Tiwa savage viral video: Ihe atọ onyonyo aramara nwere ike ibutere gị ma ọ gbapuo

Tiwa Savage

Ebe foto si, Instagram/Tiwa Savage

Kemgbe ihe onyonyo aramara a na-arụ aka na ọ bụ Tiwa Savage nọ na ya gbara na soshal midia, ọtụtụ ndị mmadụ kpụ ya n'ọnụ.

Ụfọdụ na-akatọ nwa ada otiegwu a, ebe ndị ọzọ na-enye ya nkwado nakwa nkasịobi.

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ bụ na ndị hụrụ onyonyo ahụ na-ekwu na ha ejighị n'aka na nwata nwaanyị nọ na ya bụ onyonyo bụ Tiwa Savage n'eziokwu.

Onyonyo aramara mmadụ ịgbapu n'ịntaneetị nwereike ibutere onye ahụ ihe ọghọm ụfọdụ.

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịhazị ka ọha sị ahụta mmadụ kwụrụ n'ụdị ihe na-apụ onye o metụtara nnukwu ihe n'ahụ.

1. Ọ ga-efu gị ezi aha

Ọtụtụ ndị okenye na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị, mana ọ na abụ ihe ịsọ oyi na ntị ma ihe e mere n'ime ụlọ gbaa n'ama.

Onye nke ya gbara n'iro, dịka nke e boro Tiwa Savage, ga-ebido zawa ajọ aha.

Dịka Joe Anatume ọkachamara n'ihe metụtara nhazi etu ọha sị ahụ mmadụ (Public Relations expert) siri kọwaa, "Ọ ga-eme ka ndị na-elebu gị nnukwu anya malite na-eletu gị anya."

Anatune bụ onyeisi ụlọọrụ 'B3 Communication' kwuru na n'ihi ihe mere Tiwa Savage, "ndị na-eso ya ga-amailte were anya ọzọ na-ahụta ya."

2. Ọ ga-efu gi ego

Naira

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụdịrị akụkọ a nwereike ịkpọchiri mmadụ ụzọ ego si abata ya n'akpa

Ọrụ, ego nakwa ohere ọma ndị ọzọ gaara abịara gị nwere ike ịgba ọsọ n'ebe ị nọ.

Anatune kwuru na agbanyeghị na Tiwa savage abụghị nwanyị eji akụkọ ọjọọ mara, akụkọ a na-efegharị maka ya nwereike ịnapụ ya ego.

"Dịka onye na-eti egwu, ọ bụrụ na m chọburu ime ya ihu e ji ere ngwaahịa m, agaghị m emekwa ya ọzọ," Anatune kwuru.

3. O nwere ike ifu gi ihe ọma iji n'aka

Nwoke na nwaanyị nọ n'elu akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụdị ihe a nwere ike ime ka alụmdinanwunye gbasaa

Ụdị akụkọ a nwereike ịkụrụ mmadụ ahịa na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.

Ọ bụrụ nwoke na-alụ nwaanyị maọbụ nwaanyị nọ na di, ụdị akụkọ a nwereike ibute ọgbaghara nwereke ịkụsa alumdinanwunye ha.

N'otu aka ahụ, onye na-arụ ọrụ, nwere ike ọ napụ ya ọrụ ya.

Anatune kwuru na ụdị akụkọ nwere ike ime ka ụfọdụ ụlọọrụ ji Tiwa Savage meere ihu ha ji ere ahịa sị na ha achọghịkwa ya ọzọ.

Mana e tere ogiri, e tere ụgba, o kwuru na ọ gaghị ete aka, ya bụ ihe ewuchaa dịka nnukwu akụkọ ọzọ ga-adapụta na Naijiria.

Lee ihe ndị a ma ama kwuru gbasara onyonyo aramara a sị na Tiwa Savage nọ na ya

Apama Nolly/Tiwa Savage/Mercy Aigbe

Ebe foto si, Instagram/Apama Nolly/Tiwa Savage/Mercy Aigbe

Ọtụtụ ndị a ma ama nke bekee na-akpọ 'celebrity' apụtala ịkwado otu n'ime ha bụ Tiwa Savage dịka aha ya na-ewu ebe niile gbasara onyonyo aramara nke e kwuru na ọ nọ n'ime ya.

Ndị ahụ gụnyere Daddy Freeze bụ onye ntaakụkọ Redio a ma ama; Dike Osinachi onye e ji Apama Nolly mara, Mercy Aigbe na-eme ejije Nollywood, na ndị ọzọ.

Apama Nolly gwara Tiwa Savage ka o jisie obi ya ike maka na ikuku a na-eku ugbua ga-akwụsị.

Apamanolly

Ebe foto si, Instagram Screengrab

N'okwu nke ya, Mercy Aigbe kwuru na Tiwa Savage ka bụkwa ezenwaanyị ruo echi, n'agbanyeghị asịrị na-efegharị.

O kwuru na onweghị onye kacha dị nsọ n'ụwa, ma kwukwaa na ihere ga-emegbu ndị na-emetọ aha mmadụ.

Mercy Aigbe

Ebe foto si, Instagram Screengrab

Daddy Freeze, n'okwu nke ya, kpọkuru ndị nkwado Tiwa Savage ka ha gosi ya nnukwu nkwado ugbua.

O kwuru na onweghị onye abụghị onye mmehie, mana ihe dị mkpa bụ ka onye dara ada kulie.

Ihe Tiwa saara ndị ji ihe onyonyo ọtọ ya amaja ya

Tiwa Savage

Ebe foto si, Tiwa Savage/Instagram

Ihe otiegwu a ma ama bụ Tiwa Savage na-atụ uche na ọ ga-eme dịka o meela.

Ịntanet na Naijiria enwurula ọkụ dịka ihe onyonyo ọtọ nke ụfọdụ na-ebo ebubo na ọ bụ nke otiegwu Tiwa Savage na-efegharị na soshal midia kemgbe ụbọchị Mọnde.

Na ịzụụka gara aga, Tiwa gbara ama na otu mkparịtaụka ya na ụlọọrụ redio mba Amerrịka a kpọrọ 'Power 105.1 na o nwere onye ji ihe onyonyo ọtọ ya amaja ya, iji napụ ya akatamkpo ego.

Ọ kọwara na enyi ya nwoke amaghị ama tinye ya bụ ihe onyonyo na akara Snapchat mana o hichapụrụ ya ngwa ngwa ọ chọpụtara na ya dahiere.

Mana tupu o hicha ya, ya bụ ihe onyonyo danyere n'aka ndị na-achọ ka ọ kwụọ ha nnukwu ego tupu ha ehichapụ ya.

" Agaghị m akpọ ya ihe onyonyo mmekọrịta mana ọ bụ ihe onyonyo mụ na ọdịmnobi."

"Agaghị m enye onye ọbụla ohere iji m kpaa ego maka ihe abụghị nsọ."

Abụ m onye na-ekopu ekopu, ọ masị m e jiri m aka m wepụta ya bụ ihe onyonyo."

Mana nwaada ahụ onye tipụtara egwu ọhụru ọ kpọrọ "Sombeody's Son" sị na ya agaghị eme nke a.

Ọ gara n'ihu rịọ ndị na-eso ya mgbaghara maka ihe onyonyo ahụ.

Mana dịka o kwuchara nke ahụ, o mechara tuo ọnụ sị na ya akụọla ndị chọrọ iji ya kpa ego ahịa site na ịgwa ụwa ihe mere.

Ọ sịrị, "Obi adịghị gị mma etu m siri nara gị akụkọ ị chọrọ ji memila m kọọ, etu m si jiri akụkọ ịchọrọ iji menye m ihere kpaa ọchị n'ọgbọ."

Tiwa Savage reply her blackmailer

Ebe foto si, TIWA SAVAGE INSTAGRAM

Mana ọ dịzị ka okwu ahụ were ndị na-achụ ya iwe nke mere ka ihe onyonyo ahụ ụfọdụ na-ebo na ọ bụ nke ya gbaa n'ịntanet.

Kemgbe nke a mere, ọtụtụ ụmụ Naijiria kpụzị nwaada ahụ n'ọnụ nke mere ka aha ya bụrụ ihe kachasị ewu na soshal midia taa bụ abalị 19 nke ọnwa Oktoba afọ 2021.

Ụfọdụ na-akatọ ya, ebe ụfọdụ na-emetara ya ebere.

N'aka nke ọzọ, ụfọdụ na-ekwu na ihe onyonyo ahụ abụghị nke Tiwa, ebe ụfọdụ na-ekwu na ya bụ akụkọ bụ akụkọ na Mike Ejeagha o ji ere egwu ya pụtara ọhụrụ.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ etu ahụ ka akụkọ siri so egwu o tipụtaburu ọ kpọrọ 'Fever' nke wuru ewu dịka akụkọ na Wizkid tiri ya aka n'ike wuru na soshal midia oge ọ pụtara.

Ihe ise Seyi Shay mere na-agbawa Tiwa Savage obi ha ji maka ya kọọ ọnụ

Tiwa Savage na Seyi Shay

Ebe foto si, Tiwa Savage/ Seyi Shay/Instagram

Na otiegwu ụmụnwaanyị Naijiria abụọ a ma ama bụ Tiwa Savage na Seyi Shay nke ezi aha ya bụ Deborah Oluwaseyi Joshua kọrọ ọnụ n'ọha abụghịzị akụkọ ọhụrụ.

Ha abụọ ji ogbo na ncha saa onwe ha ahụ wuru ewu na Soshal midia ụbọchị Tuzde dịka ha abụọ zutere onwe ha na mberede n'ọdọ ebe a na-eme isi dị na Lekki, Legọs.

Nke bụ akụkọ bụ kedụ ihe Seyi mere meere Tiwa jiri wụọ ya n'ala na-echeghị onye nwụrụ ụzụ akwa ya na-atụ oge o kelere ya?

Cheta na n'ihe onyonyo ahụ fegharịrị, Tiwa gwara Seyi dịka ọ bịara ikele ya sị, "Jide ekele gị, echela na ị ga-eji obi ọjọọ gị bịa ikele m.

"Echezọbeghị m ihe i kwuru oge gị na Victoria Kimani tipụtara egwu afọ ole na ole gara aga."

" I chere na m echezọzọla mkparịtaụka i nwere na-ekwu kọtọkọta maka m? "

"Gị na nkịta ahụ tiri egwu, ga mee mkparịtaụka na-ekwụ arụ n'ọnụ maka m, o nweghị ihe m saara."

"Edinanụghị m nwoke gị. Anapụbeghị m gị ọrụ. Aganubeghị n'ụlọọrụ redio akatọ gị."

Dịka akụkọ ihe ahụ mere n'ụtụtụ Tuzde na-afịọ, BBC Igbo jụrụ ndị ntaakụkọ ihe gbasara akụkọ ịkpa obiaṅụrị were anya ihe ha ma maka akụkọ mmadụ abụọ ahụ.

Anthony Abraham, kwuru na ekworo ịdị na-etiti ndị enwe abụọ a ma ama abụghị ihe ọhụrụ maka ihe ọnụ ahụ ha kọrọ na ihe sị n'ọnụ ha abụọ pụta gosiri na ọ bụghị egwu na-esere ha".

Abraham, onye bụ onye ntaakụkọ SilverBird kwuru na ya bụ ihe ka emetụta ụlọọrụ ji ihu mndị otiegwu abụọ ahụ ere ahịa.

Lee ụfọdụ ihe ha rụtụrụ aka bụ ebe mmiri si nbanye opi ụgbọgụrụ:

  • N'afọ 2019 Seyi Shay na Victoria Kimani gụrụ egwu ikpe megide ya n'egwu Kizz Daniel e tigharịrị n'egwu 'F**k you Challenge'.
Tiwa Savage na Seyi Shay

Ebe foto si, Tiwa Savage /Sheyi Shay/Instagram

N'egwu ahụ nke Ọ kpọghị mmadụ aha, Seyi kwuru "onyem kpọrọ nwanne nwaanyị na -achọ ịnapụ onye m hụrụ na-anya."

N'aka nke ọzọ, Victoria Vimani kwuru maka , " Nwa ada na-akpọ onwe ya nwada ana m ahnụ ihe mana ọ bụ nne ana ma nụ ihe."

  • N'afọ 2016, a jụrụ Seyi Shay maka Tiwa Savage , "Amaghị m onye ọ bụ bụ ihe ọ sara" na agbanyeghị na ha abụọ na-adịbu na mma.

Abraham kwuru na o teela mmadụ abụọ ahụ nwere esemokwu kama ha na-ekpu ya aka.

"Oge m jụrụ Seyi Shay ọnọdụ mmekọrịta ya na Tiwa Savage, ọ gwara m na ha enweghị nsogbu ọbụla. "Ọ bụ nnukwu nwanne m."

"Ihe mere bụ na ụfọdụ mgbe ọ bụ ndị na-eso onye ama ama na ndị ntaakụkọ na-akusu esemokwu n'etiti ndị na-ewu ewu."

Ihe ise Seyi Shay sara maka ebubo Tiwa boro ya

Seyi Shay sara Tiwa Savage sị na ihe o merela ya akarịka mana ya gbachiri nkịtị.

Na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Pulse nwere n'ekwentị, o kwuru na nkịtị ya gbara abụghị na ikpe ebubo niile Tiwa Savage boro ya bụ eziokwu.

Kama na "achọghị m ịsa ya n'ihi na achọrọ m ka ihe ọ na-ekwu doo onye ọbụla anya, ọ bụghị na m amaghị ihe m ga-asa ya."

2. Seyi Shay kwuru na ọ bụ ka ọ gachara ya elekere iri abụọ ya jiri batacha n'ụlọ ndozi isi ahụ, kelee Tiwa Savage ka ọ laghachiri bịa kọwa ya ọnụ.

3. Seyi Shay boro Tiwa Savage ebubo na ọ bụ ya na odeegwu Ceeza Milli deere egwu 'Lova Lova' bụ egwu Tiwa Savage tiri wuru ewu mana ha tiputara ya na agwaghị ya agwa ma ya fodu ikwupụta na aka ya so dị n'egwu ahụ.

"Ihe a chọrọ ịgba m ara ka m hụrụ ya. Akpọrọ m ya n'ekwentị sị ya, Tiwa, egwu 'Mr Lova Lova' ị nwaka mana achọrọ m ịgwa gị na eso m dee egwu ahụ."

4. Seyi bokwara Tiwa ebubo ịba otu otiegwu ya na ya tikọrọ egwu ọgụ maka iso ya bụ Seyi tie egwu.

5. Seyi bokwara ebubo na Tiwa kwuburu na ọ ga-akpụpụ otu ụlọọrụ ụlọikpe ji ihu ya bụ Tiwa ere ahịa maka itinye ihu ya bụ Seyi na ihu ha ji ere ahịa.

Onye bụ Tiwa Savage?

Tiwa Savage

Ebe foto si, Tiwa Savage/Instagram

Tiwatope Savage, a ma dịka Tiwa Savage bụ otiegwu, ode egwu nakwa onye ejije

A mụrụ ya na Legọs n'abalị 5 nke ọnwa Febuwarị, afọ 1980 mana ọ lara Lọndọn ka ọ dị afọ iri na otu.

Ọ bụ ebe ahụ ọ gara ịgụ sekọndịrị nakwa mahadum ma malitere tiwe egwu.

Egwu ndị o tiri gụnyere "Kele Kele Love".

Ọ nọrọ n'okpuru Mavin Records nke Don Jazzy nwe tupu ọ hapụ ha afọ ole na ole gara aga.

E jirila ihu Tiwa Savage ree ahịa dara ụda dịka Pepsi,Maggị, Forte Oil na MTN, Pampers na ahịa ndị ọzọ.

Ọ lụrụ Tunji Balogun a ma dịka 'Tee Blizz' bụ onye na-achịkọta ya n'afọ 2013, a mụtara otu nwaa mecha see okwu gbasaa.

Onye bụ Seyi Shay?

Seyi Shay

Ebe foto si, Seyi Shay/Instagram

Ezi aha ya bụ Oluwaseyi Deborah Joshua.

Ọ bụ onye Naijira a mụrụ na Lọndọn n'abalị 21 nke ọnwa Disemba afọ 1985.

Ọ na-eti egwu, na-ede ede ma na-emekwa ihe ejije.

Efere egwu ndị o tipụtara gụnyere "Lara & The Beat", "Seyi or Shay", "Summer Vibe" nakwa "Electric Package EP".

Ọ bụrụ na ị maghị egwu ya, cheta "No Lele."

Onye bụ Victoria Kimani?

Ọ bụ onye Kenya a mụrụ n'Amerịka n'abalị 28 nke ọnwa Julai,afọ 1985.

Ọ na-eti egwu, na-ede egwu ma na-eme ejije.

Ọ nọpụ n'okpuru ụlọ egwu "Chocolate City' nke Naijiria.

O nwetaala nzere n'Afrịka maka egwu ya.