Ehime Mbano Imo State: Etu otu ezinaụlọ sị gbuo nwa ha nwoke ma lie ya n'Ehime Mbano, n'Imo steeti

Onye ji mma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto a bụ nke e ji kọwaa akụkọ.

Otu ezinụlọ ejirila aka ha gbuo nwa ha nwoke, ma were aka ha lie ya, dịka ndị uweojii Imo state siri kwupụta.

Akụkọ a na-agba agba na ntị mere n'obodo a na-akpọ Duruegwele nke dị n'Umueze 2, Ehime Mbano, Imo Steeti.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Michael Abattam gwara onye ntaakụkọ anyị na ha anwụchiela ndị aka ha dị na ya bụ ihe.

Otu onye na-achọghị ka akpọọ aha ha gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ezinụlọ ahụ kwuru na nwa ha nwoke aha ya bụ Chukwuebuka, na-enye ha isi ọwụwa.

Onye ahụ kwuru sị: "Ọ bụ ndị ntorobịa obodo malitere ịchọ nwata nwoke ahụ, mana ndị ezinụlọ ya kwuru na ọ mere njem gaa Ghana."

"Mana oge ndị ntorobịa malitere ikwu na ha-etinye ụlọ ha ọkụ, nwanne Chukwuebuka nke nwaanyị sara asịsa, na ọ nwụọla."

"Ọ bụ ya kpọọrọ ndị ntorobịa gaa gosi ha ebe ha liri nwanne ha."

Aha onyonyo, Etu e si wakpo ma gbuo mmadụ abụọ ma tọrọ mmadụ ise n'Edda di na Ebonyi steeti

Onyonyo dị na soshal midia gosiri ebe nna nwata ahụ ji aka ya bọpụta ozu ya ebe ha tinyere ya n'akpa ma lie ya n'akụkụ be ha.

Ndị uweojii kwuru na nwanne Chukwuebuka a na-akpọ Phillip, agbaala ọsọ dịka ya bụ ihe mechara.

"Anyị ka na-achọ ya achọ, mana olileanya dị na aka ga-akpara ya n'oge adịghị anya," Abattam kwuru.

BBC Igbo agaala n'obodo ebe ihe a mere iwetara gị ihe ndị ọzọ dị n'akụkọ a.

Akụkọ na-abịa.