Ụgwọ akwụkwo Sepụtemba a na-anyịji gị aka?

Ụmụakwụkwọ primarị

Ebe foto si, AFP

    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos

Ọnwa sepụtemba bụ ọnwa a ma ama n'ụwa niile mgbe ụmu akwụkwọ ji alaghachi akwụkwọ.

Nke a mere na ụfọdụ nne na nna na-echekasị onwe ha tupu ọnwa e ruo iji hụ na ha kwụrụ ụgwọ akwụkwọ ụmụ ha.

BBC Igbo jụtara otu onye ọkachamara na ndekọ ego bụ Tosin Olaseinde etu ha ga-esi gbalahụ nsogbu a.

Lee ihe ndị ọ kọwara

Kwado ọfụma na mbido afọ ọbụla

Code club

Olaseinde kọwara na ọ ga-adị mfe ma ọ bụru onye ọbụla na-akwụ ụgwọ akwụkwọ gụkọọ ole ọ ga-apụta n'otu afọ ma malite ịdokọ ego kwa ọnwa maka ya.

Nke a ga-eme na mgbe ọnwa Sepụtemba ruru onye ahụ ga-enwe ike lekọta ihe gbasara ịlọghachi akwụkwọ ụmụ ya.

Bite ego

Ụlọakwụkwọ na Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọakwaụkwọ nke gọọmentị

Ihe ọzọ Olaseninde gwara ndị nne na nna bụ na ha nwereike ịbite ego.

O nwere ụfọdụ ụlọọrụ, ọrụ ha bụ ịnyere ndị nne na nna kwụọ ụgwọ akwụkwọ nke ha ga-akwụghachi n'ọdịnịhu.

Nke a ga-ebute obi iru ala ma abanye n'ọwa sepụtemba.

Nweta ọrụ aka pụrụiche ga na-akwụ ya bụ ụgwọ

Nwata akwụkwọ na Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ịkpeazụ onye ọkachamara gwara BBC Igbo bụ ụzọ ọzọ dị ndị na-akwụ ụgwọ akwụkwọ ga-esi nwe ezunmike na sepụtemba.

"Ha nwereike ịchọ ọrụ aka ọzọ tinye aka nke mkpụrụ si na ya ga-abụ maka ụgwọ akwụkwọ ụmụ ha"

O kwuru nke a maka ndị ụgwọ ọnwa anaghị ezu iji lekọta ụgwọ akwụkwọ na ihe ndị ọzọ.

Olaseinde kwuru ka ndị nne na nna ghara ịda mba maka ụgwọ akwụkwọ kwa mgbe kwa mgbe.

"Agụmakwụkwọ zuru oke bụ ahịa ọma na-ere onwe ya" dịka ọ kọwara.

Ihe nkiri ga-amasị gị

Aha onyonyo, Mmeri anyị ga-ebuli mmụta Teknụzụ - Ụmụakwụkwọ Regina Paecis