Imo state: Ndị uweojii azọpụtala Eze ndị ntọ ji

Ebe foto si, Getty Images
Ndi uweojii Imo steeti azọpụtala Eze Ugwuaku autonomous Community bu Eze Igbojionu Emmanuel bu onye ndi nto ji ya na odeakwukwo nke okpuru ochichi Okigwe bu Ndubueze Nwokoro.
Ha nwuchikwara mmadu ise a na-enyo na o bu ha kpara aru ahu.
Ụlọikpe n'Amerịka akagbuola ikpe ha ji ama ụmụnwoke aka

Ebe foto si, Press Association
N'egwuregwu, uloikpe mba Amerika nọrọ ụboọhi Fraide kupu akwukwo ndi otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị gbara ka a kwuo ha ihe a na -akwu ogbo ha ndi nwoke.
Mana okaikpe Gary Klauser, onye ekpere ya bụ ikpe ahu nyere ohere ka e lebanye anya n' akpamooke di na njem, ulo obibi na nleta ahuike.
Ụmụagboghọ iri abụọ na asatọ gbara otu na-achịkọta asọmpi na mba Amerịka bụ US Soccer Federation (USSF) ya bụ akwụkwọ n'afọ gara aga.
Ha chọro ka akwụọ ha ihe ruru nde dọla iri isii maka ịkpa oke n'ụgwọọrụ.
Ọnụ na-ekwuru ụmụagbọnyọ ndị bụ Molly Levinson sị na ha ga aga ụlọikpe mkpegharị maka okwu ahụ.
Molly sị, "ya bụ mkpebi mara anyị akpataoyi mana anyị agaghị ewe ya"
Ọ sị na ya ekpebiela ịhụ isi ya bụ ikpe nke ga-akwụsị ịkpaoke n'ụgwọ ọnwa n'egwuregwu bọọụ.









