Female Genital Mutilation: Abịa na Imo steeti enweghị iwu machiri ibi nwaanyị ugwu

- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
N'afọ 2015, ndị omeiwu Naịjirịa binyere aka n'iwu a kpọrọ 'Violence Against Persons Prohibition Act', nke machiri omenala ndị na-emekpa mmadụ ahụ, dịka ibi nwaanyị ugwu.
Ọ dịzi n'aka ndị omeiwu steeti dị icheiche ibinye aka n'iwu a ka o wee dị ire na steeti ha.
Mana a bịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, naanị Abia na Imo steetị bụ ndị ebinyebeghị aka n'iwu a bụ 'Violence Against Persons Prohibition Act'.
Na Naịjirịa niile, naanị steeti iri na atọ binyerela aka n'iwu a.
Ha gụnyere: Anambra, Benue, Cross River, Ebonyi, Edo, Ekiti, Enugu, Kaduna, Lagos, Ogun, Osun, Oyo, na Plateau.
Mpaghara FCT, bụ isi obodo Naịjirịa, mere ha iri na anọ.
Ime aramara anakwaghị amasị m ma ncha - Nwaanyị e biri ugwu

Ebe foto si, Getty Images
Nwa Ibari (ọ bụghị ezigbo aha ya) alụọla di ma mụta ụmụ abụọ, mana ihe e mere mụta nwa, ya bụ aramara nke bekee kpọrọ 'sex', anaghị amasị ya chaachaa.
Nsori di na nwunye, nke bụ otu ihe na-ejikọ di na nwunye ọnụ, anaghị agụ Nwa Ibari agụụ.
Nke a bụ maka na e biri Nwa Ibari ugwu oge ọ bụ nwata, ma bechapụ akụkụ ọtụ ya nke bekee kpọrọ 'clitoris'.

Ebe foto si, Getty Images
'Clitoris' bụ akụkụ ọtụ nwaanyị nke kacha atọ ya ụtọ ma ọ na-eme aramara, mana ọ bụrụ na e bepụ ya oge a na-ebi nwaanyị ugwu, aramara nwere ike ịbụrụ ya ọgụ na mgba.
"Tupu mụ na di m amalite inwe mmekọ, ahụ ga na-atọ m rịrịrị, mana ngwangwa ọ banyere, naanị ụfụ ka ahụ niile ga na-afụ m," Nwa Ibari gwara onye ntaakụkọ BBC.
"Ugbua, m cheta mụ na di m inwe mmekọ, ọ na-amapụ m obi."

Ebe foto si, Getty Images
Otu 'World Health Organisation' kwuru na ụmụnwaanyị e biri ugwu n'ụwa karịrị nde narị abụọ (200 million).
Mana onweghị otu mkpụrụ uru ibi ugwu na-abara ụmụnwaanyị, naanị ọghọm jupụtara ya.
Ya mere ha ji wepụta ụbọchị isii nke ọnwa Febrụwarị kwa afọ dịka ụbọchị iji gbaa mbọ maka ịkwụsị ibi ugwu ụmụ nwaanyị.
Ọ gaara amasị m ma ọ bụrụ na e bighi m ugwu - Olaedo
Nwaanyị ọzọ, Olaedo (ọ bụghị ezigbo aha ya) kọọrọ BBC Igbo etu ibi ugwu si metụta ya.
Olaedo kwuru sị: "Ọtụtụ oge ka ndị enyi m na-ekwu etu aramara si atọba ha n'ụbụrụ, mana ọnaghị ekwe m nghọta."
"Mana na nke m, tupu mụ anụ ụtọ aramara, nwoke ọ bụ mụ na ya ga-enwe nnukwu ndidi ma were nwayọọ mara ebe o kwesịrị ịkpatụ aka."
Olaedo kwuru na ọ gaara akara ya mma ma ọ bụrụ na nne ya hapụrụ ya etu chi si kee ya, kama ibi ya ugwu.
"Onweghị ihe nwere ike ime ka m bie nwa m nwaanyị ugwu," Olaedo kwuru.
Mpaghara ebe ibi nwaanyị ugwu ka dị na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Joseph Osuigwe bụ onyeisi otu Devatop Centre for Africa Development kwuru na ọ bụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa Ọdịda Anyanwụ Naịjirịa ka ụdị ihe a na-emekarị na Naịjirịa.
Steeti dịka Ebonyi, mpaghara Okigwe na Mbano n'imo steeti, nakwa mpaghara ụfọdụ n'Abia steeti bụ ebe ọ ka njọ.
Ndị ọzọ bụ Ekiti, Ondo, na Osun.
Mana Osuigwe kwukwara na ya bụ ihe na-ebelata ugbua, mana ọ kwụsibeghị kpamkpam.
Gịnị mere e ji ebi ụmụnwaanyị ugwu?

Ebe foto si, Rick Loomis
Ọ dị ọtụtụ nkwenye n'omenala dị icheiche nke mere ibi ụmụnwaanyị ugwu ji aga n'ihu.Ha gụnyere:
- Ibi nwaanyị ugwu ga-eme ka ọ ghara ịma nwoke ruo oge ọ lụrụ di
- Nwaanyị e biri ugwu agaghị agba n'ezi ma ọ lụọ di
- Ana-ahụta nwaanyị ebighi ugwu dịka onye na-ezughị oke na nwaanyị
- Ibi nwaanyị ugwu ga-eme ka ọ bụrụ onye arụghị arụ
- Ụfọdụ omenala kwenyere na ego isi nwaanyị biri ugwu ga-ebu ibu karịa onye ebighị ugwu
Ọghọm dị n'ibi nwaanyị ugwu

Ebe foto si, DEVATOP Center fo African Development
Dịka WHO si depụta, ọghọm ibi nwaanyị ugwu gụnyere:
- Ahụ ụfụ ma nwaanyị na-anyụ mamịrị
- Nsogbu n'ọtụ nwaanyị
- Nsogbu ma nwaanyị nọrọ na nsọ
- Ahụ ụfụ ma nwaanyị na-eme aramara
- Enweghị afọ ojuju ma e mechaa aramara
- Nsogbu ma nwaanyị chọwa ịmụ nwa
- Obi ịda mba nakwa nchekasị n'ihi adịghị ka ibe
Iwu megidere ibi nwaanyị ugwu

Ebe foto si, Getty Images
E nwere nkwekọrịta dị icheiche machiri ibi nwaanyị ugwu, nke Naịjirịa so na mba binyere aka na ha.
Ha gụnyere:
- Convention Against Torture and Other Cruel, Inhuman or Degrading Treatment or Punishment, 1984
- International Covenant on Civil and Political Rights, 1966
- International Covenant on Economic, Social and Cultural Rights, 1966
- Convention on the Elimination of all Forms of Discrimination Against Women, 1979
- Convention on the Rights of the Child, 1990
- African Charter on Human and Peoples' Rights (the Banjul Charter), 1981
- African Charter on the Rights and Welfare of the Child, 1990
- Protocol to the African Charter on Human and
- Peoples' Rights on the Rights of Women in Africa (Maputo Protocol), 2003














