Ladipo Market Crisis: Anyi achọghịzị ka ndị agha bia zuo ahia n’aka anyi ọzọ – Ndị ahia Ladipo

BBC/Ndiagha

Ebe foto si, BBC/Ndiagha

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha ka na-enyocha ihe mere n'etiti ụfọdụ ndị agha Naịjirịa na ndị na-azụ ahịa na Ladipo dị na Legọs.

Major Osoba Olaniyi nke 81 division na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa ọnụ kwuru na odochabeghị anya ihe mere n'ahia ahụ kama ha mechaa nyocha, ha ga-agwa ọha ihe ha chọpụtara.

Onyeisi ahia 'Aguiyi Ironsi Market' dị na Legọs bụ Jude Nwankwo kwuru na obi dị ya ụtọ ka e nweghi onye ọ bụla nwuru na ya bụ ihe ọgbaghara mere, mana na n'ihe a merenụ adịghị mma na ntị chaa.

BBC

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Onyeisi ahia Ladipo

O kwukwara n'ihe bulitere ya bụ ọgbaghara bụ ngwa ahia a na-akpọ "kickstarter" nke a si na otu onye agha zụpụtara na aka otu onye ahia n'ọnụ naira puku atọ na narị ise.

N'ozị ya, o kwuru na agwa a ndị agha elụ kpara adighi mma, na ihe a megidere ndị nkiti n'ejighi egbe ọ bụla.

Onyeisi ahia ahụ kwuru na enweghi ihe onye nkiti ọ bụla mere kwesiri ikpalịte ndị agha iburu egbe gbawa n'etiti ahia.

Aha onyonyo, Balogun Market Fire: Ọkụ agbatuola ụlọahịa abụọ n'ahịa Balogun Legọs

Onyeisi ahia ahụ kwukwara na odighi mma ka ha bụ ndị agha abiaghi hụ ya maka ya bụ okwu ma buru egbe gbawa n'ime ahia.

Ọ rịọ kwara ndị ahia arịrịọ ma gwa ha ka iwe ha dajuo. Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na ha ga-aga njem nleta n'ụlọọgwụ LUTH ga leta ndị meruru ahụ n'ime ya bụ ọgbaghara.

N'iwe, ndị ahia pụtara ọgbakọ ebe ahụ n'ututu Wednezde a kwukwara na dịka ihe a mere, na ha achọghịzị ka ndị agha bia zụrụ ahia n'aka ha ọzọ.

Anyi achoghizi ka ndị agha bia zuo ahia n'aka anyi ọzọ - Ndị ahia Ladipo

Ahia Ladipo dị na Legọs

Ndị na-ere ahịa n'ahịa Ladipo dị na Legọs kọwara ka nsogbu si dapụta n'etiti ndị ahịa nakwa ụfọdụ ndị agha n'ụbọchị Tuzde.

Ha kwuru na ndị agha elụ ahụ gbara ụfọdụ ndị na-azụ ahịa ebe ahụ egbe.

Mana onye nta akụkọ BBC nọ ebe ahụ ugbua na-ekwu na ọ hụghị ndị ahụ e kwuru a gbara egbe.

Ha kwukwara na ndị agha ahụ biara ka ha na ndị isi ahịa nwee mkparịtaụka mana ha nyara ụgbọala aghara aghara nke mere ndị ahia ji wee iwe.

Ladipo

Ndị ahịa ekweghị ka ndị agha ahụ pụọ mana ndị isi agha mechara wuchie ebe ahụ ma kpezie udo.

Ugbua ihe niile ederela duu mana ndị mmadụ kpọchịrị ụlọahịa ha mgbe ọgbaghara a dapụtara ekweghịzi emepe ya ozigbo

A na-ere akụrụngwa ụgbọala n'ahịa Ladipo dị na Legọs.

Aha onyonyo, Ndị ntorobịa kwesịrị ị na-etinye uchu n'ọrụ maọbụ ahịa ha na-amụ