Anambra Governorship Election 2021: Ihe ndị mmadụ gwara Simon Ekpa dịka ọ sị na agaghị eme ntuliaka

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook

Dịka ntuliaka a ga-eji họpụta aka ga-achị Anambara Steeti na-abịa nso, otu onye otu na-achọ nwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa a kpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Simon Ekpa apụtara kwuo na agaghị eme ntuliaka na steeti ahụ.

Okwu Maazị Ekpa a dabanyere na nke onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu na-ekwu tupu gọọmentị Naịjirịa anwụchie ya ma kpụlata ya Naịjirịa.

N'ụbọchị 22 nke ọnwa Mee 2021, dịka ọ na-agbasara ndị otu ya ozi, Kanu sị na ya na ndị otu ya agaghị ekwe ka emee ntuliaka n'Anambra maọbụ ịchụnta vootu.

Ọ bụ na Twitter ka Maazị Ekpa dere ebumnuche ya banyere ntuliaka Anambara a ma si ka ndị mmadụ gwa ya uche ha banyere atụmatụ ahụ.

Ụfọdụ n'ime ndị sara ya okwu nabatara atụmatụ ahụ ebe ndi ọzọ sị na ha ekweghị na ya.

Ekpa si na ihe mere ya ji asị na ntuliaka nwereike agaghị emezi na "ala Biafra" bụ "makana ọ bụ otu ụzọ e ji agwa ndị ndọrọndọrọ na-eme nrụrụaka na egwu agwụla".

Ọ sịkwa na emeghị ntuliaka ga-eme ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị taa ahụhụ maka ha agaghị enwezi ike - ọ sị na nke a ga-ebute mkparịtaụka banyere Biafra.

Mana, otu onye aha ya bụ "SirPope" sara Maazị Ekpa were sị na ihe a ọ na-ekwu nwereike mee ka ndị mmadụ gbanye Ipob azụ.

Ọtụtụ ndị ọzọ tinyekwara ọnụ ha na-ekwu uche ha banyere atụmatụ ahụ.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ihe mere m ji akatọ ụfọdụ ndị ọchịchị n'ala Igbo

Oge ụzọ ụdịrị ihe mere na mpụtara ya

N'oge a na-akwado ntuliaka nke e ji ahọpụta aka ga-achị Anambara n'afọ 2017, Kanu sịkwa ka a ghara ịtụ vootu mana ndị mmadụ mechara tụọ vootu.

BBC Igbo jụkwara ihe oche maka atụmatụ na ebumnuche ya agaghị akwụsị ndi mmadụ ịtụ vootu mana ọ gbadosịrị ụkwụ ya n'ala were kwuo na ọ ka bụkwa uche ya.

N'oge ahụ, ọ ka na-ekwu ka a ghara ịtụ vootu nke 2019, mana abalị abụọ ya na BBC Igbo mechara mkparịtaụka, ọ gara n'ihu sị ka ndị otu ya soro mee ntuliaka ahụ.

Mana, dịka ọtụtụ n'ime ha edenyeghi aha iji tozuo iso me ntuliaka, ha atụghị vootu.