Nnamdi Kanu Latest: N'uche m ọ bụ ntọrọ ka gọọmentị etiti tọọrọ onyeisi ndị IPOB - Wole Soyinka

Wole Soyinka

Na mkparịtaụka Wole Soyinka na BBC nwere nsonso a ka o kwuru sị "n'uche m, ọ bụ ntọrọ ka gọọmentị etiti tọọrọ Nnamdi Kanu. Nke a bụ ihe ọjọọ n'iwu mba ụwa, ma bụrụkwa ihe ọjọọ n'anya mmadụ".

Ọ bụ dịka Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu n'ụbọchị ụka(June 27, 2021) maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ butere ya bụ okwu.

Cheta na Kanu gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike.

Ihe Wole Soyinka kwuru maka ndị na-achọ nwereonwe naagwa gọọmentị etiti na-akpaso ha.

Wole Soyinka kwuru na ọ bụghị Nnamdi Kanu maọbụ Sunday Igboho bụ isiokwu. Kama ihe bụ isiokwu bụ akparamagwa gọọmentị nke na-akpata ụdị agwa ndị a.

Soyinka kwuru sị "ọ bụghị mụ ka ọ dịịrị ịgwa gọọmentị etiti ha dịrị nkwadobe maka na mgbe etu ha sị nwụchi Nnamdi Kanu ga-apụta, ọ ga-ada ụda"

O kwuru na bido gawa ihu na gọọmentị etiti kwesiri ịleba anya mata etu ndị mmadụ sị tụkwasị ha obi ma kwụsị aka ike ha ji eso otu dị icheiche na-achọ mnwereonwe ha n'ala Naịjirịa.

Aha onyonyo, Nwa Igbokwe dere na-agbahapụla m bụ onye nọ mgbanta ije kemgbe afọ 30 - Joe Igbokwe

Ihe Soyinka kwuru maka etu gọọmentị etiti ga-esi mee ka ndị mmadụ tụkwasịkwa ha obi ọzọ

Soyinka kwuru na n'ezi a, ike ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị otu ya agwụla ndị mmadu,ma kwu kwa na ndị mmadu enweghịzi ntụkwasị obi n'ebe ndị ochichi a nọ.

Ọ rụtụrụ aka etu gọọmentị nwere ike ịsị gbapụta onwe ha n'anya ndị mmadu.

Na nchịkọta okwu ya o kwuru na ọ bụghị gọọmentị ikpuchiwe ajọ agwa ha, maọbụ irụwa ndị ọzọ aka ga-eme ka ndị mmadụ tụkwasị ha obi.

Aha onyonyo, Victor Umeh

"N'ezị a, gọọmenti ekwuola na ọ bụghị ha hiwere otu ndị ọmekọme a na akpọ Boko Haram, maobu kwanu ndị otu Miyetti Allah, na-agbanyeghi na ha na-akpa ike. Ngwanu, anyị ekwetela na ọbụghị gọọmentị hiwere ha, kama kedụ ihe unu bụ ndị gọọmentị n'eme maka ihe egwu na mwakpo ndị ọjọọ a? Ọ bụghị naanị itu ndị ọzọ aka bụ ihe ndị ochichi kwesiri ị na-eme, n'uche m ọ bụ mgbe ha gosiri aka ike ha n'ebe ndị omekome a nọ ka anyi gaa enweta ọganihu n'okwu a"

Ihe ndị mba Briten, Kenya na gọọmentị Naijirịa na-ekwu

Chetekwa na ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ nnọchiteanya mba Briten na Naijirịa bụ Dean Hurlock kwuru n'izu gara aga na aka mba Briten adịghị na nwụchị na mkpọghachite Nnamdi Kanu, onye bụ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) na Naịjirịa.

Aha nkeananụānụ, Nnamdi Kanu: Anyị na-ahazi etu dọkịta ya ga-esi hụ ya nke taa nke echi - Ifeanyi Ejiofor

Hurlock kwuru sị, "Anyị ma maka akụkọ kwuru na anwụchịrị Kanu, anyị na-ekwu na ọ bụghị na mba UK ka anwụchịrị Nnamdi Kanu".

N'akụkọ yiri ya, mba Kenya gọkwara na aka ha na ụkwụ ha adịghị n'okwu nnwuchi na ịkpọnye Naịjirịa Nnamdi Kanu.

Ọ bụ onyeisi ụlọọrụ nnọchitenaya mba Kenya na Naijirịa bụ Wilfred Gisuka Machage kwuru nke a n'ụbọchị abụọ bụ Frịde ọnwa Julaị, 2021.

Machage sị na akụkọ na aka Kenya dị n'ihe mere Nnamdi Kanu bụ "asịrị gbakaa ute".

Dịka mba ndị a echere na ọ bụ ebe be ha ka a wakpuru Nnamdị Kanụ na-eme nkwụpụta ndị a, gọọmentị Naijiria ekwụbeghị ihe obula maka ihe a ndị mba a na-ekwu.

Aha onyonyo, 'Asari Dokubo enweghị ike imegheri anyị anya n'inweta Biafra'- Ipob

Chetekwa na n'ozị ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami zipụtara maka nwuchi Nnamdi Kanu n'ụbọchị 30 Juun n'Abụja, o kwuru sị:

"Anyi chọrọ ị gwa ụwa na anyị na ndị uweojii pụrụ iche na kwa ndị nechekwa ndị ọzọ anwuchiela ma kpọlata Nnamdi Kanu"

Gọọmentị kwu kwara na ha nwere ndidi ma na-esi imi n'ala mgbe ha na-achụ Nnamdi Kanu kamgbe afọ abụọ gara aga.