Ogwu-Aniocha: 'Ụmụnwaanyị anyị na-anwụ ka ọkụkọ n'afọ ime n'ihi ụzọ ọjọọ' - Igwe obodo Ogwu-Aniocha
Ndị Ogwu-Aniocha na-eti mkpu maka na ha ahụghị mmepe obodo na bee ha nke na-ebutere ha ezigbote ataramahụhụ.
Ha gwara BBC na ọtụtụ ụmụnwaanyị ha na-anwu tupu ha e ruo ụlọọgwụ ma ime na-eme ha maọbu nwa anwụọ ha n'afọ.
Ha kwukwara na mmiri na-etochi bee ha kwa afọ n'udu mmiri.
Gee ha ntị ma kirie ihe ha na-agabiga.
Onye mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Vining Ogu.


