Peruzzi: Ihe mere na ị gaghị echefu izuụka a ọsịsọ

Ndị so mee ka izuụka a buru egwu eji

Ebe foto si, BBC/peruzzi_vibes/barackobama

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Izuụka a kpụ ọkụ n'ọnụ n'ihi na ọtụtụ ihe mere n'ime ya abụghị ihe ị ga-echefu ọsịsọ.

Ka anyị bido na nke metutara ndị ọchịchị.

Ihedioha tetara ura dịka Gọvanọ ma labaa ka . . .

Ụlọikpe kachasị kpebiri ikpe maka ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Imo Steeti.

Ha kwuru ka e were ọso were ije chụpụ Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo steeti ma tinye Hope Uzọdịnma.

Ihe mere ka ikpe a pụọ iche bụ na ụkọchukwu katọlik 'Father Mbaka' buru amụmu wee kwuo na 'Hope' na-abịa n'Imo steeti.

Mana ka nke ahụ mechara, Emeka Ihedioha, rịọrọ ndị Imo ka ha kwado ọchịchị Uzodinma.

Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede Wenezde.

Asịrị maka ọnwụ Bobrisky

Bobrisky

Ebe foto si, @bobrisky222/Instagram

Nkọwa foto, Akụkọ asị na Bobrisky anwụọla wuru ewu

Okuneye Idris onye e ji Bobrisky mara wuru ewu n'izuụka a dịka akụko na ọ nwụru na ihe mberede okporo ụzu bidoro wuwe.

Kama Idris gara na 'Instagram' ya wee bụọ ndị niile buru akụkụ asị ahụ ọnụ.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

Davido na Peruzzi

Oti Egwu bụ Peruzzi

Ebe foto si, @peruzzi_vibes/Instagram

Nkọwa foto, Oti egwu Perruzi

Onye mmepụta egwu aha ya bụ King Patrick ebola oti egwu bụ Peruzzi ebubo na omezughị nkwekọrịta ha nwere mgbe ọ weere ya dịka onye oti egwu n'ụlọọrụ ya bụ 'Golden Boy Entertainment'.

Patrick kwuru na ọ were Peruzzi n'ọrụ dịka oti egwu, nye ya ụlọ obibi ma meere ya ihe onyonyo atọ na ihe ndị ọzọ.

Ọ kọwara na Peruzzi hapụrụ nkwekọrịta ha ma gaa tinye aka na akwụkwọ n'ụlọọrụ 'DMW' nke oti egwu Davido bụ onyeisi ha.

Nke mere ka a kpụrụ mmadu ato a n'onu n'ịzụuka a.

Dịka ọ dị ugbua, Patrick si na ikpe ha dị n'ụlo ikpe.

Ncheta agha Biafra

Dim Odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, Odumegwu Ojukwu bụ Onyeisi Biafra oge agha.

"Ọzọ emena" bụ ihe ndị mmadụ na-ekwu dịka e mere emume ncheta afọ iri ise agha Biafra biri n'ụbọchi iri na ise nke ọnwa Jenuarị 2020.

Aha onyonyo, 'Anyị chere na anyị bịara ịnabata ndị enyi, anyị amaghị na ọ bụ ọnwụ anyị ka anyị na-agakwu'

Ọtụtụ akụkọ ihe mere oge ahu butere ọtụtụ akwa arịri na mwute.

Anyi ka na-asị kwa 'Ozọ Emela'. Gaa gụọ ya n'uju ebe a.

Ọnwụ Rocky Johnson nna Dwayne Johnson "The Rock"

Ọnye mgba Dwayne Johnson

Ebe foto si, Alamy

Nkọwa foto, Nna ya nwụru anwụ bụ Rocky Johnson kuziri Dwayne Johnson etu esi agba mgba

Dwayne Johnson 'The Rock' onye e ji ịgba mgba na ime ihe onyonyo mara na-eru uju maka ọnwụ nna ya bụ Rocky Johnson.

Rocky Johnson bụ onye mgba a ma ama n'oge gboo, ma bụrụ kwa oneyisiojii mbụ tuuru ugo dịka 'Tag-Team Champion' ya na 'Tony Atlas.

A mụrụ ya n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Ọgụst n'afọ 1944.

Nwoke kpụrụisi na-aruzi igwe ọkụ (Generator)

Lee ka Emeka Abugu si arụziri ndị mmadụ ụgbọala, ọgba tụmtum, igwe na-enye ọkụ latrik nakwa taya mebiri emebi na-agbanyeghị na o kpuru isi.

Aha onyonyo, Blind Mechanic: Lee nwoke kpuru isi na-arụ 'Mechanic'

Barack Obama na nwunye ya Mitchel Obama

Onye chịbụru dịka onyeisiala mba Amerịka bụ Baraka Obama zitere nwunye ya ozi ekele maka ụbọchi ncheta ọmụmu ya.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ