, nwunye ya dị afọ iri atọ na anọ, nwa na-enyere ha aka dị afọ asatọ, ebe nwa ha nwaanyị dị afọ atọ.
- Lawrence bụ onye ọkwọ ụgbọala, ebe nwunye ya bụ onye nkuzi
- Lawrence bụ onye Mgboo nke dị n'okpuru ọchịchị Awgu n'Enugwu steeti, ebe nwunye bụbu onye Ebonyi steeti tupu ọ lụọ ya












