Oluomachi, Mmesoma, Rikisat blue eyes na ndị ọzọ i nyerela aka ịza mmadụ na-amaghị

Oluomachi,Mmesoma na Emmanuela
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị Igbo si na ọ bụ aka mere azụ o ji gbakọọ, nke pụtara na ọ bụ mmadụ na-eme mmadụ ibe ya nnukwu mmadụ.

A na-ekwu na ọ dị mkpa ka mmadụ ghara ichefu onye nyerela ya aka mgbe ọ nọ na mkpa.

Ndị dịka Oluchi Onweagba Orlandi, onye ji ahụ ya ere uwe (model), nakwa Kanu Nwankwo bụ ọgba bọọlụ, bụcha ndị nọ ha nso tụpụtara alo ka e nye ha ohere nke mere ha ji tiwaa.

Mana ị ma na e nwere ụfọdụ ụmụ naijiria aka gị, eee, gị onwe gị, dị n'ime ha ihe ha bụ taa?

Dịka ị na-eke akụkọ ha na-soshal midia, i so na ndị mere ka ụwa mara ha.

Ndị soshal midia mere mmadụ:

1. Oluomachi Opara

Hope Uzodinma

Ebe foto si, Hope Uzodinma

Nkọwa foto, Oluomachi sozi na ndị gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma kpọrọ 'nwa m'

Akụkọ Oluomachi Opara ka dị ọkụ n'obi ọtụtụ mmadụ ugbua, n'agbanyeghi na ọ malitere naanị ọnwa ole na ole gara aga.

Nwata ahụ bụ onye Ahiazu Mbaise, n'Imo steeti, bụ nwata na-ebugharị ahịa n'Owere iji nyere nne na nna ya aka tupu chi nke ya efoo.

Ọ bụ ihe onyonyo ebe ọ na-ekwe ukwe wuru ewu dịka ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere gị onwe gị kesara onyonyo ebe ọ na-agụ egwu mere ya ka ọ ghọọ ihe ndị nwere agba na-achọ ka akara dị ọkụ.

Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodimma, Sinetọ Stella Oduah, nakwa Ụka Katọlik enyela ya ohere ịgụ akwụkwọ n'efu, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nyere ya na ezinaụlọ ya ohere agụmakwụkwọ n'efu.

Aha onyonyo, Etu m si mụta ịgụ egwu - Oluomachi Opara

2. Mmesoma Madu

Mmesoma Anthony Madu

Mmesoma Anthony Madu bụ nwata nwoke dị afọ 12 na-eri egwu 'ballet' ka ji.

O wuru ewu dịka ihe onyonyo na-egosi ebe ọ na-agba 'ballet' na mmiri ozuzo.

Ka ọ dị ugbua, Mmesoma enwetala ohere ịga mba Amerịka gụọ akwụkwọ maka etu e si agba egwu ballet nke ọma.

Aha onyonyo, Ballet Dance: Etu nwata ji mkpịsị ụkwụ agba egwu ji gbata aka nchawa

3. Risikat nwere 'blue eyes'

Risikat Azeezat na ụmụ ya

Ebe foto si, Instagram/Mofebamuyiwa

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ malitere inyere Risikat Azeezat na ụmụ ya aka dịka akụkọ kwuru na di ya chụpụrụ ha n'ihi ụcha anya ha.

Na nsonso a ka akụkọ pụtara maka ụmụaka abụọ "nna ha jụrụ ha na nne ha" bụ Risikat Azeez n'ihi na anya ha na-acha anụnụ anụnụ (blue).

Ya bụ akụkọ kpọtụrụ akpọtụ na soshal midia n'ihi na mụ na gị kpọrọ ibe anyị 'bịa hụrụ ihe m hụrụ.'

Na-egbughi oge, enyemaka sitere n'aka nwunye gọvanọ Kwara steeti bịara ha dịka ha nwetara ohere agụmakwụ na nleta pụrụ iche.

Ugbua, akụkọ na-ekwu na di nwaanyị ahụ alọghachịla azụ ma rịọ mgbaghara.

4.Ikorodu bois

Ikorodu Bois

I chetere ụmụaka atọ ahụ na-eme ihe onyonyo ebe ha na-eji ụzọ nke ha ejije ihe nkiri (film) ndị a ma ama na sọshal midia?

Ọnwa ole na ole gara aga ka ha ṅomiri ejije ndị Hollywood nke Netflix kwadoro, a kpọrọ "Extraction". Nke a mere ka anya ndị na-ewu ewu na mba Amerịka rute ha.

Ị ma na nsonso a na ụlọọrụ na-egosi ihe ejije n'ọrụ bụ na Neflix ziteere ha akụrụngwa e ji eme onyonyo iji nyere ọrụ ha aka.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nke a bụ dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-ekesa aka ọrụ ha aghara agha na socịal midia.

Chetakwa na a kpọburu ha oku ime ịbịa ngosiputa (movie premiere) ihe nkiri na mba Amerịka mgbe a ga-ewepụta "Extraction 2".

5. Emmanuella

Emanuella n'ime ụgbọ elu

Ebe foto si, @markangelcomedy

Nkọwa foto, Ọ bụ nwata na-emepụta ihe ọchị

Onye ọbụla ma "Mark Angel Comedy" matara nwaada Igbo a na-ewu ebe nile maka ịkpa ọchị onye oke amamiihe.

Ọ bụ oke owuwu ihe onyonyo nke ya na nwanne ya nwoke nwe a na-akpọ Mark Angel Comedy na-ewu, na-eme nwata ahụ ọgaranya, ma mee ya onye ya na ndị ọgaranya na ndị a na-anụ aha ha na-akparịta.

Aha onyonyo, 'Ime ihe ọchị anakwaghị Emmanuella ịgụ akwụkwọ'

Nwata kwọọ aka, o soro ndị okenye rie nri. Emmanuella anatala nturuugo dị iche iche nke gụnyere ugwu onye bụbu onyeisi ụlọmeiwu ukwu bụ Bukola Saraki nyere ya.

Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise, e jikwala ihu ya ree ahịa nke Bekee kpọrọ "advert".

6. Eli Waduba Yusuf

Ihe Kevin Hart kwuru maka Yusuf

Ebe foto si, Uche Akolisa

Eli Waduba Yusuf bụ nwata nwokorobịa ji mkpịsị odee ese ihe osise, mee ya ka ọ dị ka foto.

Ọ bụ ka ndị mmadụ kesara eserese Kevin Hart bụ ọkpaọchị mba Amerịka Yusuf sere, ka ụwa ya gbanwere n'otu ntabianya.

7. Ụmụaka 'Dreamcatchers'

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

I nweghị ego dịka Dangote,Cosharis maọbụ Innoson, mana mana i sorola ndị mere ụmụaka @Dreamcatchersdandị a na-anụ aha ha n'ụwa dum.

@Dreamcatchersda bụ otu abụghị nke gọọmenti, ndị na-akpọkọba ụmụaka enweghị nne na nna na ndị puru nụzọ ọnụ site ịgba na ịkpụ egwu nakwa ihe nka ndị ọzọ.

Ugbua ụmụaka esila na nkerịta a na-eke akụkọ ha na soshal midia nweta ohere ị ga-ala Bekee.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Ha na ndị nnukwu mmadụ na-erịkọ n'otu efere. Ọ bụladị oge 'Naomi Campbell' bịara ala Naijiria, ọ gara zute ụmụaka ahụ.

8. Success Adegor

Success Adegor

Ebe foto si, @itkSuccess

Na ofe ezughị nri ma ya fọdụ nke ị ga-edobe maka echi abụghị na o nweghị ndị iji oge na 'data' gị gbanwee ọnọdụ ụbịam na ahụhụ ha nọbu na ya.

I chetara nwata ahụ wuru ewu na soshal midia maka na a chụrụ ya n'ụlọakwụkwọ maka na ọ kwụghị ụgwọakwụkwọ ya, ya na-atụ arịrị na-asị ka ọ gara akara ya mma na ha pịrara ya ụtarị, hapụ ya ka ya soro ibe ya?

Success Adegor si na nkesa akụkọ ya nke i sonyere wee kesaa na soshal midia nweta ndị gbatara ya ọsọ enyemaka ego, ohere isonye na ihe ejije nakwa ohere agụmakwụkwọ n'efu.

Na-agbanyeghị na Success kwuru na nsonso na na ọtụtụ ndị kwere ya na ezinaụlọ ya nkwa e mezughị ya mana nke bụ eziokwu bụ na ọnọdụ ụbịam ha nobu na ya agbanweela.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: