Ipob bans Fulani cattle: 'Okwu ndị na-achị ehi abụghi nke ndị Igbo sọọsọ' - Ohaneze

Ehi

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụgbo na-emetụta ikọpụta ihe oriri

Onye odeakwụkwọ mgbasaozi nke Ohaneze ndị Igbo bụ Alex Ogbonnia ekwuola na ha ga-enyocha okwu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwuru banyere ire maọbụ iri ehi maọbụ ewu awụsa n'Ọwuwa Anyanwu Naịjirịa tupu ha a mara etu ha ga-esi tinye ọnụ na ya.

Maazi Ogbonnia kwuru na nke bụ eziokwu bu na otu nsogbu dị n'Ọwụwa Anyanwụ bụ ndị na-achị ehi na-awakpo ndị mmadụ n'ugbo ha.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na nsogbu a abụghị na nanị Ọwụwa Anyanwụ ka ọ ụdịrị mkpamkpa a na-akpa.

Ọ sị na ọ bụ ya mere Ohaneze ndị Igbo ji akwado atụmatụ iwu ga-akagbu ịchịgharị ehi na ndịda Naịjirịa nke ọ si na gọọmentị Enugwu nabatara ma mee iwu.

"Enugwu ebinyela aka n'iwu ahụ, Ebonyi ebinyela aka na ya, ebe Abia na-ekwu na ha ga-eme nke ha nsonso a dịka govanọ ha kwuru."

Ogbonnia sị Ohaneze na-echepuru ndị Ọwụwa Anyanwụ bi na mpaghara ugwu, nakwa etu ihe ndị a ga-esi metụta ha.

Ewu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị IPOB sịkwa ka ndị Igbo kwụsị ịzụ maọbụ iri ụdị ewu a e ji 'ewu awụsa' mara.

Okwu a bụ maka ihe Chika Edoziem bụ onyeisi ngalaba Ipob a kpọrọ "Directorate of State" (DOS) kwuru na otu ahụ ga-amachị iri maọbụ ire ehi Awụsa site n'ọnwa isii n'abịa.

Maazị Edoziem kwuru nke a n'ụbọchị Fraịde dịka ọ na-agbasara ndị otu ya ozi site na Facebook.

Ọ sị na ndị Ọwụwa Anyanwụ eruola oge ha ga-eji chịwa ehi na ewu nke ha nke mere o jiri sị na ha akaguola ndi ugwu ịchị ewu na ehi n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọ sị: "Ndi Ọwụwa Anyanwu ga-amalite ịchị ehi na ewu Igbo dịka anyị ga-amachị ichi ehi na iri ehi ndi Fulani na be anyị."

Maazị Edoziem sị na ihe mere ha jiri nye ohere ọnwa isii bụ iji nye ndị mmadụ ohere ịkwado maka ihe a chọrọ ime.

Ọ sịkwa na mmachi a ha na-etinye ga-emetụta iji ehi ndị Fulani eme emume n'ala Igbo nakwa iji ya mee suya na ihe ndị ọzọ. Dịka ọ siri kwuo, maazị sị na mmachị a ga-emetụta ebe a na-ere na ebe a na-egbu ehi.

Maazi Ogbonnia si na Ohaneze agaghị amaba kwuwe maka atụmatụ ahụ, makana "ha na-ebu ụzọ enyocha okwu tupu ha ekwuwe".