Ipob news today: “Ọ bụ Nnamdi Kanu na ndị IPOB bu ụzọ kwube okwu igbu mmadụ” – Uche Mefor
Onye bụbu osote onyeisi ndị IPOB, bụ Uche Mefor ekwuola uche ya gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa dị n’ala Igbo ugbua.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n’ụbọchị Sọnde, Mefor kwuru na ụta dịịrị Nnamdi Kanu bụ onyeisi IPOB, dịkwara ndị ọchịchị ala Igbo maka ya bụ ihe.
- Agaghị m Dubai ka ọ fọdụzie ịda n'ala nke ibu m gawa ụlọọgwụ - Uche Mefor
- Ekwenyeghị m na o nwere ihe dịka Jubril nke Sudan so n'ihe na-esere mụ na ndị Ipob - Uche Mefor
- Lee etu ọchịchị Ipob ga-adị dịka Nnamdi Kanu nọ nga
- Ọ bụrụ na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ahazigharịghị nchekwa ọwụwa anyanwụ, ESN ga-eguzosi ike
- Ipob: Uche Mefor o nwere ikikere ịsị ndị Ipob kwụsi ịtụ ụtụisi ha?
O kwuru sị: “Ọ bụ Nnamdi Kanu na ndị IPOB bu ụzọ kwube okwu igbu mmadụ.”
“Ọ bụ ha na-ekwu na onye mee nke e gbuo ya, onye mee nke ọzọ e gbuo ya.”
“Ya mere, ụta dịịrị Nnamdi Kanu, maka na o bu ụzọ bido okwu ogbugbu mmadụ.”
“Ụta dịkwaara ndị ọchịchị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’ihi na ọ bụ ọrụụ gọọmentị ichekwa ndụ na akụnụba ndị ha na-achị.”
Mefor kwuru na inweta nnwereonwe Biafra abụghị ihe igbu mmadụ maọbụ imebi ihe.
“Biafra bụrụ nke igbu mmadụ na mmebisi obodo, achọghị m ya,” Mefor kwuru.
Gbasara okwu ntuliaka n’Anambra steeti, Mefor kwuru na “onye ọbụla sị na-agaghị eme ntuliaka n’Anambra bụ onye ohi na onye ekperima.”
Ọ kọwara na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchịma na ha agaghị achịta aja ma e mee ntuliaka, na-akwado ndị a na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka.
Ọ kọwara na ntuliaka dị nnukwu mkpa n’ọchịchị onye kwuo uche ya.
“Isonye na ntuliaka ga-enyekwu aka na mbọ iji nweta nnwereonwe Biafra,” Mefor kwuru.





