Enugu Water: Gọọmenti Enugwu steeti ahọpọpụtala Martins Okwor dịka onyeisi ọhụrụ ngalaba mmiri

Aha onyonyo, Ka anyị si ata ahụrụ maka ụkọmmiri n'Enugu

Aka na achị steeti Enugu bụ Ifeanyị Ugwuamyi ahọpụtala Onyeka Martins Okwor dika onyesisoche ọhụrụ nke ụloorọ na ahụ maka mmiri.

Nhọpụta a mere taa bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị.

Odeeakwụkwọ gọọmenti Enugu bụ Ọkammụta Simon Uchenna Ortuanya kwuru na nwaamadia bụ onye Ikem dị na okpuruọchịchị IsiUzo dị na steetiu ahụ.

O kwukwara na ọ rụọla ọrụ n'ihe gbasara mmiri gafee afọ iri atọ.

Cheta na ndị Enugwu bere akwa mmiri kemgbe abalị olenaole gara aga dịka ụkọ mmiri na-anyụ ha anya ebe ahụ.

Ndị bi ebe ahụ sị na o ruola nke bụ na nri dị mana mmiri eji esi ya adịghị.

Otu onye BBC gbara ajụjụ ọnụ sị na, "O meela ụbọchị olenaole anyị ji ata ezigbo ahụhụ maka ụkọ mmiri n'Engugwu".

Gọọmeti Enugu steeti ekwuola na ha na-arụgharị ọwa mmiri pọmp n'Enugwu na ọ bụ ya butere ya bụ ụkọ mmiri.

Kọmishọna na ahụ maka mmiri na steeti bụ Dubem Onyia Jr ahụ sị na ọ ga-erucha Ọgọst 2021 tupu o bie.