Ndi nwụru na-ọdachị ụgbọelu Cuba eruola 100

Ebe foto si, Reuters
Ihe karịri mmadụ 100 anwụọla n'ụgbọelu Boeing 737 dara na akụkụ ọdọ ụgbọelu Jose Marti nke dị na isi obodo Cuba bụ Havana ụnyaahụ, dịka ụlọ ntaakụkọ nke gọọmentị ha kwuru.
Mmadụ atọ pụtara n'ime ụgbọelu a mana ha merụru ezigbote ahụ, nke mere na-amabeghị ma ha a ga-anya ndụ.
Ụgbọelu a bu mmadụ 110 tinyere ndị nya ya mgbe ọkpọkasịrị.
Ụgbọelu a dara na ehihe ụnyaahụ ka ọ na-aga obodo Holguin na mba ahụ.

Ebe foto si, Reuters
"Ihe mberede ụgbọelu tara akpụ. Akukọ abughi akụkọ dị mfe, ọkachasị etu ndị ometụtara karịrị," onyeisiala Cuba bụ Miguel Diaz-Canel kwuru mgbe ọ gara ebe ọdachị a dara.
Ndị nwe ya bu ụgboelu bụ ọlụọrụ Aerolineas Damojh bụ ndị Mexico, mana ha bunyere ya ụlọọrụ Cubana de Aviación bụ nke gọọmentị Cuba nwe.

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ndị Mexico na-akọwa na ọ bụ n'afọ 1979 ka arụrụ ya bụ ụgbọelu, na-akọwakwa na emere ya nyocha n'ime ọnwa Novemba nke afọ 2017.
Ụgboelu a dara ka ọ na-achọ ịfepụ gawa njem ya.

Ebe foto si, Reuters
Otu onye hụrụ mgbe ihe ahụ mere bụ Jose Luis, bụ onye gwara ndị AFP na ya hụrụ mgbe ụgbọelu feniri elu were tụgharịa daa. "ihe a tụrụ anyi n'anya," Luis kwuru.
Na nyọcha ndị ọrụ ụgbọelu mere, ha chọputara na afọ gara aga bụ nke kachasị mma na njem ugbọelu makana onweghi ụgbọelu nke na-ebu ndi njem dara mancha.
Mana n'ime afọ a enwela mgberede ụgbọelu bu ndị njem atọ.


Akụkọ ga-amasị gị:










