Miscarriage signs : Ụzọ isii ịga-esi gboo nsogbu ime ọpụpụ

Akpanwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ụfọdụ, dọkịta na-ekechi akpankwa adịghị ike iji gbochie ime ọpụpụ
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Chinyere Mgbajiaka dị afọ iri atọ dị ime ọnwa ise oge ime pụrụ ya.

Ọ gaala ọnwa ise ya bụ ọdachi dakwasara ya mana obi ka na-agbarụ ya dịka ọ na-ata onwe ya ụta.

Ọ gwara BBC Igbo sị, "Abalị abụọ tupu o mee, nnyụsịtaahụ ahụ nwaanyị na-amị amị nọ na-apụta m n'ahụ."

"Ọ bụrụ na m mara gaa ụlọọgwụ n'oge, a kara azọta ndụ nwa m."

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Ime ọpụpụ, dịka dọkịta ahụike ụmụnwaanyị n'ụlọọgwụ 'Chukwuemeka Ojukwu Teaching Hospital Amaku , Awka, bụ Dkta Chidiebere Chukwuka sịrị kọwaa ya bụ, "afọ ime ịpụ tupu ịzụụka iri abụọ na asatọ (28 weeks) nwaanyị ji tụrụ ime."

Ime ọpụpụ bụ nsogbu na-emetụta ọtụtụ ụmụnwaanyị. Dịka WHO siri kwuo, ime na-apụ ụmụnwaanyị dị nde abụọ kwa afọ.

Ihe ndị na-akpata ime ọpụpụ

Nwaanyị ime na-eme

Ebe foto si, Getty Images

Ihe dị iche iche nwere ike ibutere nwaanyị ime ọpụpụ.

Dịka Dkta Chukwuka siri kọwaa, ihe na-akpata afọ ime ọpụpụ na-agbado ụkwụ n'ọnwa ole afọ ime dị.

E nwere ihe na-ebute ime ịpụ n'ọnwa atọ mbụ nke Bekee kpọrọ 'first trimester' nakwa n'ọnwa atọ nke abụọ nke a kpọrọ 'second trimester'.

Afọ ime karịrị izuụka iri abụọ na asatọ abụghị ime ọpụpụ, a na-akpọ ya ịmụkwo nwa - 'preterm baby'.

Ihe ndị na-eme ka nwa pụọ nwaanyị dị ime

Lee ụfọdụ ihe ndị Dkta Chukwuka kwuru nwere ike ibute ime ịpụ nwaanyị n'ọnwa atọ mbụ:

  • Ihe Bekee kpọrọ 'chromosonal abnormalities'
  • "O nwere ike site na ọgwụ nwaanyị ṅụrụ na-amaghị na ọ dịla ime.
  • Ọrịa nwere ike ibute ime ọpụpụ. Nje virus na bacteria
  • Ọbụladị ịba nwere ike ibute ọpụpụ nwa
  • Akpụ afọ nke Bekee kpọrọ 'fibroid' nọ ebe adịghị mma nwere ike ịkpatara nwaanyị ime ọpụpụ
  • 'Luteal phase dysfunction'
  • Nsogbu uhie (Sperm defect) -Ọ bụghị ha niile na-esi nwaanyị n'aka, ụfọdụ n'esi n'aka uhie(sperm) nwere nsogbu nke nwere ike ime ka nwa dị n'afọ ghara ịkpụ ọfụma
  • Ndị kemikal maọbụ ọkụ 'radiation' banyere ahụ n'ihu ọrụ. Ịma atụ, ndị na-arụ n'ụlọ nnyocha Bekee kpọrọ 'lab' maọbụ ebe a na-arụ uhie (paint).
  • Ọnụ akpa nwa esighị ike nke Bekee kpọrọ 'incompetence cervix'

Ihe nwere ike ịkpata "cervical incompetence"

  • Osinachi
  • Ite ime ụdị nke Bekee kpọrọ D&C (Dilation and curettage)
  • Ibepu obele anụ n'akpanwa maka nnyocha nke Bekee kpọrọ 'cervix cone biospsy'.
  • Akpanwa ịgbawa oge nwaanyị na-amụ nwa maọbụ nkwachi mgbawa akpanwa

Kedụ etu nwaanyị dị ime ga-esi ama n'ime na-achọ ipụ ya?

Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaanyị kwesịrị ịma ahụ ya iji mata oge ọ dị ime ka o were chekwaa ime ya

Oge nsogbu chọrọ ịda, Chinyere Mgbajiaka amaghị n'agwọ nọ n'akịrịka.

"N'abalị tupu o mee, arahụghị m ụra. Oke azụ mgbu jidere m."

"Agwara m di m na nwa anaghị agagharịkwa, ahụ ụfụ ekweghị m rahụ ụra."

"Ọ dịkwa m ka nnukwu nsị ọ na-akpa, ya bụ n'ụzọ ụtụtụ m gara mposi, nnọrọ n'oche mposi sị na m ga-anọ ebe ahụ rue ma nsị ahụ apụta."

"O rughị nkeji 30, ihe dịka mmiri hupụtawa, ọ bụrụ akpa mmiri gbawara."

Nwaanyí di ime

Ebe foto si, Getty Images

"Akpọrọ m di m, ọ kpọọ dọkịta, e buru m gbagawa ụlọgwụ n'ime nnukwu ụfụ dịka onye ime na-eme, ọbara na-agbakwa m."

"Dọkịta nyochara m ahụ were sị na nwa adaala, ha gbara m ọgwụ ka m ghara ịmata onwe m mana amatara m oge nwa ahụ pụrụ n'ahụ.

Dkta Chidiebere Chukwuka

Ebe foto si, Dkta Chukwuka

Nkọwa foto, Dkta Chidiebere Chukwuka sị na

"Ọ bụ n'izu ahụ ka anyị marata na ọ bụ nwa nwoke. Ha fichara m akpanwa."

E wezụga ihe ndị a, Mgbajiaka gabigara, Dkta Chukwuka kọwara na njirimara ndị ọzọ nwaanyị ime na-achọ ipụ gụnyere ;

  • Okpuru afọ gbuwe nwaanyị dị ime mgbu
  • Kpọmkpọm ọbara pụtawa nwaanyị n'ahụ maọbụ ọbara ihe dịka anụ so ya na-apụ nwaanyị n'ahụ
  • Mmiri nwa itiwa
  • Nwa na-emegharị n'afọ kwụsị imegharị
  • Ihu, aka na ụkwụ nwaanyị zawa etu ekwesịghị
Nwaanyị dị ime

Ebe foto si, Getty Images

Nsogbu ebighịrị Mgbajiaka ka e wepụchara ihe so nwa n'ụlọọgwụ.

"A sị m lawa n'ụlọọgwụ ka otu abalị gachara mana ọ bụ oge ahụ ka nke bụ nsogbu malitere."

"Mmiriara malitere gbawa m. Ara zaa m mana o nweghị nwa na-aṅụ ara."

"Ịrahụ ụra bụụrụ m nsogbu. N'abalị anaghị m arahụnwu ụra n'ihi egwu na m nwere ike idinagbu nwa m."

"Di m na-agabigakwa nke ya n'ihi na ọ hụrụ nwa anyị oge ọ pụtara.

"Ha nyere anyị ozu ya ka anyị ga lie ya. Anyị bunyere ndị mụrụ anyị ozu ahụ."

Ụzọ mgbapụ isii na nsogbu ime ọpụpụ

Aha onyonyo, Fertility Boosters: Ihe 5 nwaanyị kwesịrị ịme iji tụrụ afọ ime

Dkta Chukwuka kọwara na e nwere ike ịzọta ndụ nwa dị n'afọ dịka nke Mgbajiaka maọbụrụ na nwaanyị dị ime gbara ọsọ gaa ụlọọgwụ ma ọ hụ ihe ekwesịghị.

  • E nwere ike ikechi akpanwa nke a kpọrọ "emergency cerclage" ma nsogbu buru 'cervical incompetence'.
  • Ụfọdụ a na-enye ha ezumike elu akwa' bed rest'.
  • Ọ ka mma nwanyị igbochi ịtụrụ ime kama ite ime.
  • Ọ dị mkpa nwaanyị ịmata ahụ ya iji mata oge ọ dịrị ime iji gbalahụ ịṅụ ọgwụ maọbụ mee ihe nwere ike ime ka ime pụọ ya.
  • Nwaanyị kwesịrị ịma oge o ji ahụ nsọ ya ka ọ ga-abụ ọ dị ime, ọ ghara ịṅụ ọgwụ maọbụ itinye onwe ya ebe 'radiation' maọbụ kemikal ga-emebinwu afọ ime dị.
  • "Gaa ụlọọgwụ n'oge. Ekpere dị mma mana i nwee nsogbu gaa ụlọọgwụ kama ụlọ ekpere."
Aha onyonyo, Lee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke maka ahụ nwoke

Ọ gaala ọnwa ise ihe jiri mee Mgbajiaka mana ihe furu ya ka na-ebutere ya obi mgbawa.

Ọ kọwara na iji chefu ihe mere ya, na ya gurụ nwa ya aha ma na-edekwa edemede iji chefuo ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: