Fulani Herdsmen: Ihe mere ndi ji egbe jiri gbuo mmadụ 19 na Kogi steeti

Ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị ji egbe wakporo obodo Tawari dị na Kogi steeti gbuo mmadụ 19 n'abali foro Fraide.

Aha onyonyo, Akwuke na ndị na achị ehi na-ebi n’udo

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ William Aya gwara BBC na Kogi steeti si " Ha gburu mmadụ iri na itoolu ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ede Ayuba Ekpeji agaala njem nleta ebe ihe mere ma zigakwuo ndị ọrụ ya ebe ahụ.

Otu onye nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ndị ochi ehi bịara ịbọ ọbọ kpara mkpa mkpa ahụ.

O kwuru na onyeisi ndị uweojii suo ọtụtụ ụlọ ọkụ

Ihe Donald Trump kwuru maka mba Iran na-aba

Dịka Iran na-aba mba imemila mba Amerịka maka ogbugbu ọchịagha ha bụ Qasem Soleimani ka Donal Trump na-ekwu na oteela aka ekwesiri igbu Soleiman.

Trump kwuru na aka Soleimani dị na ogbugbu ọtụtụ ndị mba Amerika ma na-akpakwa nkata igbu ndị ọzọ tupu ha egbuo ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Iran aṅụọla iyi ịbọ Amerịka ọbọ maka ọnwụ Qasem Soleimani

Qasem Soleimani

Ebe foto si, AFP/Getty

Nkọwa foto, Ọchịagha Soleimani

Ịran aracharala aka n'ala ṅụọ iyi sị na ha ga-abọrịrị Amerịka ọbọ maka ọchịagha Qasem Soleimani, bụ onyeisi ndịagha mba ha, Donald Trump gburu.

N'ihi nke a, ụlọọrụ nnọchiteanya Amerịka dị na Baghdad agwala ndị mba ha ka ha were ọsọ, were ije gbapụ n'Ịraq ozugbo.

Nke a na-abịa ka ndịagha mba Amerịka gburu Ọchịagha Soleimani bụ onyeisi ndị agha Quds Force, na mba Ịrak n'isi ụtụtụ Fraide.

Ndị isi ụlọọrụ ndịagha mba Amerịka nke e ji Pentagon mara, kwuru na ọ bụ Onyeisiala Donald Trump ziri ha ozi ha gara.

Souleimani na ụfọdụ ndị ọzọ si n'ọdọụgbọelu dị na Baghdad apụta mgbe ogbunigwe na-efe n'ikuku bịara tụọ ha.

N'otu aka ahụ, ndị Quds Force akpọpụtala aha Brigadier General Esmaeil Qaani dịka onye ga-anọchi Soleimani.

Nke na-eme na Fraansị

Onyeuweojii mba Fraansi

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ndịụwe ojii Fraansị ka na-agba ndị akaebe ajụjụ maka ihe mere

Nke na-eme ụgbụ a bụ na ndịuweojii mba Fransị egbuola nwoke ji mma merụọ ndị madụ anọ ahụ n'obodo Villejuif.

ụfọdụ na-ekwu na nwoke ahụ yi ogbunigwe n'ahu ya kama ndị uweojii ka na-eme nyocha ha.

Super Eagles abụrụla nnanna ọzọ

Oro nwa oo!!! Aka na-aghọrọ Super Eagles goolu bụ Francis Uzoho na nwunye ya aghọrọla nwa nwoke.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Dịka o kwuru, ahụ dị nne na nwa mma.

A gbapụtala mmadụ 147 n'aka Boko Haram

Ndị agha Naịjirịa tọghapụrụ mmadụ otu narị na iri anọ na asaa gụnyere ụmụaka na ụmụnwaanyị nke Boko Haram jibu eji.

Ha kwuru na ha gbapụtara ndị a ka ha na ndị oyindụegwu ahụ kwakọrịtachara mgbọ n'okpuruọchịchị Guzambala dị na Borno steeti.

Gana achụchaala ndị nchịkọta ha

Kwesi Appiah

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kwesi Appiah bụ onye nchịkọta otu 'Black stars' so na ndị ọchụchụ a metụtara

Ngalaba na-elekọta egwuregwu bọọlụ na mba Gana, achụọla ndị niile na-achịkọta otu egwu bọọlụ na mba ahụ ụkwụ eru ahịhịa.

Ọchụchụ a metụtara ma ndị na-elekọta otu nwoke ma ndị nwaanyị.

Ha kwuputara nke a n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2020, ebe ha nọkwa kelee ndị nchịkọta niile ahụ maka "mbọ niile ha gbaara egwuregwu na Gana".

Ụmụaka anọ so na mmadụ 18 nwụrụ ka ụgbọelu kpọkasịrị

Ihe mberede ụgbọelụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a abụghị foto si n'ihe mberede mere na Sudan

Ụmụaka anọ so n'ihe ruru mmadụ iri na asatọ nwụrụ ka otu ụgbọelu ndịagha kpọkasịrị na mba Sudan n'abalị.

Ụgbọelu ahụ kpọkasịrị na-erughi nkeji ise o si n'ọdọụgbọelu dị n'isiobodo El Geneina dị na West Darfur felie.

Ụgbọelu ahụ kpọkasịrị bu ihe enyemaka a na-ekenye ndị agha dị n'etiti agbụrụ ole na ole metụtara.

Amer Mohammed al-Hassan bụ ọnụ na-ekwuchitere ndịagha na mba ahụ, gwara ụlọntaakụkọ AFP na ndị nwụrụ gụnyere mmadụ asaa bụ ndị na-arụ n'ụgbọelu ahụ, ụmụaka anọ, ndị nkịtị asatọ nakwa ndị ọkaikpe atọ.

Awakpoghi ụgbọoloko ọbụla

Ndị ụlọọrụ ụgbọoloko na Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ntọ mmadụ wakporo ụgbọoloko si Kaduna aga Abụja ụnyaahụ.

Fidet Okhiria bụ onyeisi ngalaba Nigerian Railway Corporation, kwuru sị na naanị ihe mere bụ na mmadụ mara ụgbọoloko ahụ okwute.

2020 a bụ afọ Liverpool?

Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Liverpool egosila na anya ha dị n'ibulite Iko Premier League n'afọ a, ka ha ji ọkpụ goolu abụọ asataghị otu merie Sheffield United.

Mmeri a emeela ka ha jiri pọịntị iri na atọ na-aga Leicester City bụ ndị na-achụ ha n'azụ na tebulu.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee emume ịwa akwa ndị Obowo