NDA Kaduna Attacks: Ndị omekome awakpoola isi ụlọọrụ Nigeria Defence Academy, gbuo ndị agha abụọ

NDA

Ebe foto si, NDA Facebook page

Ndị omekome awakpola isi ụlọọrụ Nigerian Defence Academy dị na Kaduna, gbuo ndị agha abụọ ma tọrọ ụfọdụ ndị agha.

Bashir Muhd Jajira bụ ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ ahụ kwuru na ndị omekome mabatara ebe ụlọ obibi Nigerian Defence Academy dị n'Afaka.

"Anyị na ndị ụlọọrụ 1 Division Nigerian Army nakwa Air Training Command nakwa ngalaba ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ amalitela ịchụso ndị omekome ahụ ka anyị nwuchie ha gbapụta onye otu anyị atọrọ.

Jajira kwuru ka ọ dị ugbua na ndị bi n'ogbe ahụ enweghị nsogbu. "Anyị na-agwa ndị ọhaneze na anyị ga-anwụchi ndị omekome ahụ ma gbapụta onye otu anyị ha tọọrọ."

Ụlọọrụ Nigerian Defence Academy dịketere ụlọakwụkwọ Federal College of Forestry Mechanization Afaka, dị n'okpuruọchịchị Igabi dị na Kaduna steeti ebe ndị bandit tọrọ ụmụakwụkwọ ruru iri atọ na itolu n'ọnwa Maachị.Ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ Bethel na nke Oyedepo n'ime otu abalị, ndị ntọrị echerela el-Rufai aka mgba?

Oyedepo na ndị nne na nna nọchịrị ụzọ maka ntọrọ ụmụ ha na Kaduna

Ebe foto si, David Oyedepo facebook page /Screengrab

Ndị agha Naịjirịa ekwuola ka ha si kwụsị ndọ 'bandit' biara iwakpo ụlọakwụkwọ Faith Academy dị n'okpuruọchịchị Chikun dị na Kaduna n'ụtụtụ Mọnde.

Onye hibere ụlọakwụkwọ ahụ bụ ụkọchukwu Bishop David Oyedepo.

Nke a na-abịa dịka e nwetechara akụkọ na-awakporo ma tọrọ ụmụakwụkwọ na Bethel Baptist School, Kaduna n'otu mọnde ahụ.

Ndị nne na nna ụfọdụ ụmụakwụkwọ nọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ gwara ndị ntaakụkọ Punch na ndị omekoma ahụ kụtụrụ ahụ aja ụlọakwụkwọ ahụ ma tọrọ ụmụakwụkwọ.

Ha kwukwara na ndịsi ụlọakwụkwọ Bethel na-akwado ịkpọ ụmụakwụkwo ha gaa ebe ọzọ dịka ha na-akwado ime ule tupu ihe a eme

Ndi uweojii tọghapụrụ mmadụ 26 n'ime ndị atọrọ n'ụlọakwụkwọ Bethel dị na Kaduna

Kaduna Kidnapping

Ebe foto si, FED. COLLEGE OF FORESTRY MECHANIZATION /Facebook

Ndị uweojii nọ na Kaduna steeti kwuru na ha tọghapụrụ ụmụakwụkwọ ruru iri abụọ na isii ndi omekome tọrọ n'ụtụtụ Mọnde 5,2021 n'ụlọakwụkwọ sekọndiri Bethel Baptist dị n'okpuruọchịchị Chikun, Kaduna steeti,

Asp Muhammed Jalige bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha ndị ọrụ ngalaba ọrụ nchekwa ndị ọzọ chụmiri ndị omekome ahụ mgbe ha natachara mkpesa na ha wakporo ogbe ahụ.

Jalige kwuru na a ka na-agba mbọ ịhụ ha tọghapụrụ ndị ọzọ atọrọ ka nọ n'aka ndị omekome ahụ.

O rịọrọ ndị nne na nna ka ha ghara ịtụ ụjọ makana ha na-agba mbọ ịhụ na ha kwụsịrị arụrụala a ndị omekome a na-akpa kpam kpam.

Kwamgbe, kwamgbe ka akụkọ ntọrị mmadụ ka na-arị ibe ya elu na Kaduna steeti dị na Naịjirịa.

Naanị izuụka a gwụcharanụ ka akụkọ atọ apụtaala maka etu ndị akpọrọ 'Bandit' si tọrọ ndị mmadụ aghara aghara na steeti ahụ.

Ntọrọ mere n'ụlọọgwụ nakwa Ụlọakwụkwọ dị na Zaria

Ụmụnwaanyị nọchịrị ụzọ maka etu e si tọrọ ndị mmadụ na Zaria

Ebe foto si, Screengrab

Ndị omekome tọrọ ụmụaka e ku n'aka , ndị nọọsụ, nakwa ndị ọrụ nchekwa n'ụlọọgwụ dị na Zaria dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Ugwu, Naịjirịa.

Ndị ntaakụkọ ha na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-arụkọ ọrụ kwuru na atọrọ ndị nọọsụ ụmụnwaanyị bi n'ụlọobibi "National Tuberculosis" na "Leprosy Centre."

Akụkọ kwuru na a ndị omekome ahụ gbapụtara n'ọhia soro ndị uweojii kwatawa mgbọ tupu ha kpọrọ ndị ha tọrọ gbafuo.

Ndị uweojii nọ na Kaduna kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na ha atọghapụla ndị a tọrọ na Kaduna ụnyahụ.

Map Kaduna

A tọrọ ụmụakwụkwọ karịrị 100 n'ụlọ akwụkwọ Bethel Baptist School dị na Zaria - Nne na nna

Ndị omekome ahụ mechara gawa ụlọakwụkwọ dị na steeti ahụ ebe ha tọrọ ụmụakwụkwọ ole mo ole amabeghị ọnụ ọgụ ha mana otu nna nwataakwụkwọ ekwuola na ha karịrị otu narị atọrọ.

Otu nne atọrọ nwa ya dị afọ iri na ise ekwuola na ndị omekome ahụ batara n'ụlọakwụkwọ ahụ ebe elekere abụọ nke ụtụtụ Monday.

Ndị omekome na-awakpokarị mahadum dị na mpghara ugwu ma tọrọ ụmụakwụkwọ ha ga-achọ ka e were ego gbapụta.

A tọrọla ụmụakwụkwọ ruru otu puku kamgbe December9, 2021. A ka na-achọ ihe ruru mmadụ narị abụọ.

Nke mbụ mere n'abalị Frade gara aga

Ndị oji egbe gburu mmadụ asaa na mwakpo abụọ ha mere n'obodo dị iche iche na Kaduna.

Ndị mmadụ kwuru na ha hụrụ mgbe ndị omekome ahụ batara n'otu obodo ebe ahụ n'ụbọchị abalị Fraide gbuo mmadụ anọ ma tọrọ mmadụ iri n'ọbodo ndị ọzọ dị na Kaduna.

Gọọmenti Kaduna kpọ ndị ọrụ nchekwa ga ịhụ obodo mwakpo a metụtara.

Mwakpo nke a na-abịa dịka gọvanọ Kaduna bụ Nasir El-Rufai kpọpụtara ụmụ ya n'ụlọakwụkwọ gọọmenti maka ụjọ na enwerike ịtọrọ ha.

O teelarịị ya bụ mkpa mkpa ntọrị ji aga n'ihu na Kaduna nakwa steeti ndị diketere ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: