Atiku bụ Bureau de Change - Mbaka

Atiku ji ọkọlọtọ pati PDP azọ ọkwa onyeisiala afọ 2019

Ebe foto si, Getty Images

Ụkọchukwu Ejike Mbaka kpọrọ Atiku 'Bureau de change' n'ihi ụdị ego igwe akụkọ kwuru banyere ndị mmadụ n'aka n'oge PDP mere ntuliaka imeụlọ ha na Portharcourt.

Mbaka kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ozi chukwu n'ụlọụka ya bụ 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu.

N'okwu ya "Ọ bụrụ na Buhari bụ 'change' Atiku n'onwe ya bụ 'Bureau de change'.

O kwuru na Atiku ga-emeri Buhari na ntuliaka afọ 2019, kama ka ọ ghara isoro nzọm ụkwụ Buhari.

Buhari na Mbaka

Ebe foto si, MBuhari Twitter

Nkọwa foto, Fr.Mbaka zutere Buhari n'afọ 2016

Onye ụkọchukwu a rịọrọ ka uche Chineke mezuo n'ebe Naịjirịa nọ.

O kwuru na Buhari were ohere ọma Chineke nyere ya tufuo n'efu site n'ịkpa oke agbụrụ n'inye ndị Naịjirịa ọrụ.

Cheta na Mbaka n'afọ 2015 dọnyere Buhari ukwu ebe o kwuru na ọ ga-emeri na ntuliaka nke afọ ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị