2020 in retrospect: Ihe ndị dị iriba ama mere na 2020 ị gaghị echefu

Ndị otu Biafra, onye uweojii na ngagharịiwe EndSARS

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Afọ 2020 bụ afọ ọtụtụ na-ekwu ya bịa gafere ka a mara ma afọ ọhụrụ ọ ga-eweta ụwa ka mma.

Nke a bụ n'ihi ọdachị,ihe arịrị na anyammiri megara nke mere ndị mmadụ e cheta e bewe dị ka aja dị n'ala

Ụfọdụ ihe ndị a gbanwere ọnọdụ ochie e si eme ihe weta ndị ọhụrụ.

Lee ụfọdụ ihe ndị dị ịrịba ama a gaghị echefụ maka afọ 2020:

1. Coronavirus wara ụwa agba

Etu nje coronavirus dị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eserese nje coronavirus

Oge o bidoro na Wuhan Chaina n'afọ 2019, ụwa akpọghị ya ihe dịka onye ọbula na-agara mkpa ya.

Mana malite n' ọnwa Februwarị afọ 2020, ajọ ọrịa ahụ gbasara ka mkpụrụ ụkpaka, gburu ndị mmadụ na-aga.

Ọtụtụ mba mechiri ahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọụka na machie njem maọbụ kpochie obodo mkpamkpam iji gbochie nkesa nje a nwere ike igbu mmadụ n'ime izu abụọ o jiri banye mmadụ n'ahụ.

Ngụkọ ọrịa coronavirus n'ụwa

Ka o siri kwụrụ n'abalị 29 nke ọnwa Disemba afọ (29/12/2020), otu nde mmadụ na ụma asatọ (1.8m) anwụọla site n'ọrịa coronavirus, dịka mmadụ nde iri asatọ na anọ na ụma butere ọrịa ahụ.

Na Naijiria, coronavirus tara isi ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị nwere agba ndị dịka Suleiman Achimugu(bụbu onyeisi PPMC, otu ngalaba dị n'okpuru NNPC na-ahụ maka ire mmanụ) bụ onye Naijiria mbụ o weere dịka o si mba Briten lọta; Abba Kyari, nwanne Buhari;Abiola Ajimobi aka chịburu Oyo steeti;Bayo Osinowo, Senetọ na-anọchite Lagos-East,;Wahab Adegbenro, kọmishọna Ahuike Ondo steeti na ndị ọzọ.

Coronavirus napụrụ ọtụtụ ndị mmadụ ebe ha si amịcha aka dịka ọtụtụ ụlọọrụ mechiri, agụụ na ụbịam nyụkwara ndị mmadụ ịkpakwụ.

2. Ọnwụ George Floyd mere ka agbagha ịkpa oke agbụrụ

Ihe nke George Floyd

Ebe foto si, AFP

Ndị uweojii mba Amerịka ji ikpere pịgbuo nwoke isi ojii a kpọrọ George Floyd dị afọ 46 n'abalị 25 nke ọnwa Mee na Minneapolis, Minnesota dị na mba ahụ, na-agbanyeghị na Floyd nọ na-eti mkpu si na " anaghị m ekutekwa ume".

Nke a mere oge ha chọrọ ịnwụchi ya maka ebubo nke onye na-ere ahịa n'otu ọdọahịa ọ zụrụ sịga kpọrọ ndị uweojii boo Floyd ebubo iji dọla 20 adịgboroja chọọ ịzụ ihe.

Ogbugbu Floyd kpalitere ọgbaghara kara aka dịka ihe onyonyo etu o siri nwụọ gbara n' intanet n'ụbọchị nke abụọ ya.

A gbara ogige ndị uweojii ebe ndị uweojii gburu ya si ọkụ, ma mebikwa ọtụtụ ọdọahịa, ụlọ, ụgbọala dịka ngagharịiwe ahụ si Minnesota gbasaa na mpaghara dị iche iche na mba Amerịka.

E mekwara ngagharịiwe na mba ndị ọzọ dịka Briten, Fransi, Naijiria nakwa mba ndị ọzọ dịka ndị mmadụ na-akpọ oku ka a kwụsị ịkpa oke agbụrụ.

Derek Chauvin, Tou Thao, J. Alexander Kueng, Thomas Lane

Ebe foto si, Minneapolis police

Nkọwa foto, Site n'akaekpe: Derek Chauvin, Tou Thao, J. Alexander Kueng na Thomas Lane bụ ndị uweojii aka ha dị n'ọnwụ Floyd

A kpụpụrụ ndị uweojii anọ aka ha dị n'onwụ Floyd ụlọikpe, ebe ọtụtụ ụlọọrụ jiri maka ihe mere lebanyegharịa anya n' atụmatụ ịkpa oke dị n'ụlọọrụ ha.

3. Ngagharịiwe EndSars

Ọ malitere n'abali asatọ nke ọnwa Oktoba afọ 2020 dịka akụkọ wuru na soshal midia ka ndị uweojii si gbaa otu nwaokorobịa egbe na Warri dị na Delta steeti, chee na ọ nwụọla ma buru ụgbọala ya gbawara.

Ụmụ Naijiria na-eme ngagharịiwe EndSARS

Ebe foto si, Reuters

Ngagharịiwe malitere na Delta ma si ebe ahụ fere Legọs na Abụja.

Tupu a mara ihe na-eme, ndị ntorobia nọ n' isiobodo steeti dị iche iche malitere mewe ngagharịiwe na-akpo oku ka e kpochapụ otu ndị uweojii pụrụ iche a hiwere maka ibu agha megide ndị ojiegbeezu a kpọrọ, 'Special Anti-Robbery Squad' bụ SARS n'ịchafụ.

Nke a bụ n'ihi ebubo ha na-ebo na ndị SARS jizi ọkwa ha na-emekpa onye ntorobịa ọbụla yi dada, gburu ichi n'ahụ ya(tatoo) maọbụ nyara ezigbo ụgbọala dịka onye ekperima.

Gọọmenti zara ha ma kwupụta na ha emechiela ya ma rịọ ha ka ha dere jụụ mana ndị ntorobịa jụrụ ịhapụ ama, sị na ọ bụghị mbụ gọọmenti na-ekwe nkwa emeghị eme.

4. 20/10/2020 ọ dị nchefu?

Abalị iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020(20/10/2020) bụ ụbọchị na-agba imirikiti ụmụ Naijiria anya mmiri rue echi, n'ihi na chi jiri ehihie jie dịka ndịagha Naijiria gara na Lekki Toll Plaza dị na Legọs ebe ụfọdụ ndị ntorobia gbakọrọ na-eme ngagharịiwe EndSARS, wụọ ha mgbọ.

Lekki toll gate

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụgbọala ga-agafenwuzi etu ọ masịrị ya na Lekki toll gate

Ọtụtụ merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ a mabeghị ọnụọgụgụ ha rue ugbua, nwụrụ anwụ.

Na mbụ, Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwolu kwuru na ọ bụ naanị mmadụ abụọ nwụrụ mana akụkọ na-apụta gosiri na ya bụ ọdachi tara isi ọtụtụ mmadụ.

Onye na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, AFP

Kama iyi ndị ntorobia egwu, agwa ndị agha gbawara ọtụtụ obi ma bute oke iwe, mee ka ngagharịiwe kawanye njọ ma bute tigbuo-zogbuo na steeti dị iche iche na Naijiria.

E gburu ọtụtụ ndị uweojii na tigbuo-zogbuo dapụtara maka ọdachi 20/10/2020, gbaa ọtụtụ ogige ndị uweojii ọkụ.

Ọtụtụ ọdọahịa, ụlọakụ, ụlọọrụ gọọmenti na nke ndị nọrọ onwe ha (dịka ụlọntaakụkọ TVC dị na Legọs) ghọkwara ntụ na unyi.

5. Nkwata ndị Ipob na ndị ọrụ nchekwa n'Emene, Enugwu

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị e chere na ha bụ ndị otu Ipob na ndị uweojii n'Emene, Enugwụ n'abalị 23 nke ọnwa Ọgọstụ.

Ndị ọrụ nchekwa wụjuru n'ebe ihe ahụ mere

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị uweojii wakporo ebe ndị Ipob na-eme ọgbakọ were chụsasịa ha.

Aha onyonyo, O nweghị onye Emene so na ndị e gburu n'Emene - Igwe Emene

E merụrụ ụfọdụ ndị mmadụ ahụ, ebe ọgbaghara sochiri ya takwara isi ndị mmadụ.

Onye ntaakụkọ anyị gara ebe ahụ hụrụ ozu otu onye na-agba ọkụ ebe ahụ ụbọchị ahụ ihe ahụ mere.

6. A wakporo ma gbuo Ụwa

UWAVERA OMOZUWA

Ebe foto si, UWAVERA OMOZUWA/FACEBOOK

Ndị afọ tara mmiri wagboro ma gbuo nwaada Vera Uwaila Omosuwa bụ onye ka banyere mahadum ọhụrụ ebe ọ gara ịgụ akwụkwọ n'ụlọụka 'Redeemed Christian Church of God' dị n'akụkụ be ha mgbe ha wakporo ya n'ike.

Ngagharịiwe malitere na Bini,isiobodo, Edo steeti, ebe ọdachi ahụ dakwasara nwata ahụ dị afọ 22 ma fesaa na isiobodo dị iche iche na Naijiria dịka ụmụakwụkwọ nakwa ụmụnwaanyị na-eti mkpu ka a chọpụta ndị gburu ya, kpụpụ ha ụlọikpe.

Ka ọnwa ole na ole gachara, ndị uweojii Naijiria wepụtara ndị ha kwupụtara n'aka ha dị n'ọnwu nwa ada ahụ, nke otu n'ime ha kọwara n'ihe mere ha ji gbuo ya bụ na otu nwaanyị iwe ezi agwa nwata ahụ na-ewe iwe nakwa etu onye ọbụla ji hụ ya n'anya n'ụlọụka na-eri ya nri n'afọ,gobiri ha ka ha memila nwatanwaanyị ahụ.

7. Ntọrọ ụmụakwụkwọ Kankara

Onyeisiala Muhammadu Buhari oge o zutere ụmụakwụkwọ Kankara a tọhapụrụ

Ebe foto si, Bashir Ahmad/Twitter

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari oge o zutere ụmụakwụkwọ Kankara a tọhapụrụ

Na mgbede abali 11 nke ọnwa Disemba afọ 2020, a tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwoke karịrị 300 n' ụlọakwụkwọ ebe ha bi na Kankara dị na Katsina steeti.

Naijiria dịrị ndị mụrụ ha ka Gana abalị ole na ole a chọrọ ha tupu a gbapụta ha n'aka ndị tọọrọ ha ma kpọlata ha.

Ụfọdụ na-ekwu na a kwụrụ ndị ntọ ahụ ụgwọ isis tupu a tọhapụ ha, mana gọọmenti kwuru na o nweghị ụgwọ a kwụrụ.

O nwere ihe ọzọ i chetara mere n'afọ 2020? Kwa anyị n'akara Facebook anyị (https://www.facebook.com/BBCnewsIgbo )ma kọọrọ ndị yaadị gị...