Anambra state: Onyeara ewerela anyụike kugbuo nna ya

Onyeara

Ebe foto si, Haruna Mohammed

N'Anambra otu onyeara ewerela anyaike kugbuo nna ya gbara afọ iri asaa n'ụtụtụ taa bụ Satọde n'Umuchiana dị n'okpuruọchịchị Agụata.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na ndị otu ha ejidelarị ya bụ nwaamadị aha bụ Chigorom Ezeofor maka nnyocha.

Dịka Mohammed siri kwuo, ọ bụ nwanne nna ya bụ Timothy Ezeofor bịara meera ha ya bụ mkpesa n'isi ụtụtụ taa na ụlọọrụ ha dị n'Aguata.

Dịka ọ dere, ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ na asaa anyịwalaarị ara kemgbe afọ asatọ gara aga.

O dere na "mgbe ndị ọrụ anyị buuru Mazi Godwin Ezeofor rụọ ụlọọgwụ ha chọpụtara na-anwụọlarị".

Ha wetekwara ya bụ anyụike ojiri gbuo nna ya.

Gee akụọ na ndị ọzọ n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Gee okwu a

Aha onyonyo, Mental Health: Ụzọ asatọ ị ga-eji mara onye chọrọ ịkwụ ụdọ ma nyere ha aka

Akụkọ ga-amasị gị