Anambra Elections: Ihe Fr. Mbaka kwuru maka 'onye Chineke họpụtara' ga-emeri na ntulika Gọvanọ Anambra

Ebe foto si, AMEN/Facebook
Ụkọchukwu ụka Katọlik a ma ama bụ Ejike Mbaka ekwuola na ọ bụ otu onye ka o nyere ikike ọchịchị n'ime ndị niile na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.
O kwukwara na Chinke enyebeghi ya ohere ị ga n'ihu kpọpụta aha onye ahụ.
Nke a bụ ihe o kwuru n'ekpere ọ na-eme n'ụlọụka ya bụ Adoration Ministri n'Enugwu ma kwuo na ọ bụ onye ọbụla Chineke họpụtara ga-emeri ntuliaka ahụ.
O kwuru na o nweghi onye ya n'onwe ya na-akwado imeri ya bụ ntuliaka ahụ ma kwuo na o kperela ha ekpere.
Ọ kpọpụtara aha Andy Uba, Godwin Maduka nakwa Chukwuma Soludo ma kwuo na ha niile nụ enyi ụka ya.
Mbaka kpọrọ Anambra oke obodo ma kpọpụta aha ndị ama ama si Anambra steeti ma kwukwa "anyị gụwa ihe ọma o meere Anambra chi ga-eji chi ga-abọ".
Cheta na ọ gwaburu ndị Anambra ha mara na o nweghi onye ọ kwụ n'azụ na ntuliaka Anambra steeti na-abịa.
O kwuru nke site n'ozi o ziri na ngwụcha mmemme 'Bazaar' nke ụlọụka ya mere.
"Ọtụtụ n'ime ndị na-azọ ọkwa abịakwutela m, ọrụ m bụ igozi gi ma kpee ka uche chukwu mee na ndụ gị" ka o kwuru.
"Chineke agwabeghi m onye ga-abụ Gọvanọ n'Anambra" ka o kwukwara.
Ihe ọzọ si ya n'ọnụ pụta bụ na ọ nụrụ maka nkata ịgbu ya nke na-efegharị mana ụjọ anaghị atụ ya.
O kwuru na o nweghi onye pụrụ igbu ya.
N'ikpeazụ o kwuru na ekpere ya bụ ka Anambra họpụta onye ọma ga-achị ha n'ihi na ihe ọbụla metụtara Anambra steeti metụtara ala Igbo niile.
Gbasara Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
O dọọrọ gọomentị etiti aka na ntị ka ejiri nwayọ hazie okwu gbasara Nnamdi Kanu.
O ji ọkpụkpụ ma atụ sị na Kanu dị ka ọkpụkpụ a ga-eji nwayọ wepụ ka ọ ghara ịmerụ ime ahụ ahụ.
O kwuru ka ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ niile gbakọọ aka mara etu a ga-esi me ihe dị n'okwu Nnamdi Kanu.
Ihe ọzọ Mbaka kwuru bụ ka ndị Naịjirịa debe iwu kpuchiri mba ụwa niile n'agwa ọbụla ha na-akpasa Kanu.











