Anambra Women in Politics: 'Ụmụnwoke Anambara achọghị nwaanyị ga-aga ha n'ihu'

Aha onyonyo, Anambara Women in Politics: Ihe ndị mere ụmụnwaanyị Anambara anaghị achịta ata n' ịzọ ndọr

Ụmụnwaanyị Anambara na-emesi ihe ike n'agụmakwụkwọ, azụmahịa, nka na ihe ndị ọzọ mana a bịa n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ dị ka ha a na-akụla bandị azụ, naanị nwanyị ole na ole n'ime ha na-aka obi apụta.

A bịa n'agumakwụkwọ, mmepụta ngwahịa, ihe ejije na ndị ụbụrụ ha na-acha ọkụ, Anambara nwere ụmụnwaanyị na-emesi ihe ike.

Ndị dị ka Oby Ezekwesili, Dora Akunyili, Chimamanda Adichie, Stella Okoli, Sharon Ikeazor wdgz.

E lee ya anya na-elu n'elu, a ga-asị na ụmụnwaanyị Anambara chị ọkụ na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ha so na naanị ụmụnwaanyị ole na ole nọ n'ọchịchị..

Ụmụnwaanyị nọ na Sineti nke Itoolu

Ebe foto si, NASS/BBC

Iji maa atụ, a bịa n'Ụlọomeiwu Ukwu Agba nke Itoolu, naanị mmadụ asaa n'ime ndị omeiwu mmadụ otu narị na itoolu(109) bụ ụmụnwaanyị .

N'ime ụmụnwaanyị asaa ahụ, naanị ụmụnwaanyị abụọ si Ọwụwa Anyanwụ. Ha abụọ bụ Anambara steeti (Stellah Oduah na Uche Ekwunife) .

N'otu aka ahụ, n'Ụlọomeiwu Nta Agba nke Itoolu(9th Assembly), naanị mmadụ iri na abụọ n'ime ndị omeiwu 360 bụ nwaanyị.

N'ime ụmụnwaanyị iri na abụọ ndị a, naanị abụọ bụ ụmụnwaanyị sị Ọwụwa Anyanwụ (Lynda Chuba Ikpeazu - Anambra na Nkeiruka C. Onyejeocha -Abia.)

N'aka nke ọzọ, naanị ụmụnwaanyị Anambara bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ so dị n'ime nwaanyị asaa n'ime mmadụ 109 nọ n'Ụlọomeiwu Agba nke Asatọ(8th Assembly).

Mana nke bụ eziokwu bụ na ebe ha kwụ dị anya na pasent iri atọ bụ mkpebi Beijing afọ 1995 nke kwuru ka a na-enye ụmụnwaanyị n'ọkwa ọchịchị obodo.

Ụfọdụ n'ime ha nọ n'ọchịchị nakwa ikike dịrị onye kọwara ihe ụfọdụ mere ụmụnwaanyị Anambra na-ala azụ n'ihe gbasara ịzọ ọkwa ọchịchị:

1. Ụmụnwaanyị enweghị nkwenye na ha nwere ike imeli ya

Ịyọm Josephine Anenih bụbụ Minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị kwuru na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-akụziri onwe ha na ọchịchị abụghị maka nwaanyị.

"I kwuo okwu ha asị gị, " Ị na-etinye ọnụ n'okwu ịbụ nwoke?".

Ọ bụghị maka ị gụrụ akwụkwọ maọbụ n' a ịgụghị akwụkwọ, ọ bụ ihe dị n'ime anyị."

"Achọ ime ntuliaka ọkwa onyeisioche na 'woman leader na pati, ụmụnwaanyị agaghị ekwe etinye akwụkwọ na ndị ga-azọ ọkwa onyeisioche. Ha echere nanị ọkwa 'woman leader'."

"Ọ bụrụ na ị pụtaghị, onye ga-enye gị ọkwa? Ọ bụghị pụtara ka ịzọ ịzọta i were. Ọ tụrụ arrịrị na ọ bụ naanị ụmụnwoke na-atụnye ọnụ n'ihe gbasara obodo.

2. Nkwenye na nwaanyị anaghị achị nwoke

Dịka Ada Agina-Ude, bụbụ onyeisi otu na-agba mbọ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Gender and Development Action' (GADA) siri kọwaa, "Ọtụtụ ndị Anambara nwere nkwenye na 'Nwaanyị ichi nwoke bụ arụ.'"

3. Nkuzi ụka na omenala na nwoke bụ isi

I lee anya, ọ dị ka ụka na omenala dowere ụmụnwaanyị n'azụ oche.

Ndị Anambara ejighịkwanụ omenala na ụka egwu egwu, ya mere ogogo ụmụnwaanyị nọ 'ọchịchị obodo agaghị agba gharịị.

Dịka Iyom Anenih bụ onye Amaọbịa dị n'Anambara steeti siri kwuo, ihe nkuzi ụka na omenala na-akụziri ụmụnwaanyị bụ na ọchịchị bụ nke nwoke.

Ọ sịrị, "Ụka na omenala akụziela ụmụnwaanyị na nwoke bụ isi," nke mere na ha anaghị ekwe ewepụta onwe ha ịzọ ọkwa

4. Ụmụnwoke Anambara anaghị achọ ịkwado nwaanyị ha ịzọ ọkwa

Ada Agina-Ude bụ nwa afọ Nnewi, Anambara steeti kwuru na ego dị n' Anambra mana ha anaghị etinye ya na-ịkwado nwunye ha.

"N'Anambara, nwoke na-achọ ka nwaanyị ya bụrụ ihe nlele. O kpata ego ọ zụọrọ ya ụgbọala maọbụ ọgbatumtum mana ịsị na itinye ego ka nwaanyị bụrụ onye ọchịchị ọ gaghị eme ya."

N'otu aka ahụ, Agina-Ude rụtụrụ aka na ụmụnwoke Anambra na-achọ ka nwaanyị ha gaa n'ihi mana ọ ganihu ahụ bụ n'ihu ụmụnwaanyị, ọ bụghị ịga nwoke n'ihu."

Agina-Ude, onye ji Bianca Ojukwu chọrọ ịzọ ọkwa senetọ maa atụ, kwụru na ọ bụrụ na steeti ọzọ dịka Enugwu ka ọ pụtara gosi ọchịchọ obi ya, na ha ga-eji ikwanyere Emeka Ojukwu ugwu nye ya ohere ka ọ zọọ.

5. Ụmụnwaanyị Anambra enweghị ụdị ego e ji azọ ọkwa Ọchịchị

Ego ji okwu ma ọ bụrụ ndị kwuru okwu.

Ego so na ihe na-anapụ ụmụnwaanyị Igbo ọkachasị ndị Anambara ara n'ọnụ n'okwu ịzọ ọchịchị obodo.

Oby Kate Okafor bụ onye zọrọ ọkwa gọvanọ Anambara n'afọ 2017 n'aha otu pati Advanced Congress of Democrats(ACB) sịrị, "ebe ọ na-enye nsogbu bụ na ego e ji eme ntuliaka n'Anambra karịrị akarị."

Okafor kọwara n'ezie na ndị pati dị na Naijiria anaghị ana ụmụnwaanyị ego e ji agba akwụkwọ ịzọ ọchịchị, "Mana ego ị ga-eji eme ndọrọndọrọ kwanụ? E nye gị ọkọlọtọ, i ji ego i ga-eji eme ndọrọndọrọ?"

Uche Akolisa dere akụkọ, ebe Nnamdi Agbanelo meere onyonyo so ya.