Anwụchịela mmadụ ise a sị so gbuo Chef Emeka

Emeka Eloagu

Ebe foto si, Emeka Eloagu/Insta

Akụkọ na-ekwu na-anwụchịela ihe ruru mmadụ ise ndị a si na aka nọ n'okwu ogbugbu Emeka Eloagu, onye e ji "Chef Emeka" mara.

BBC kpọrọ ọnụ nekwuchịtere ndị uweojii n'Abuja bụ Mariam Yusuff n'okwu akụkọ a, ma o sị na dịka ha ka na-eme nyocha n'okwu ogbugbu nwaamadi a, na ya enwebeghi ikike ikwu okwu maka ya bụ akụkọ ugbua.

Mgbe BBC jụrụ otu nwoke aha ya bụ Maazị Chimuanya Okoye onye ya na Emeka rụburu ọrụ, bụrụkwa ezi enyi ya maka okwu ọnwụ Emeka, o kọwara anyị na obi gbawara ya.

Okoye gwakwara anyị na ya na Emeka bikọburu n'ụlọ tupu ọ lụọ nwunye, ọ kọwara anyi ka nchekwa ebe ọbibi ụlọ Emeka dị.

N'okwu ya, "Ọ bụghị ihe dị mfe iwakpọọ ụlọ Emeka, nke a gosiri na ọ nwere ike ị bụ ndị ma ya, bụ ndị wakooro ya n'ime abalị".

Maazị Okoye gwara BBC na usoro nchekwa ụlọ Emeka bụ nke na tupu onye ọbịa abata, ya bu Emeka ga akpọriri ndị nchekwa n'ekwe nti ka ha nabata onye ahụ.

Chetekwa na akụkọ okwu etu e si gbuo Maazị Eloagu kwuru na ndị ojoo batara n'ime ụlọ ya, gbaa ya ọtọ ma gbuo ya.

Maazị Okoye gwara BBC na ya bụ akụkọ bụ ihe ọ nụrụ n'ezia, ọ gwara anyi na nwunye Emeka gara ụlọụka ime ekpere ime abali ma mgbe ọ lọtara ụlọ n'isiụtụtụ ụbọchị ahụ ọ hụrụ ozu di ya.

Emeka Vincent Eloagu

Ebe foto si, Chefemeka/Instagram

Etu osi ite a ma ama bụ Emeka Eloagu si laa mmụọ n'Abuja

Ndị uweojii na Abuja ekwuola na ha na-enyocha ọnwụ otu nwoke a kpọrọ Emeka Vincent Eloagu bụ osi ite a ma ama.

Akụkọ kwuru na ndị amaghị ndị ha bụ batara n'ụlọ ya n'ụbọchị abalị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 ma tọgbuo ya.

Otu onye ma ezinaụlọ ahụ ọfụma gwara BBC n'ekwentị na ndị ahụ gburu Emeka weere ekwentị ya.

O kwuru sị,"Ọ bụ mgbe nwunye ya na-eti egwu n'ụlọụka lọtara n'ụtụtụ ka ọ hụrụ ozu ya"

Ihe ndị anyị ma maka ya

  • Ọ gụrụ akwụkwọ pụrụiche maka isi nri bụ 'Cordon Blue' na mba Fransị.
  • Ọ gbapere ụlọoriri abụọ nke a kpọrọ 'Helene's Food Co. ebe a na-esi nri ndị ọcha nakwa Obyoma ebe a na-esi nrị ndị Igbo.
  • Ọ dị afọ iri atọ na ise mgbe ọ nwụrụ.
  • Ọ lọghachitere na Naịjirịa, gbapee ụlọoriri ya ma lụkwaa nwaanyị.
  • Nwunye ya bụ onye na-eti egwu n'ụlọụka 'House on the Rock' dị n'Abuja.
  • Ọ bụ onye Isuikwuato dị n'Abia steeti.

Etu ndị mmadụ si kwanyere ya ugwu ikpeazụ

Emeka Vincent Eloagu

Ebe foto si, ChefEmeka/Instagram

Dịka ọnwụ siri mee na mberede ma tụọ ndị enyi na ezinaụlọ Emeka n'anya, ụfọdụ n'ime ha ekwupụtawala maka ọnwụ ya.

Mazi Okoye bụ onye ya na Emeka rụburu ọrụ gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọnwụ Emeka wutere ya.

O kwuru sị, "Emeka bụ onye si Anambara kpọta m Abuja, ọ bụ ezi enyi m."

Okoye bere arịrị maka etu ndị mmadụ si nwee ajọ obi nke butere ọnwụ ezi enyi ya bụ Emeka.