Asari Dokubo: Ikposa ntuliaka gọvanọ Anambra megidere mbọ inweta Biafra

Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images

Otu 'Defacto Biafra Customary Government' nke Asari Dokubo bụ onye ndu ya, akatọọla ihe ha kpọrọ iji aka ike kwụsị ntuliaka ọkwa gọvanọ a ga-eme n'Anambara steeti n'ọnwa Nọvemba.

N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ Uche Okafor-Mefor binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, otu ahụ kwuru na nke a megidere mbọ a na-agba inweta Biafra.

Otu ahụ sị na mbọ ọbụla ikposa ntuliaka Anambra agaghị enwe isi.

Otu ahụ katọkwara ihe ha kpọrọ ọgbụgbụ a "na-egbusịsị ndị Biafra n'ala Biafra".

Otu De Facto Customary Government of Biafra kwuru na ntuliaka ọkwa gọvanọ ga-aga n'ihu etu iwu Naijiria si hibe ya. Ha kwuru na ndị mmadụ igbahapụ ntuliaka a na ala Biafra agaghi amipụta mkpụrụ ọbụla ma kwu kwa na ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya, gọọmentị ga-etinye onyeisi na steetị ahụ.

Ha rụrụ aka n'okwu ndị mmadụ na-ekwu maka ịgbahapụ ntuliaka a, kwuo na ha anabataghị ya.

Otu a katọrọ ogbugbu a na-egbu ndị mmadụ n'ala Biafra, kwuo na nke a megidere iwu ala Naijiria nakwa nke otu jikọtara mba ụwa niile.

Ohaneze Ndigbo: Ihe mere anyị ji arịọ Ipob ka ha hapụ ka e mee ntụliaka Anambra

Ndị Okenye Igbo na ndị na-eti mkpu Biafra

Ebe foto si, BBC/Getty

Otu Ohaneze Ndigbo arịọla otu Ipob ka ha kagbuo atụmatụ nọrọ n'ụlọ otu izu ha na-akwado ime n'Ọwụwa Anyanwụ iji nye ohere ka e mee ntuliaka gọvanọ Anambra steeti.

Na nsonso a Ipob kporo oku nọrọ n'ụlọ malite n'abalị ise nke ọnwa Novemba rue abalị iri nke ọnwa Novemba, afọ 2021 ma ọ bụrụ na gọọmentị atọhapụghị onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Mana Ohaneze site n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnịa binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenezde, abalị 26 nke ọnwa Oktoba, afọ 2021, Ohanaeze Ndigbo sị na " Ikposa ntuliaka Anambara steeti ga-eweghachị Igbo azụ n'ebe ọ dị ugbua."

"N'ụzọ ọbụla Anambara bụ isi ahụrụ kwaba okpu n 'Ọwụwa Anyanwụ n'ịkpali ịgba mbọ e jiri mara Igbo, dịka ndị okenye anyị agahị agba nkịtị ewu anwụọ n'ọgbụrị."

Ọhaneze kwakwara arịrị na ọ bụrụ na nọrọ n'ụlọ ahụ ga-emetụta akwamozu Victoria Agụiyi Ironsi, nwunye Agụiyi Ironsi bụ onye a ga-akwa n'Ụmụahịa n'abalị ise nke ọnwa Novemba.

"A ma ihe Ọchịagha JTU Aguiyi Ironsi bụrụ nye ndị Igbo. Anyị ji mkpụrụ obi ya ụgwọ."

Dịka ha na-arịọ otu Ipob arịrịọ, otu Ohaneze ji ohere ahụ kpọọ ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ka ha kpọọ nzụkọ gbatagbata ndị ọnụ na-eru n'okwu na ndị ndu ndị ntọrn=obịa iji chọọ ụzọ a ga-esi bie okwu ihe na-eme n'Ala Igbo ugbua na etu aka ga-esi gba mbọ tọhapụ Nnamdi Kanu.

Ohaneze rụtụrụ aka na ọ bụ n'ihi oke ndịiche dị n'etiti ndị na-achị achị na ndị ntorobia soro bute nsogbu, sị na ọ dị mkpa ka e me ka ndị ntọrọbia hụta na ọ bụ ka ọ ga-esi dịị ha mma ka a na-achọ.

Otu ahụ gara n'ihu kwuo na ha kwụnyere otu ọbụla ji uche na amamihe na-eti mkpu maka etu e si akpachapụ ndị Igbo na Naijiria.

Ohanaeze Ndigbo gara n'ihu sị na ha kweneye na ịkparịta ụka ha na otu ndị ọzọ ọnọdụ Naijiria na-ewute dịka otu 'Southern and Middle Belt Leadership Forum nke Chief Edwin K Clarke bụ onye ndu ha.

Tọhapụnụ Nnamdi maọbụ anyị akpọchie mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile

Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) ekwuola na ha ga-akpọchi mpaghara ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile ruo otu izuụka ma ọ bụrụ na atọhapụghị onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

Emma Powerful, ọnụ na-ekwuru otu a kwuru nke a n'ụbọchị Satọde.

Powerful kwuru na ha agaghịzi agbachi nkịtị ka onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu nọrọ n'ụlọ mkpọrọ na-enweghị ihe ọbụla o mere.

Okwu a Emma Powerful kwuru na-abịa dịka Abubakar malami bụ ọkaiwu gọọmentị etiti wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Fraịde ebe ọ nọrọ bo Nnamdi Kanu na ndị IPOB ọtụtụ ebubo.

Powerful kwuru sị: "IPOB ga-akpọchi mpaghara Biafra niile malite n'ụbọchị ise ruo ụbọchị iri nke ọnwa Nọvemba."

"Naanị n'ụbọchị ụka bụ abalị asaa nke Nọvemba ka a ga-enwe mkpagharị ka ndị mmadụ ga kpeere Chineke."

"Anyị ga-eme nke a ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atọhapụghị onyeisi anyị bụ Nnamdi Kanu tupu abalị anọ nke ọnwa Nọvemba."

"A ga-atọhapụrịrị onye ndu anyị n'ihi na onweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere megidere iwu."

Aha onyonyo, Ọ bụrụ na Gọọmentị akpụtaghị Nnamdi Kanu n'ụlọikpe echi ... - Ifeanyi Ejiofor

Emma Powerful kwuru na ha ghọtara na mkpọchi obodo a ga-ebutere ndị mmadụ nhịahụ, "mana anyị ga-eme ya maka ọdị mma nke ndị Biafra."

O kwuru na ha bụ ndị IPOB chọpụtara na gọọmentị etiti achọghị ikpe Nnamdi Kanu ikpe n'ụzọ ziri ezi, "kama ha chọrọ imenye ya ihere ma hapụ ya ka ọ nọrọ n'ụlọmkpọrọ ndị DSS taa nchara".

"Anyị hụrụ etu e si gbochie ndị ọkaiwu, ndị ntaakụkọ na ndị okenye ndị Igbo ịbata n'ime ụlọikpe ebe a nọrọ kpee Nnamdi kanu ikpe."

"Anyị agaghị anabata ụdị ihe a ọzọ. Anya agaghị ekwe ka e kpee onyeisi anyị ikpe na nzuzo maobụ ka e were ụzọ sharia kpee ya ikpe n'ụdị ọbụla."