Ovarian Cysts: Gịnị bụdị nsogbu 'ovarian cyst' ụmụnwaaanyị kpụzị n'ọnụ ugbua

Ovarian cyst

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

'Ovarian cyst' bụ otu ọnọdụ ahụike ụmụnwaanyị ugbua na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi egwu na o nwere ike imetụta .ọmụmụ maọbụ bute ajọ ọrịa kansa.

Mana ndị ọkachamara ahụike na-ekwu na ọ bụ enweghị nghọta zuru oke mere ọnọdụ ahụ ji echụ ọtụtụ n'ime ụmụnwaanyị ụra.

Ovarian cyst bụ mkpụrụ maọbụ akpụ na-adị n'akpa akwa nwaanyị.

Dịka dọkịta ahụịke ụmụnwaanyị bụ Dkta Ngozi Obi siri kọwaa,"akpa akwa nwaanyị (ovaries) na-amịpụta mkpụrụ n'ọnwa ọbụla.

Oge 'ovulation', ọ gbawa wepụta akwa na-agbaze ghọọ nsọ nwaanyị ma ọ bụrụ na nwaanyị ezuteghị nwoke, mana o nwere ndi anaghị agbawa".

Mgbe 'ovarian cyst' na-ebute nsogbu

Nwaanyị n'ihe

Ebe foto si, Getty Images

Naanị ma mkpụrụ ahụ buwe ibu karia maọbụ ma mkpụrụ ahụ tụfikọ n'okporo ya ka o ji abụ nsogbu.

Dkta Obi, onye na-arụ n'ụlọọgwu Emel Hospital dị na Festac Legọs, sịrị,"Inwe ọrịa mbute (infection) nwere ike ibute ovarian cyst".

"Ọzọ bụ ụmụnwaanyị na-achọ nwa na-añụ ọgwụ ka ha dị ime nwere ike ibute ya".

Aha onyonyo, Ihe ị kwesiri ị ma maka akpụ ori nwa.

"Mkpụrụ ahụ nwekwara ike tụfịkọ n'okporo ya ma na-afụ nwaanyị ụfụ n'afọ."

"Mgbe ụfọdụ mkpụrụ ahụ nwere ike ibu nnukwu ibu."

Ọ kọwara na o bukarịa setimita isii, ị mara na nnu aghala ofe, dịka o nwere ike ịdachi akpamamịrị.

"Ọ bụ ụdị mkpụrụ a ka a na-awa afọ wepụ."

E nwekwara mkpụrụ nke na-esite n'ọrịa kansa.

"Ndi kansa dị n'agbụrụ ha; kansaara.",nke kolon, nke akpa akwa wdg".

Kedụ ka ị ga-esi amara ma i nwere 'Ovarian cyst'?

Ụmụnwaanyị na-ekpe ekpere

Ebe foto si, Getty Images

Ọ naghị edo anya ịmata ma nwaanyị e nwere ovarian cyst' belụsọ ma o mere nnyocha ahụ.

Dkta Obi kọwara,"Ọ bụ imee nnyọcha ukwu (pelvic scan) ka ị ga-eji ama."

Mana mgbe ụfọdụ, e nwere ihe a na-ahụ anya nwere ike ịgba ama na nwaanyị nwere 'ovarian cyst'

Dika Dkta Obi and websaitị medicalnewstodayi kwuo, ha gunyere:

  • Afọ gị na-ebu, na-ebu ị mara na i nwere nsogbu
  • bọchị nsọ gị na-adagwakwarị nke Bekee kpọrọ 'irregular menstruation'
  • ọbara na-agbabigagị oke maobụ ọ naghị agba ka o kwesiri
  • Afọ ịfụ ụfụ
  • Ụfụ n'akụkụ ukwu maọbụ ahụ nwaanyị

Kedụ ihe ndị ovarian cyst nwere ike ibute?

Ovarian cyst nwere ike ibute ime isi ike na nsogbu ahuike ndị ọzọ.

Dkta Obi sịrị, "O nwere ike imebi akpa akwa nke pụtara na ọ gaghị na-amị akwa. Nwaanyị enweghị akwa agaghị atụlị ime."

"Ọ bụrụ na 'ovarian cyst' buo nnukwu ibu (ụfọdụ na-aha ka afọ ime ọnwa atọ), o nwere ike ikpagide akpa mamịrị, mee ka nwaanyị naanyụ mamịrị rinne."

"Ọ bụrụ na o butere gị kansa, ọ ga-na eme gị ị na-ata ahụ."

"'Ovarian cyst' nwere ike ikesa n'akụkụ ahụ ndị ọzọ."

"O nwere ike isi n'akpa akwa gafe n'opi akwa (fallopian tubes), akpanwa nakwa ọnụ akpanwa maọbụrụ nke kansa."

Ọgwụgwọ 'ovarian cyst'

Nke obere na-agbazere onwe ya mana a na-awa afọ iji wepụ mkpụrụ buru oke ibu.

Mana ọ bụrụ nke kansa, Dkta Obi kwuru na ọ bụ ihe Bekee kpọrọ 'radiotherapy' maọbụ 'chemotherapy' maọbụ ha abụọ ka e ji agwọ ya.

Nwaanyi ebe akwa

Ebe foto si, Getty Images

Ụzọ ịgbalahụ ọrịa a

Ndị ọkachamara na-enye gị ndụmọdụ ndị a:

- Na edowe onwe gị ọcha mgbe dum iji

gbochie ụmụ pịrị ọrịa na-emetụta ahụnwaanyị gị.

- Gba mbọ ịji okpunnabụenyi oge ịna-enwe mmekọ iji gbochịa ibute ọria nwere ike i mepere ovarian cyst ụzọ.

- Ọ bụrụ n'isi n'agbụrụ ndị na-enwekarị kansa, gbaa mbọ na-eme nnyocha ahu kwa daa, iji chọpụta mgbe mmiri ruwere ma gbaa ọsọ mmiri n'oge.

- Ọ bụrụ na i buru oke ibu, gbalịa ka ị talata n'ihi na oke ibu na-eme ka ọ dị mfe inwe 'ovarian cyst'."

- Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe ọbụla na etu i si ahụ nsọ gị, gbara gaa hụ dọkịta.