Ogwu-Aniocha: 'Ụmụnwaanyị anyị na-anwụ ka ọkụkọ n'afọ ime n'ihi ụzọ ọjọọ' - Igwe obodo Ogwu-Aniocha

Aha onyonyo, Lee obodo enweghị ụzọ, miri na ọkụ na-anyụ ịkpakwụ n'Anambara

Ndị Ogwu-Aniocha na-eti mkpu maka na ha ahụghị mmepe obodo na bee ha nke na-ebutere ha ezigbote ataramahụhụ.

Ha gwara BBC na ọtụtụ ụmụnwaanyị ha na-anwu tupu ha e ruo ụlọọgwụ ma ime na-eme ha maọbu nwa anwụọ ha n'afọ.

Ha kwukwara na mmiri na-etochi bee ha kwa afọ n'udu mmiri.

Gee ha ntị ma kirie ihe ha na-agabiga.

Onye mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Vining Ogu.