E nyere Peter Obi na Abaribe ọsọ n'achụmnta Valentine Ozigbo n'Ọnịcha?

Ebe foto si, Valentine Ozigbo/Facebook
Ọnụ na-ekwuru Senetọ Enyinnaya Abaribe bụ Uche Awom ekwuọla na ọ bụghị eziokwu na a chụrụ aka chịbụrụ Anambara steeti bụ Peter Obi na Senetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite Abia South n'ụlọomeiwu Ukwu Naijiria ọsọ n'Ọnịcha ebe ha gara achụmta vootu Valentine Ozigbo na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambara n'aha PDP.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na ndị ntorobịa ji egwu na-egosi nkwado ha nye Nnamdi Kanu chụọ Peter Obi na Abaribe ọsọ n'Ọgbọ Ọgwụ dị n'ahịa 'Head Bridge',Ọnịcha ụbọchị Wenezde.

Ebe foto si, Valentine Ozigbo Facebook
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe ọtụtụ ndị ntorobia malitere ịgụ egwu Nnamdi Kanu nke ha jiri gbọchie Peter Obi ọnụ dịka ya na Abaribe welichara Ozigbo aka elu.
Mana oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru Abaribe bụ Uche Awom n'ekwentị, o kwuru na ọ bụ okwu ụgha na a chụrụ Abaribe na obi ọsọ.
Awom, onye kwuru na ihe onyonyo ahụ na-efegharị bụ ihe arụrụ arụ nke a ndị iro ndọrọndọrọ ọchịchị sịrị, "Anọghị m ebe ahụ mana ihe m ga-agwa gị bụ na ọ bụghị eziokwu na a chụrụ ha ọsọ."

Ebe foto si, Valentine Ozigbo/Facebook
"Ọ bụrụ na Ipob kwara ha emo, ihe ị ga-ajụ bụ ka ha kwachara emo, ha enyere ha ohere ikwu okwu?"
Cheta na nsonso a, akụkọ na a chụrụ Ifeanyị Uba ọsọ n'Ahịa Alaba International dị na Legọs ebe ọ gara achụmnta vootu wuru na soshal midia.
Mana Uba , onye na-azọkwa ọkwa gọvanọ Anambara steeti n'aha otu YPP gwara BBC Igbo na mkparịtaụka na ya bụ akụkọ bụ akụkọ ụgha.












