Bacterial Vaginosis: Lee ihe na-ebutere ọtụ nwaanyị isi ọjọọ

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
Ọtụ isi isi bụ ihe na-eme ụfọdụ ụmụ nwaanyị kama dịka ọnọdụ ya bụ ihe siri dị, ọtụtu anaghị ekwu maka ya.
Dr Genb Gunter bụ ọkammụta maka ihe gbasara ịmụ nwa na-ahụ ụmụ nwaanyị gwara BBC na ọtụ ṅwaanyị na-asa onwe ya ma dobe onwe ya ọcha.
Gunter kwuru na Ceelụ dị n'ime ọtụ nwaanyị na-edochi onwe ya dịka awa iri itolu na isii ọbụla gachara.
Nke a pụtara na ọtụ nwaanyị nwereike ịdebe ime onwe ya ọcha.
Kama ụfọdụ mgbe ọtụ na-esi isị pụrụiche nke na-ebute nchegbu na ihere.
Anyị kpọtụrụ onye na-ahụ maka ịmụ nwa akpọrọ Gynaecologist na beke bụ dọkịnta Akinde Joseph ka ọ tụpenyere anyị azụ ihe na-akpata ọtụ nwaanyị isi isi nakwa ihe onye ahụ ga-eme maka ya.
Gịnị na-ebute ọtụ isi ajọọ isi?
Dokịnta Akinde Joseph bụ dọkịnta na-ahụ maka ịmụ nwa kọwara na ya bụ onọdụ ọtụ nwaanyị isi isi bụ Bacteria Vaginosis ka ndị Sayensi na-akpọ ya.
O kwuru sị, " ọ bụ "Gardenerella Vaginalis" bụ nje na-ebute ọnọdụ a".
Ọ kwukara sị, " otu n'ime ihe eji amata ọrịa a bụ ajọ isị na-esi ka azụ"
O kwuru na nwaanyị ọbụla butere ya jee ụlọogwụ nata ọgwụgwọ.
Kedụ etu ụmụ nwaanyị ga-esi gbochie ya?
Akinde kwuru si, " Ọ bụ site na mmekọ nwoke na nwaanyị ka ya bụ ọrịa si efe".
Ọ kọwara na-anaghị ebute ya site na iji otu akwa hichaa ahụ maọbụ iyi otu akwa.
Ọ bụ ma nwoke na nwaanyị na-efesa ya.
Akinde kwukwara ka ụmu nwanyị na-edebe onwe ya ọcha
Ka nwoke na nwaanyị hapụ ịgba n'ezi.
Ọ kọwara sị, "Cheta kwa na ọtụ ụmu nwaanyị na-emepụta mmiri nke bụ discharge n'okwu bekee nke mere na nwaanyị nwere ọnọdụ a kwesiri ịgbanwe ọba ya ihe dịka ugboro abụọ n'ụbọchị".















