Nnamdi Kanu sị na ya amachiela ụgbọala ịgba n'ụzọ n'abalị n'Anambara nakwa Abịa

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu

Onyeisi otu na-achọ nnwereonwe ha site na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu ekwuola na ya amachiela ụgbọala ịgba na steeti Anambara nakwa Abia site elekere iri na otu nke analị ruo elekere ise nke ụtụtụ.

Maazị Kanu si na nke a bụ maka etu ndị ọrụ nchekwa pụrụiche bụ Directorate of Security Services (DSS) si "anwụchị ndi mmadụ na steeti abụọ a.

Kanu sịkwa na ihe ya na ndị otu ya na-akwado ime ihe "ga-eyi ụwa egwu".

Ọ si ka ndị otu ya no Abia "nọkwara na mkwụcha" maka onye uweojii o boro ebubo n'aka ya dị naogbugbu nne ya na nna ya.

Onye uweojii bụ onyeisi ndị uweojii na ogige "Zone 9" nke dị n'Umuahia bụ Etim Ene Okon.

Ọ bụ n'ụbọchị Mọnde bụ ụbọchị nke 19 nke ọnwa Eprelu ka Maazị Okon malitere ọrụ dịka onyeisi zone 9.

Dịka ọ malitere ọrụ, Maazị Okon kwuru na ya ma ebe ọ bịara ọrụ ọfụma.

Maazị Okon bụbu onyeisi ndị uweojii n'Abịa ruo afọ 2020 bụ oge akpoghachiri ya Abuja.

Ugbua ọ bụ ya ka Abia, Ebonyi na Imo dịzị n'aka ya ugbua.

Kanu sị na ya na-enye gọọmentị abalị 14 ka eji wepu Okon n'ọrụ ma mee ya nnyocha . Ọ sị na ya bụrụ na omeghi nke a, ka ndi Ipob "jide ya na ezinaụlọ ha, ka chineke kpọọ ha ọkụ".

N'ikwu okwu maka Okon, Kanu sị na ya dị njikere ịga zara ọnụ ya na Hague.

Ọ sị ndi otu ya: "oge ha ji anwu eruola".

Anabataghị ịtụ vootu n'Anambara na 2021 - Kanu

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ihe mere m ji akatọ ụfọdụ ndị ọchịchị n'ala Igbo

Maazị Kanu sị na ya agaghị anabata ka emee ntuliaka n'Anambra steeti n'afọ 2021.

Steeti ahụ na-adị njikere ime ntuliaka a ga-eje họpụta onye ga-achị steeti ahụ na Obiano rituo n'afọ a.

Kanu sị na ya na ndị otu ya agaghị ekwe ka emee ntuliaka n'Anambra maọbụ ịchụnta vootu.

Ọ sị ka ha mebie ihe niile e ji akwado ntuliaka dị na steeti ahụ.

Nke abụghị mbụ Kanu akwadoghi ntuliaka n'Anambra.

N'afọ 2017, Ipob ekweghi isonye na ntuliaka eji họpụta aka ga-achi Anambra steeti.

N'afọ 2019, ọ bụ ka ọ fọrọ ụbọchị ole ma ole ka emee ntuliaka iji họpụta onye ga-achị Naịjirịa ka Kanu si ka ndị otu ya sonye na ntuliaka.

N'oge ahụ, ọ sị na ya na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị enwetela "nkwekọrịta".

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu anọghị na nga na Singapore - Aloy Ejimakor

Gọọmentị Anambra steeti sị na onweghi ihe ha nwereike ikwu maka ihe a Kanu kwuru oge BBC Igbo jụrụ ha ese.