Nickelodeon Kids Choice Awards 2021: Ugo Emmanuella achakeela ọzọ

Emmanuella

Ebe foto si, Emmanuella Instagram Page

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ Nickelodeon ewepụtala aha ndị ha ga-etunye ugo 'Nickelodeon Kids Choice Awards(KCA) n'afọ 2021 a.

Ndị aha ha so na ya bụ ndekọ nturugo gunyere Ikorodu Bois, Emmanuella, Elsa Majimbo, Bonang Matheba, Mo Salah, Master KG plus GhettoKids nakwa ndị ọzọ.

Ndọrọndọrọ nturugo a ga-ata akpụ makana ọtụtụ n'ime ndị a bụcha ọkaibe n'elu soshal midia ma nwe ọtụtụ mmadụ ha na-akpalite mmụọ ha na-eso ha n'ebe ahụ.

Onye na-eme ihe nkiri, ọkpachị nakwa onye tuburu ugo a bụ Kenan Thompson, ga-ahazi mmemme ahụ n'ụbọchị March 15, 2021.

Ikorodu Bois

Ebe foto si, Ikorodu Bois Instagram Page

Ndị nso nso ha nwereike itunyere ha vootu na twitter, KidsChoiceAwards.com, nakwa app na-arụ ọrụ n'igwe ipad, iphone nakwa android na mba U.S.

Emmanuella nakwa Ikorodu Bois so na ndị ama ama na Naịjirịa ahọpụtara n'ogo "Favourite African Social Media Star" , ndị ọzọ nọ n'ogo a si mba Kenya.

Aha onyonyo, 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'

Ọ bụghị sọọsọ nne m ka m wurula ụlọ a, nna m so - Ọkpaọchị Emmanuella

Emmanuella Samuel

Ebe foto si, Emmanuella Instagram page

Ọtụtụ ndị ama ama bụ ụkpa ekele ebunye ọkpaọchị Emmanuella dịka ọ rụtara nne ya ụlọ.

Ọkpaọchị a dị afọ iri wepụtara foto ụlọ ọhụrụ ọ rụrụ nne ya n'ụbọchị Fraịde.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

N'okwu ya, ´a rụrụ m nne m ụlọ a , maka ekpere, nkwado, ọ na-enye m. Nne m, a ma m na ịchọrọ ụlọ dị pichọ pịchọ, lee ya ebe a.

"Mana gbaghara m makana m ga-arụcharịrị gị ụlọ ukwu gị n'afọ na-abịanụ."

Nne Emmanuella egbughị oge n'igosi oke ọnụ ya dịka ọ nọ na-elegharị anya n'ụlọ ahụ e doziri nke ọma.

Aha onyonyo, 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'

Lee ihe ise ị na maghị maka Emmanuella

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Nwata nwanyị bụ Emmanuella Samuel bụ onye a ga-eji maatụ ilu sị na 'nwata kwọ aka, o soro okenye rie nri'.

Akụkọ n'ekwụ na ọ banyere ihe onyonyo ndị Walt Disney na Hollywood. Ọ sị na-ịme ihe na-akpa ọchị n'onyonyo we rue ebe ahụ.

Ka ude ya n'ede, anyị ga-ewetara gị ịhe ise ị maghị maka nwata nwanyị a pụrụ ịche.

Amụrụ ya n'afọ 2010

Emmanuella bụ nwa afọ Imo steetị amụrụ n'bodo PortHacourt na Rivers steeti:

Emmanuella

Ebe foto si, @markangelcomedy

Nkọwa foto, O nwere ihe karịrị mmadụ otu nde na-elele ihe onyonyo ya

Ọ ga-agba afọ asatọ n'ọnwa Julai:

N'agbanyeghị afọ ya, o ritela ntuliugo asaa maka ime ihe na-akpa ọchị.

Emanuella n'ime ụgbọ elu

Ebe foto si, @markangelcomedy

Nkọwa foto, Ọ bụ nwata na-emepụta ihe ọchị

Nwanne ya nwoke bụ onye akpaọchị amaama:

Ọ bụ n'elu ọkwa nwanne ya bụ 'Mark Angel Comedy' ka o si bido ịmepụta ịhe ọchị nke ya.

Nwata nwanyị ahụ na nwanne ya nwoke bụ Mark Angel

Ebe foto si, @markangelcomedy

Nkọwa foto, Nwata nwanyị ahụ na nwanne ya nwoke bụ Mark Angel

O ritela ezigbo ego!

Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise.

Emmanuella ebe ọ gara ị nara ntuliugo

Ebe foto si, @OfficialEmanuella

Nkọwa foto, Nwata kwọ aka, o soro okenye rịe nrị

Ihe onyonyo njiri mara ya bụ 'My Real Face'

Lee kwa ya eba:

Skip YouTube post
Hapụ Google YouTube ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of YouTube post

Onyeịsị ụlọ omeiwu Sinetị bụ Bukola Saraki ezịgara la ya ozi ya bịa n'ụlọọrụ Sineti nara nkwanye ugwu.