Ndị ntọ atọọrọla otu onye ntaakụkọ n'Ụmụahịa
Akụkọ dị mkpa taa:

Ebe foto si, Chinyere Iwuoha/Facebook
Ndị ji egbe atọọrọla otu onye ntaakụkọ na-arụ na redio nke Federal Radio Corporation of Nigeria (FRCN) dị n'ụmụahịa aha ya bụ Chinenye Iwuoha n'abalị Monde.
A tọrọ Iwuoha na nso Amakanma Estate dị n'Ụmụahịa, oge ya na onyeisi ndịọrụ bụ Uche Ndukwu na mmadụ abụọ ndị ọzọ na-ala ọrụ.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị ntọ ahụ chere na ọ bụ Iwuoha bụ onyeisi ọrụ n'ime ndị nọ n'ụgbọala ahụ kwọ ha ala nke mere ha jiri kpụrụ ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n' Abia bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ha ma maka ya bụ ihe kama na ụlọọrụ FRCN ewetabeghị mkpesa ọbụla nye ndị uweojii banyere ya.
Akpachaghị anya, gọọmenti etiti ga-agbachi obodo ọzọ- NCDC

Ebe foto si, NCDC
Ihekweazu, onyeisi NCDC bụ otu na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria agwala ụmụ Naijiria ka ha kwado maka mgbachi obodo kpamkpam ma ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ndị butere coronavirus gbalie.
Ihekweazu tụrụ arịrị na ọtụtụ ndịmmadụ anaghị agbaso ntuziaka gọọmenti naa-etu a ga-esi gbalahụ ikesa ọrịa cọrọnavirus.
Ụgbọelu kpọkasịrị na Somali

Ebe foto si, African Express Airways
Mba Kenya a kpọọla oku ka e nyochaa ihe mere ụgbọelu bu ngwa ọgwụ kpọkasịrị na mba Somalia n'ehihie Monde.
Otu ụgbọelu mba Kenya kpọkasịrị ma gbuo mmadụ isii nọ n'ime ya ụbọchị Tuzde.
A ga-eme asọmpi nkeji iri anọ na ise ka ọ bụ nkeji iri itoolu?

Ebe foto si, BBC Sport
N'egwuregwu, dịka a na-eche ịmalitegharị egwuregwu Premier League n'ụbọchị asatọ nke ọnwa June, ọtụtụ echiche na-apụta maka ịgbazụ asọmpi niile nke ahapụrụ n'agba nke 2020.
Onyeisi ndị 'Professional Footballers Association' bụ Gordon Taylor na-eche ma ọ ga-aka mma igbuji asọmpi na nkeji iri anọ na ise karịa nkeji iri itoolu dịka ọ dị ugbua.









