A dọpụtala nwoke ụlọ dagidere na Legọs.
Akụkọ ndị dị mkpa:

A zọpụtala otu nwoke tọrọ n'ime ụlọelu dara na mpaghara Ago Palace dị na Legọs.
Ọnụ na abụ otitọ bụ ihe jupụtara n'ọnụ ọtụtụ nọ ka a zọpụtara nwoke a nọọrọla n'ọgburu ụlọ dara ada ọtụtụ awa.
Olufemi Damilola Oke-Osayintolu bụ onyeisi ụlọọrụ gbatagbata na Legọs sị: "Ụlọelu dara bụ ụlọ aka na-arụ arụ. Ọdịda ya metụtara otu ụlọ dị ya nso."
Otu onye nọ ebe ihe mere sị na ọ bụ nwanne ya ka ụlọ a dagidere ma rịọbuo ka gọọmenti nyee aka zọpụta ya ka ha mara ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ.

Ebe foto si, Lasema
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ụlọikpe ukwu agbawaala Ifeanyịi Uba aka

Ebe foto si, Ifeanyi Ubah/twitter
Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla ikpụpụ n'akụkụ mkpebi nke ụlọikpe ọzọ kpebiburu nke napụrụ Senetọ Ifeanyi Uba nke otu YPP ọkwa ịnọchite mpaghara 'Anambra South' n'Ụlọomeiwu Ukwu.
Na nkọwa ya, Ifeanyị Uba kwuru na ụlọikpe achụtunghị ya kama o nyere ndị ikpe ahụ metụtara ntuziaka ka ha gawa n'ụlikpe mkpegharị maka ikpe ahụ.
Cheta na ụlọikpe ọzọ napụrụ Uba oche ya n'ihi ebubo iji asambodo NECO adigboroja zọọ ọkwa Senetọ na ntuliaka 2019 ma nyee Inec iwu ka ha were oche ahụ nyefe Obinna Uzoh.
Buhari apụọla gaa London

Ebe foto si, Twitter/BashirAhmad
Onyeisiala Muhammadu Buhari ahapụla Naịjirịa gawa London ebe ọ ga-esonye na ọgbakọ UK-Africa Investment Summit nke ga-amalite n'abalị iri abụọ nke ọnwa Janụwarị a.
Gọvanọ Abịa Steeti bụ Okezie Ikpeazụ nakwa nke Gombe bụ Inuwa Yahaya so Buhari wee mee nje m a.
Umunne atọ na Scotland emeela ihe ịtụnanya

Ebe foto si, Lost Clock Productions
Umunne atọ ndị mba Skọtland edebala aha ha n'akwụkwọ akụkọ dị ka ndị mbụ ji ụgbọ epeepe wee gaa oshimiri Atlantic gburugburu n'oge kacha nta.
Umunne atọ a aha ha bụ Jamie, Ewan na Lachlan Maclean, bụkwa umunne atọ izizi kparala ụdị ike a n'ụwa.
Awaziem na Omeruo

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ Naịjirịa abụọ bụ Kenneth Omeruo na Chigozie Awaziem na-achazị ka ọkụ n'otu egwuregwu ha bụ Leganes nke mba Spen.
Omeruo na Awaziem bụ agada gbachiri ụzọ nke mere na emeribeghị Leganes n'asọmpi isii ikpeazụ ha.
'Inflation' mere na Disemba karịrị nke afọ abụọ gara aga'
Ọnụ ego ahịa rịrị n'ọnwa Disemba bụ ọnwa nke anọ o bidoro ịrị, mere ka ọ bụrụ mgbe kachasị n'ime afọ abụọ ihe a na-eme dịka ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ na Naịjiria si kwuo.
Site na pasentị 11.85 ọ nọbu n'ọnwa Nọvemba, ọ rigoruru na pasentị 11.98.
'A ga na-abịa agba ụzọ ọjọọ anyị nkiri'
Minista mba Uganda na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi, ekwuola na okporoụzọ ndị kacha njọ dị na mba ha nwereike ịbụ ihe ndị si ofesi ga na-abịa agba nkiri.
Henry Okello Oryem mechara kwuo na ọ bụ egwuregwu ka ọ na-egwu, kwuru na ndị si mba ndị ihe na-aga nke ọma nwereike ịhụta ịkwapụta ụgbọala na ndagwurugwu dịka ihe a ga-agba nkiri.
Onye ka Manchester United ga-azụ na Jenụwarị a?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụghị Edison Cavani!
Kepu kepu si n'ọgbọegwuregwu apụta na-akọwa na Manchester United nwereike igote Edison Cavani na-agbara ndị PSG n'afọ a, kama na ọ gaghị abụ n'ọnwa a.
Mmebi 'National Grid' etinyela ndị Naịjirịa n'ọchịchịrị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ebe na Naịjirịa rahụrụ n'isi dịka ọkọtọ banyerwe igwe ọku akpọrọ National Grid na Bekee.
Ndị mmadụ n'ugwu, ọwụwa anyanwụ nakwa ọdịda anyanwụ ahụghị ọkụ ma ncha kemgbe elekere abụo nke ehihe ụnyaahụ kama o nwere ndị na-ekwu na ha enwetela ọkụ n'ụtụtụ a.
Ndị na-ere ọku latrịk na-ekwu na ha no n'ụzọ iweghachite ọku latrịk dika emesiri ihe mebiri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mba ndị na-asụ Bekee si na ha esoghi n'ego Eco

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ ọzọ, Mba ndị mpaghara Ọdịda-Anyanwụ Afrịka na-asụ bekee, nakwa mba Gini, ajụla isonye n'atụmatụ ego ọhụru mba ndị na-asụ French wepụtere akpọrọ Eco.
Ha kwuru na mba dị a kpebiri atụmatụ ego ECO a, na-ajụghị mba ndị ọzọ nọ n'okpuru Ecowas ihe bụ uche obi ha.
Egbuola ndị agbụru Fulani iri na ise na Mali

Ebe foto si, Getty Images
Akụko si mba Mali pụta na-akọwa na ndị oji egbe wakporo otu obodo ndị Fulani ma gbuo mmadụ iri na ise.
Ndị ọrụ nchekwa sị na ha na-eche na ọ bụ ndị nta si agbụrụ Dozo kpara mkpa mkpa a.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, AFP
Reece James bụ onye egwu azụ na Chelsea ebinyela aka n'akwụkwọ ga-eme ka ọ nọrọ n'otu ahụ ruo afọ 2025.
James dị afọ iri abụọ ugbua, kwuru na ndọtị oge ya bụ mmezu ọchịchọ obi ya.
Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:










