Enya Egbe: Etu nwaokorobịa na-agụ 'medicine'si gbapụ ọsọ oge ọ hụrụ ozu enyi ya

Ebe foto si, Enya Egbe
Enya Egbe na-agụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mahadum ji ọsọ gbapụta na klass ka ọ hụchara ozu a sị ya were mụọ ọrụ.

Nwa amadị a gbara afọ 26 chetara na afọ asaa gaara aga, ụbọchị Tụzde na Mahadum 'University of Calabar' oge ya na ụmụakwụkwọ ndị ọzọ gbara okporo a tụkwasara ozu na ya okirikiri.
ka Nkeji ole na ole gara, Egbe gbapụrụ ọsọ na-eti mkpu.
Ozu ahụ nke ya na ndị otu ya ji eme ọmụmụ bụ ozu Divine enyi ya nwoke ya na ya dịrịla mma afọ asaa.
Egbe sịrị, "Anyị na-agakọ agbamegwu, mgbọegbe abụọ dị ya n'akụkụ akaekpe obi ya"
Oyifo Ana so na ndị so Egbe gbapụ ọsọ n'anyammiri
Nwaada Ana sịrị, "Ọtụtụ ozu anyị ji amụ ihe n'ụlọakwụkwọ bu apa mgbọ n'ahụ ha. Ana m atụ uche na ụfọdụ ndị a abụghịkwanụ ndị ekperima"I'm very worried because most people don't necessarily have to be criminals,"
O kwurun na otu ụtụtụ na ọ hụrụ ndị uweojii ka ha bu ụgbọala ozu ọbara juru ahụ na-aga n'ụllọozu ụlọakwụkwọ ha.

Ebe foto si, AFP
Egbe zigaara ụmụnne Divine ozi n'ekwentị bụ ndị o mechara chọpụta na ha agaala n'ọtụtụ ogige ndị uweojii na-achọ nwanne ha nwoke ka ha nụchara na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ya na ndị enyi ya atọ oge ha si ụlọoringo abali alọta.
Ihe Egbe chọpụtara gosiri ụkọ ozu ndị na-agụ akwụkwọ ịbụ dọkịta ji eme ọmụmụ na ihe nwere ike ime ndị uweojiii gbagburu n'ike.
Naijria nwere iwu nyere ikike ka e buga ozu ndị nwe ya ebughị n'ụlọakwụkwọ ndị na-amụ dọkịta.
Dịka nchọpụta nke edepụtara mpụtara ya n'akwụkwọ 'Medical journal Clinical Anatomy', ihe karịrị pasent 90 ozu ndị ụlọakwụkwọ ahụike ji eme ọmụmụ bụ ozu "ndị ekperima a gbagburu agbagbu".
Ihe nke a pụtara bụ na ụfọdụ ndị a na-enyo enyo nd uweojii gbagburu n'ike so na ozu ndí a.
Ọkammụta Emeka Anyanwu nke mahadum 'University of Nigeria', bụ onye soro mee ya bụ nchọpụta sịrị , "O nwebeghi ihe gbanwere n'afọ iri gara aga."

Ebe foto si, AFP
'Ọrụ ụgbọala na-ebu ozu'
Afọ gara aga gọọmentị Naijiria hibere otu lenyere anya n'ebubo mkpagbu a na-ebo ndị uweojii na steeti dị iche iche.
Ọtụtụ ndị biara gbaa akaebe na a nwụchiri onye ezinaụlọ ha , na anya ha ahụbeghị onye ahụ.
Ndị uweojii kwuru na ụfọdụ ndị ahụ na-efu efu bụ ndị ojiegbezu nwụrụ ka ha na ndị uweojii na-akwa mgbọ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Frank Mba kwuru na ya ahụbeghị ebe e buuru ozu onye nwụrụ anwụ bugara ụlọakwụkwọ ndị na-agụ maka dọkịta maọbụ ụlọozu.
Divine's family managed to get some of the officers involved in his killing sacked"
Otu ojiegoachụego bụ Cheta Nnamani kwuru n'ozi o degara otu nnyocha mkpamkpa ndị uweojii na ya nyere ndị ọrụ nchekwa aka na ịchọ ozu ndị ha tagidere ahụhụ ha nw ụọ maọbụ ndị ha gburu oge ya nọ na mkpọrọ ndị uweojii n'afọ 2009.
O kwuru na otu abalị ndịuweojii nyere ya iwu ka o tinye ozu atọ n'ụgbọala ya , ọrụ ha na-edu nye ndịụ ha ji eji ha kpọrọ "ambulance service".
O kwuru na ha ji ịga tuchie ya aka buru ya gaa nụlọọgwụ 'University of Nigeria Teaching Hospital' (UNTH), ebe ha buturu ozu ndị ahụ, ndị ọrụ ụlọozu nara ha ozu ndị ahụ.

Nnamani kwuru na ha gwara ya na ọ kpachaghị anya na o nwere ike ịhụ onwe ya ebe ọ hụrụ ozu ndị ahụ.
Nke a mere ụlọozu nke gọọmenti ji ejukarị nke na ụfọdụ, gọọmentị eburu ha ga lie n'igwe.
Ndị nwe mmadụ amaghị ihe mere onye nke ha

Ebe foto si, Getty Images
Otu ọkaiwu bụ Fred Onuobia, sịrị: ndị nwe mmadụ nwere ikike ịnara onye nke ha a mara ikpe ọnwụ."
" Ọ bụrụ na o nweghị onye buru ozu ahụ, e buga ozu ha na nnukwu ụlọọgwụ gọọmentị eebe a na-azụ ndị dọkịta."
Nke a na-aka njọ ma ọ bụ®ụ onye a mara ụ ma gbuo, ọtụtụ mgbe ndị ezinaụlọ ha amaghị nke ha na-ama ebe ha ga-ahụ ozu ha.
N'okwu Divine, Ọ bụ Chukwu mere ka Egbe hụ ozu ya were gaa kọrọ ndị ezinaụlọ ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:











