Kaduna School Kidnapping: Ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ isii na Kaduna

Map Kaduna
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ndị ntọrị anwụrụla ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị mmadụ isii na Kaduna Steeti.

Ndị uweojii na steeti ahụ kọrọ na ndị ekperima ahụ bucha egbe wee banye n'ụlọakwụkwọ ahụ bụ ebe ụmụakwụkwọ bi.

Nke a na-eme mgbe o ji nkeji iri gafee elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ ụbọchị Toozdee.

Ndị ntọ ahụ tọrọkwaara ndị nkuzi mmadụ abụọ.

Aha ụlọakwụkwọ ebe ihe ahụ mere bụ 'Engravers College' dị n'obodo Kakau Daji n'okpuru ọchịchị Chikun.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kaduna bụ Yakubu Abubakar kwuru na ndị otu ha na-anwa oke ha ugbua iji hụ na a chọtara ndị ahụ a tọọrọ,

Ọ dọkwara ndị nwere ụlọakwụkwọ aka na ntị ka ha kpọtụrụ ndị uweojii mgbe ọbụla ha hụrụ ihe maọbụ ndị gbara ha gharịị n'okirikiri ha

Gọvanọ Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwukwara na ha na-eme ihe nile ike kwere ha iji hụ na ndị ahụ atọọrọ nweere onwe ha.

Ntọrị mmadụ arịala elu na mpaghara ugwu Naịjiria n'ọdịnso a.

Steeti dịka Kaduna, Katsina nakwa Zamfara bụ ebe ya bụ ihe kacha njọ.

Nke a abụghị mbụ nke ọ na-abụ abụọ a na-atọrọ ụmụakwụkwọ na ụlọakwụkwọ ha na Naịjirịa.

Abalị abụọ na-abịa abịa ka ọ ga eme puku abalị abụọ ndị Boko Hara ji tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị karịrị narị abụọ na Bọrnọ State.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke ahụ mere n'obodo a na-akpọ Chibok, n'ọnwa Eprel afọ 2014.

Ọtụtụ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ ka nọ n'aka ndị Boko Haram ruo taa.

Ndị oyi egwu ahụ tọrọkwaara ụmụakwụkwọ ụmụnwayị ọzọ ọnụọgụgụ ha karịrị otu narị n'ụlọakwụkwọ ha dị na Dapchi, Yobe Steeti.

Nke a mere n'ọnwa Febụrụwarị nke afọ 2018.

Ha mechara tọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ, mana otu n'ime ha aha ya bụ Leah Sharibu esoghi na ndị a hapụrụ.

Ndị Boko Haram jụrụ ịtọhapụ Leah Sharibu n'ihi na okweghị ka a tọghaa ya site n'okpukpe ụka Kraịst baa nkd Alakụba.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Youths Talk: Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na inwe ohere ichi Naịjirịa?