Kaduna Kidnapping: Anyị ka na-eche ịhụ ụmụ anyị - Nna otu n'ime ndị a tọhapụrụ

Federal College of Forestry Mechanization

Ebe foto si, Federal College of Forestry Mechanization/Websi

Otu n'ime nne na nna ụmụ akwụkwọ Federal College of Forestry Mechanization kwukwara na ha ahụbeghị ụmụ ha kama ha nwetere ozi na ha niile apụtala.

O kwuru na ha na-aga ụlọ akwụkwọ ha izute ha n'ụtụtụ a ma sịkwa na ọ chere na ọ bụ ngagharịiwe ha mere n'Abuja mere ka ụmụ ha pụta.

Otu n'ime onye nne na nna ọzọ gwara BBC na ha nọ n'ụzọ ị ga izute nne na nna ha oge ya na BBC nwere mkparịta ụka.

Obasanjo

Onye nkuzi ofufe alakụba bụ Sheikh Ahmad Abubakar ekwuola na onye bụbu onyeisiala Naijirịa bụ Olusegun Obasanjo tinyere aka iji hụ na-atọhapụrụ ụmụ akwụkwọ Federal College of Forestry Mechanization dị na Kaduna bụ ndị nọ n'aka ndị ntọ na steeti ahụ kamgbe ọnwa Machị.

Sheik Gumi kwuru sị, " Anyị gbalịrị ịzọpụta ụmu akwụkwọ a site na enyemaka onye bụbu onyeisiala Naijirịa bụ Olusegun Obasanjo".

Sheikh Ahmad Abubakar gwara BBC na ọ bụ ya so kwa na mkparịtaụka mere ka atọhapụ ụmụ akwụkwo ahụ.

Kama, Gumi ekwughị ma enwere ego a kwụrụ tupu atọhapụ ụmụ akwụkwọ a.Etu mmiri sịrị banye opi ụgbọgoro

Ọ bụ n'ọnwa machị afọ 2021 ka ndị oji egbe wuchiri mahadum agụm akwụkwọ maka ime ọhịa dị na mpaghara Mando nke Kaduna steeti were tọrọ mmadụ iri atọ.Ụmụ akwụkwọ a anọọla ọnwa abụọ n'aka ndị ntọ a.

Aha onyonyo, Kaduna Anglican Kidnap: Ihe bụ eziokwu maka ndị ụka Anglịkan a tọọrọ na Kaduna

Gọvanọ Kaduna steti bụ Nasir El-Rufai ekwuola ụgboro ụgboro mgbe na ya agaghị eme ihe ndị omekome ọbụla si ya mee maọbụ kwụọ ụgwọ mwere onwe ndị atọọrọ.Ntọhapụ ụmụ akwụkwọ a biara dịka nne na nna ha mere ngagharịiwe n'ezi ụlọ omeiwu nke dị n'Abuja n'ụbọchị Tuzde.

E bu ụzọ tọhapụ mmadụ iri n'ime mmadụ iri atọ na itolu ha tọọrọ.