Anyị na-esi Ebonyi ala obodo anyị n'Enugwu maka enweghi ụzọ - Ndị Agunduma Nkanu
Ndị obodo Agunduma dị n'okpuru ọchịchị Nkanu East nke Enugwu steeti na-eti mpu etu ọnọdụ enweghi ọkụ, mmiri na ụzọ mere ka ha biri ka ndị mgbe ochie.
BBC Igbo gara obodo a were hu na ọ bụ akwa mmiri eji osisi ruọ ka ha ji apụ ma na-abata.
Ide mmiri na-eburu akwa mmiri kwamgbe kwamgbe, nke na-eme ka ndị obodo ahụ tọọ na be ha, dịka enweghizi ụzọ e si apụ.
Ndị obodo a gwara BBC Igbo etu o siri dịrị ha nakwa etu ọnọdụ a ji na-emetụta ahụike na akunaụba ha.
Ha kwukwara etu gọọmentị Jiri gbaa ha nkịtị, n'agbanyeghị na ha akpọọla ha okwu.
Kirie akụkọ a n'uju:

