Enugu Forest Guard na ndị ọrụ nchekwa na steeti ahụ enwetela ụgbọala pụrụiche

Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi egosila ụgbọala ndị pụrụiche a ga-eji wulite nchekwa na steeti ahụ.
Ụgbọala ndị a gụyere: Hilux narị nke Innoson rụpụtara maka ndị uweojii, ndị agha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ.
Nakwa ụgbọala narị abụọ na iri isii a ga-ebunye agba ntuliaka niile dị na steeti ahụ.
Gọvanọ Ugwuanyị kọwara na ọ bụ ebe niile n'Enugwu ka a ga-ebuga ụgbọala ndị a iji rụọ ọrụ nchekwa.

O ji kwa ohere ahụ kwuo na ọ ga-amalite mkparịtaụka n'etiti ụlọomeiwu steeti ahụ na ndị Enugwu nọ n'ebe ọbụla n'ụwa.
N'uche ya mkparịtaụka a ga-ebute mkpebi ị mepe akpaego ọha niile pụrụiche ịhụ na nchekwa gara siriri werere n'Enugwu.

Na ngwụcha, Ugwuanyi kwuru na ọ na-akwado ịzụta ọgbatumtum nakwa ịnyịnya ịgwe ma kwuo na ndị ụka ga-eso na mkparịtaụka ọzọ ọ ga-ehibe.
Cheta na ogbugbu mmadụ, ntọrị mmadụ na arụ dị icheiche chakere ọkụ n'afọ n'Enugwu nke mere na ọtụtụ mmadụ gunyere ụkọchuwku abụọ alara mụọ n'im 2019 site n'aka ndi omekome na steeti ahụ.










