Chiwetalu Agu apụtala n'aka ndị DSS

Ebe foto si, Shirley Igwe/Instagram
Omeiheonyonyo bụ Chiwetalu Agu apụtala n'aka DSS kpụ ya gawa Abuja.
Ọ bụ otu ndị na-enye ihe onyonyo bụ AGN nwara ịgbapụta ya ma mee nke a.

Ebe foto si, @monalisachinda/Instagram
N'ozi ndị AGN wepụtara ha kwuru na Agu kelere chukwu ma kelee ndị otu AGN maka enyemaka ha n'ịzọpụta ya.
Foto Monalisa Chinda weputara n'akara Instagram ya gosiri ebe Chiwetalu Agu nọ n'etiti ya na Steve Eboh ma yiri uwe ojii.
DSS akpụrụla Chiwetalu Agu gawa Abuja - Steve Eboh
Cheta na BBC chọpụtara na ndị DSS ji Chiwetalu Agu akpụrụla ya gawa Abuja.
Omeiheonyonyo bụ Steve Eboh kọwaara BBC nke a mgbe akpọtụrụ ya ịmata ka ya na okwu ahụ si aga.
O kwuru sị na ha gara ịleta Agu n'ebe ndị DSS ji ya mana ha gwara ya na eburu la Agu gawa Abuja.

"Anyị bụ ndị AGN na-akwado ịga Abuja mara ihe mere e ji kpụrụ Agu gawa ebe ahụ" ka o kwuru.
Mgbe anyị jụrụ ya maka ebubo ndị DSS boro Agu mere ha ji jichie ya ọ sara si na "o dobeghi anya".
"O nwegbeghi ihe DSS boro ya, anyị na-achọ ịma ihe eji jichie ya mbụ tupu ihe ọzọ" ka Eboh kwuru.
Cheta na BBC Igbo kwuru na DSS ka ji omeiheonyonyo Agu n'agbanyeghị akụkọ na-efegharị na atọghapụla ya kpamkpam.
Nwa amadị a si n'aka ndị agha Naịjirịa banye n'aka ndị "Department of State Services" (DSS) n'ụbọchị Fraịde.
Ndị otu ya gwara BBC Igbo na ngalaba ahụ sị na ya chọrọ ịgba ya ajụjụ ọnụ.
Ha sịbụ na ha chere na ọ bụ otu awa ka o ga-anọ ebe ahụ mana ha mechakwara sị na ha na-achọ na onye ọkaiwu nwere agba ga-abịarịrị binyere ya aka tupu ha ahapụ ya.
Steve Ebo bụ onye na-ahụ maka ihe banyere mmekọ ndị agha Naịjirịa na otu ndị na-eme ejije bụ Actors Guild of Ngeria (AGN) kwuru na DSS na Maazị Agu nọ na mkparịta ụka ya na BBC Igbo n'ehihie Fraịde.
Maazi Ebo e ji Ajebo mara gwara BBC Igbo na ahụ dị Chiwetalu.
Ọ sị na ndị agha sị na ha ma ụma kpọpụta Chiwetalu ebe o yi akwa yiri nke ndị Ipob eke buredi n'Upper Iweka.
O kwuru na ndị agha kwuru na ha amaghị ihe kara ime ebe ahụ ma ọ bụrụ na ha akpọpụtaghị ya mgbe ahụ dịka ọnọdụ dị njọ n'Onitsha ugba.
Ọ sị: "anyị agbapụtala Chiwetalu n'aka ndị agha Naịjirịa. Ndị agha etighị ya ihe ma ọlị. Ugbua anyị apụtala n'aka ndị agha, anyị nọzị n'aka ndị DSS ugbua maka nnyocha nke ha".

Ebe foto si, Screen grab
O kwuru na Chiwetalu nọ n'ọzọ mgbe e jidere ya, na ọ ga-alọghachi azụ n'ọlụ ma ọ opụta n'aka ndị DSS.
Lee akwụkwọ ozi ndị otu AGN ziputere maka nke a.

Ebe foto si, AGN
Cheta na ndị agha Naịjirịa nwụchiri Maazị Agu n'Ọnịcha ụnyaahụ ma boo ya ebubo na ọ na-akwado otu Indeginous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN).
Ndị agha bugara Chiwetalu Agu n'ogige ha bụ 82 Division dị n'Enugwu bu ebe e si gbapụta ya ugbua.
Onyeisioche Actors Guild of Nigeria mpaghara Enugu bụ Brown Ene gwara BBC Igbo na ya nọ n'ụzọ ịga ebe Maazị Agu nọ ugbua.
Ọ bụ ya gwaburu BBC Igbo na e nwereike ịtọhapụ Maazị Agu taa.
Ọ sị na ya ga-atụnye anyị azụ dịka ha na-aga n'ihu.
Ihe onyonyo ọhụrụ pụtara na-egosi ebe Chiwetalu Agu nọ n'aka ndị agha Naịjirịa na-akọwa na akwa ya yi abụghị akwa Biafra ma ọbụ ESN.
Ọ sị na ya bụ akwa bụ afe nkịtị esere anyanwụ na-awa awa, "ọ bụghị afe Biafra ma ọ bụ ESN".
Mgbe ha sị na ọ kpọkọtara ndị mmadụ na-agwa ha okwu, ọ zara na ọnweghị onye ya kpọrọ kama na ya gotere achịcha bekee ya na-eke ndị mmadụ.
Ọ sị "e gotere m bụredi puku iri naanị m kere ndị mmadụ. Ọ bụ arụ ike ndị mmadụ ihe?"
Ndị agha ahụ jicha egbe emetughị ya aka, mana ha si ebe ha tukwuwere ya ala kpọrọ ya bawa ụlọ.
Chiwetalu Agu Biafra: Anyị nwuchiri ya n'ihi na ọ na-akwado IPOB - Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images/NG Army
"Ọ bụ maka na Chiwetalu Agu na-ajalite ndị mmadụ mmadụ ma na-akwado otu IPOB kpatara anyị ji nwuchie ya."
Nke a bụ ihe Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha Naịjirịa kwuru banyere nnwuchi ndị agha nwuchiri Mazị Chiwetalu Agu bụ onye a ma ama na-eme ihe ejije Nollywood.
N'akwụkwọ ozi nke Onyema Nwachukwu wepụtara n'abalị Tọzde, o kwuru na IPOB bụ otu a machiri amchi dịka ndị oyi egwu na Naịjirịa.
"Onye ọbụla na-akwado IPOB na-ama ikike Naịjirịa aka n'ihu," Onye Nwachukwu depụtara.
"Ọzọkwa bụ na ọ na-eme nke a n'agbanyeghị etu ọnọdụ nchekwa siri dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua."
"Tinyekwara atụmatụ nchekwa nke ndị agha na-eme a kpọrọ 'Exercise Golden Dawn."
"Anyị anwụchiela Chiwetalu Agu ugbua dịka nnyocha ka na-aga n'ihu."

Ebe foto si, Nigeria Army
Ọnụ na-ekwuru ndị agha kwuru na onweghị mgbe ndị agha jiri mekpaa Chiwetalu Agu ahụ dịka ọtụtụ akụkọ na-ekwu.
Onye Nwachukwu gara n'ihu kwuo na ndị agha Naịjirịa agaghị agbachi nkịtị ka ndị IPOB nakwa ndị nkwado ha na-ebute enweghị nchekwa na Naịjirịa.
Ọ gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ ọbụla kama ka onye ọbụla na-agara mkpa ya ma na-edebekwa iwu obodo.
Anyị amalitela nchọpụta ịmata ihe na-esere Chiwetalu Agu na ndị agha - Actors Guild of Nigeria

Ebe foto si, Emeka Rollas
Onyeisi otu Actors Guild of Nigeria bụ Emeka Rollas ekwuola na ha amalitela nnyocha n'ihe mere n'etiti Chiwetalu Agu na ndị agha Naịjirịa.
Onyonyo pụtara na soshal midia taa gosiri ebe Chiwetalu Agu na ndị Agha nwere nghọtahie nke mere ka ha dọọ ya na-akwa ma buru ya eburu bupu.
Onwebeghị onye ma ihe kpatara nke a, mana onyonyo ahụ gosiri na Chiwetalu yi uwe e ji ọkọlọtọ Biafra kwaa.
Oge BBC Igbo kpọrọ Emeka Rollas, o kwuru na ya ahụla onyonyo ahụ mana nnyocha amalitela.
"Ezigala m onye enyemaka m n'okwu gbasara ndị agha ka ọ gaa jụta ihe merenụ kpọmkwem," Rollas kwuru.
"Anyị amaghị ma uwe ahụ Chiwetalu yi ọ bụ ejije ka o ji ya eme ka ọ bụghị."
"Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ihe edobeghị anya, mana anyị ga-achọpụta ma zighachitere ụnụ ozi."
Gịnị mere n'etiti Chiwetalu Agu na ndị agha

Ebe foto si, Chiwetalu Agu
Ihe onyonyo BBC Igbo hụrụ gosiri ebe ndị agha Naịjirịa na-adọ onye Chiwetalu Agu aka n'akwa.
Onyonyo a yiri ihe e sere na mpaghara Ụpper Iweka dị n'Ọnịcha.
Maazị Agu bụ onye ejije Nollywood ama ama na-egosi onwe ya n'onyonyo ebe oyi uwe e ji ọkọlọtọ Biafra kwaa.

BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ Maazị Agụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị agha Navy n'Ọnịcha bụ Lt Ajikobi gwara BBC na ya anọghị Ọnịcha ugbua, nke mere ya amaghị maka ihe mere.
Dịka onyonyo a gosiri, ọ dịka ndị agha emechara hapụ Maazị Agu.
Cheta na Chiwetalu Agu na-eyikari uwe ọkọlọtọ Biafra na-ese foto ma na-etinye na soshal midia.
Oge ọbụla, ọ na-ekwu na Biafra bụ "atụmatụ oge ya ruru".











