Ipob news today: “Ọ bụ Nnamdi Kanu na ndị IPOB bu ụzọ kwube okwu igbu mmadụ” – Uche Mefor

Aha onyonyo, “Ọ bụ Nnamdi Kanu na ndị IPOB bu ụzọ kwube okwu igbu mmadụ” – Uche Mefor

Onye bụbu osote onyeisi ndị IPOB, bụ Uche Mefor ekwuola uche ya gbasara ọnọdụ enweghị nchekwa dị n’ala Igbo ugbua.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n’ụbọchị Sọnde, Mefor kwuru na ụta dịịrị Nnamdi Kanu bụ onyeisi IPOB, dịkwara ndị ọchịchị ala Igbo maka ya bụ ihe.

O kwuru sị: “Ọ bụ Nnamdi Kanu na ndị IPOB bu ụzọ kwube okwu igbu mmadụ.”

“Ọ bụ ha na-ekwu na onye mee nke e gbuo ya, onye mee nke ọzọ e gbuo ya.”

“Ya mere, ụta dịịrị Nnamdi Kanu, maka na o bu ụzọ bido okwu ogbugbu mmadụ.”

“Ụta dịkwaara ndị ọchịchị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’ihi na ọ bụ ọrụụ gọọmentị ichekwa ndụ na akụnụba ndị ha na-achị.”

Mefor kwuru na inweta nnwereonwe Biafra abụghị ihe igbu mmadụ maọbụ imebi ihe.

“Biafra bụrụ nke igbu mmadụ na mmebisi obodo, achọghị m ya,” Mefor kwuru.

Aha onyonyo, Charles Soludo: Oji onye n'ala ji onwe ya n'okwu 'sit-at-home' ndị Ipob

Gbasara okwu ntuliaka n’Anambra steeti, Mefor kwuru na “onye ọbụla sị na-agaghị eme ntuliaka n’Anambra bụ onye ohi na onye ekperima.”

Ọ kọwara na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchịma na ha agaghị achịta aja ma e mee ntuliaka, na-akwado ndị a na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka.

Ọ kọwara na ntuliaka dị nnukwu mkpa n’ọchịchị onye kwuo uche ya.

“Isonye na ntuliaka ga-enyekwu aka na mbọ iji nweta nnwereonwe Biafra,” Mefor kwuru.

Aha onyonyo, Sit at home: Okwu m na-agwa ndị na-eme atụmatụ a - Andy Uba